Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) | Nkwụsị Nke Itoolu

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Itoolu. Uzo nke obe Itoolu.

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Itoolu. Uzo nke obe Itoolu.

NKWỤSỊ NKE ITOOLU

Jesu Adaa nke Ugboro Atọ

Uzo nke Obe - Igbo Stations of the Cross - nkwusi nke itoolu
Nkwụsị Nke Itoolu

Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele

Gbuọnụ Otu ikpere n’ala za.

Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa

Kulitenụ

Awufuola m ka mmiri, njikọ ọkpụkpụ m niile agbakwarachaala. Obi m edeela ka mkpụrụ mmiri wụbam n’afọ. Ike (strength) m akpọọla nkụ ka mpekele ite. Ire m ataparala m n’agba m. Ị tụọla m n’uru nke ọnwụ.

Sekpurunụ Ala

Dinwenụ, lee, Ị hụla na abụrụla m onye ajụrụ ajụ. ọ bụ na ihe a agbasaghị ụnụ niile na-agafenụ? Letanụ ma o nwere ahụhụ ka nke a e bunyere m. Ihe ndi a ka m na-ebere akwa; anya mmiri na-ehusi m n’anya maka na e nweghị m onye nkasị obi nke m na e nwe onye na-asị m jisie ike. (Abụakwa 1:11-12, 16).

Chineke ji ike niile, nye m amara gị n’uju ka m were kwudosie ike ruo na ngwụcha. E kwela ka obi daa m mba mbge ihe na-esiri m ike.

Electric Incense Burner

Electric Incense Burner with Arabian Fragrance

Now Available in Nigeria!

Ọha:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Nna anyị nọ n’eluigwe… Ekele Marịa … Otito dịrị Nna…

Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.

Ọha: Mere anyị ebere

Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;

Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.

Kulitenụ: kwere ukwe a gaa na nkwụsị nke iri

 Ukwe: Buo amụma Nwa nke Mmadụ;

             Ka ọkpụkpụ kpọrọ nkụ wee dị ndụ;

             Ka ha nụ okwu Chukwu (Ezikiel 37:4-5).

Subscribe to Receive Igbo Daily Mass Readings via Email

Follow us on Social Media:

Nkwụsị nke Asatọ: Jesu Ezute Umunwaanyi Jerusalem

Nkwụsị nke Iri: A gbawa Jesu Oto

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Itoolu. Uzo nke obe Itoolu.

error: Alert: Content is protected !!