Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) | Nkwụsị Nke Iri

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Iri. Uzo nke obe Iri.

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Iri. Uzo nke obe Iri.

NKWỤSỊ NKE IRI

A gbawa Jesu Ọtọ

Uzo nke Obe - Igbo Stations of the Cross - Nkwusi nke Iri
Nkwụsị Nke Iri

Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele

Gbuọnụ Otu ikpere n’ala za.

Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa

Kulitenụ

Ndị agha kpọgburu ya bịara kee uwe ya ụzọ anọ, ọbụla eburu otu ụzọ. Ma ha lechara uwe nruala ya na-enweghị njikọ ọ bụla sị: “Onye adọkakwala nke a, kama ka anyị feere ya nza, onye ọ manyere ya werechaa”. O mezuola ihe e dere n’akwụkwọ nsọ sị: “Ha ekeriela onwe ha uwe m, bịa fee nza maka uwe nruala m”. (Jọn 19:23-24, Abụọma 2:18).

Sekpurunụ Ala

A gbara m ọtọ pụta n’afọ nne m, a ga m agba ọtọ ala mmụọ, Chineke wetara, Chineke ewerekwala, Ngọzi dịrị aha Chineke. (Job 1:21).

Electric Incense Burner

Electric Incense Burner with Arabian Fragrance

Now Available in Nigeria!

Ọha:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Nna anyị nọ n’eluigwe… Ekele Marịa … Otito dịrị Nna…

Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.

Ọha: Mere anyị ebere

Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;

Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.

Kulitenụ: kwere ukwe a gaa na nkwụsị nke iri na otu.

Ukwe: E nweghị m onye ntasị obi;

            Mmanya gbara ụka ka ha nyere m;

            Mgbe ihe ọñụñụ na-agụ m. (Abụọma 68:20-21)

Subscribe to Receive Igbo Daily Mass Readings via Email

Follow us on Social Media:

Nkwụsị nke Itoolu: Jesu Adaa nke Ugboro Ato

Nkwụsị nke Iri na Otu: A Kpodo Jesu n’obe

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Iri. Uzo nke obe Iri.

error: Alert: Content is protected !!