Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) | Nkwụsị Nke Anọ

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Anọ. Uzo nke obe Ano.

NKWỤSỊ NKE ANỌ

Jesu Ezute Nne ya N’Ụzọ

Uzo nke Obe - Igbo Stations of the Cross - uzo nke obe ano
Nkwụsị Nke Anọ

Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele

Gbuọnụ Otu ikpere n’ala za.

Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa

Kulitenụ

Mgbe Jesu hụrụ ebe nne ya kwụrụ n’ukwu obe, bịakwa hụ nwa-azụ ahụ nke ọ hụrụ na anya n’akụkụ ya. Ọ sị: “Nne, lee nwa gị”, Ya gwa nwa azụ ahụ, “Lee nne gị.” Nwa-azụ ahụ akpọrọ ya mgbe ahụ lawa n’ụlọ ya. (Jọn 19:25-17).

Sekpurunụ Ala

“Lee edebere nwata a maka ọdịda na mbilite ọtụtụ mmadụ n’Izrel. ọ bụ ihe ọmụma-atụ a ga-ekwutọ ewkutọ ka e were kpughee echiche nọ ọtụtụ mmadụ n’obi. Ma mmagha ga-amawa gị obi.

Onyenweanyi, mee ka m were nne gị dị asọ bụ Marịa ka ezigbo nne m, hụ ya n’anya ka isi hụ ya n’anya, na-asọpụrụ ya maka ihi gị. (Luke 2:34). (Uzo nke obe Ano)

Ọha:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Nna anyị nọ n’eluigwe… Ekele Marịa … Otito dịrị Nna…

Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.

Ọha: Mere anyị ebere

Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;

Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.

Kulitenụ:  kwere ukwe a gaa na nkwụsị nke ise

Ukwe: Marịa dị asọ yịọbara anyị;

            Ka anyị wee hụ Jesu n’anya

            N’ebe O koro n’obe.

Nkwụsị nke Atọ: Jesu Adaa nke Mbu

Nkwụsị nke Ise: Simion Enyere Jesu Aka Ibu Obe

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Anọ. Uzo nke obe Ano.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings

error: Alert: Content is protected !!