Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) | Nkwụsị Nke Asaa

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Asaa. Uzo nke obe Asaa.

NKWỤSỊ NKE ASAA

Jesu Adaa nke Ugboro Abụọ

Uzo nke Obe - Igbo Stations of the Cross - Uzo nke Obe Asaa
Nkwụsị Nke Asaa

Onye-ndu: Anyị esekpuoro Gị Jesu na-enye Gị ekele

Gbuọnụ Otu ikpere n’ala za.

Ọha: Maka na obe gị dị asọ ka I ji wee gbapụta ụwa

Kulitenụ

Ndị nke m, kedụ ihe m mere ụnụ? O lee ihe m ji megide ụnụ? Zanụ m! E ji m achịcha ọcha zụọ ụnụ n’ịkpa; mana ụnụ akụdala m ala pịarụchaa m ahụ. (Maịka 6:3).

Sekpurunụ Ala

E mesiri ya ike, mewapụ ya obi, mana ọ tụpụghị ọnụ ka nwaatụrụ edurula gawa igbu egbu. Ọ daa ogbu ka atụrụ a na-akpụchasị ajị. E ji aka Ike na ikpe mmegbu duru ya pụọ. (Aịzaya 53:7-8).

Biko Dinwenụ m, e kwela ka m bụrụ ohu njọ ọbụla. Mee ka m nwere onwe m, were ike m niile, echiche m niile, na mmụọ m niile bịa gbaara gị odibo n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

Ọha:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Nna anyị nọ n’eluigwe… Ekele Marịa … Otito dịrị Nna…

Onye-ndu: Jesu a kpọdoro n’obe maka ihi anyị.

Ọha: Mere anyị ebere

Onye-ndu: ka mkpụrụobi ndị niile kwerenụ gara aga;

Ọha: Site n’ebere nke Chukwu ka ha zuo ike na ndokwa. Amen.

Kulitenụ:  kwere ukwe a gaa na nkwụsị nke asatọ

Ukwe: O nwere ịhụnanya ka nke a;

            Na mmadụ werela ndụ ya;

            Nye maka ndị enyi ya? (Jọn 15:13).

Nkwụsị nke Isii: Veronica Ehichaa Jesu Ihu

Nkwụsị nke Asatọ: Jesu Ezute Umunwaanyi Jerusalem

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Nkwụsị Nke Asaa. Uzo nke obe Asaa.

Sonyere anyị na Facebook na Igbo Mass Readings

error: Alert: Content is protected !!