Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) | Nkwụsị Nke Iri na Atọ

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Iri na Atọ.

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Iri na Atọ.

NKWỤSỊ NKE IRI NA ATỌ

E butuo Ahụ Jesu n’obe

Uzo Nke Obe - Igbo Stations of the Cross - Uzo Nke Obe iriato
Nkwụsị Nke Iri na Atọ

Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele

Gbuọnụ Otu ikpere n’ala za.

Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa

Kulitenụ

Ndị agha bịara gbajie ụkwụ onye nke mbụ na onye nke abụọ a kpọgbukọtara ha na Jesu. Ma mgbe ha bịarutere ebe Jesu nọ, ha hụ na ọ nwụọlarịị, ha agbajighị ya ụkwụ. Ma otu n’ime ndị agha e were ube mapuo akụkụ ya, ọbara na mmiri agbapụta otu ihu ahụ. Nke a bụ iji mezuo ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị: “O nweghị otu ọkpụkpụ ya aga agbaji.” “Ha ga-elekwasị ya anya bụ onye nke ha jiri ube mapuo.” (Jọn 19:32-34:36-37).

Sekpurunụ Ala

Otu esi mee ọtụtụ mmadụ ndị njọ site n’ehuweghị isi nke otu onye ka e sikwa mee ọtụtụ mmadụ ndị eziomume site n’ihuwe isi nke otu onye. E mere anyị mmiri Chukwu n’ọnwụ Kristi ka anyị wee soro ya na-aga ije na ndụ ọhụrụ. (Ndị Rom 5:19; 6:3-4).

Electric Incense Burner

Electric Incense Burner with Arabian Fragrance

Now Available in Nigeria!

Chineke m, nye m onyinye nke ibi ndụ dị mma, nwụọ ọnwụ dị mma, wee soro keta añụrị ebighị ebi n’eligwe. (Uzo nke obe Iriato)

Ọha:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Nna anyị nọ n’eluigwe… Ekele Marịa … Otito dịrị Nna…

Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.

Ọha: Mere anyị ebere

Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;

Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.

Kulitenụ: kwere ukwe a gaa na nkwụsị nke iri na ano.

Ukwe: E so m Kristi koro n’obe

            Adị m ndụ ọ bụ nke Kristi

            Ọ bụ Kristi bi n’ime m. (Galeshia 2:20)

Subscribe to Receive Igbo Daily Mass Readings via Email

Follow us on Social Media:

Nkwụsị nke Iri na Abụọ: Jesu Anwuo n’elu obe

Nkwụsị nke Iri na Anọ: A Donye Jesu N’ili

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Iri na Atọ.

error: Alert: Content is protected !!