Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) | Ekpere Mmeghe

Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Ekpere Mmeghe.

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Ekpere Mmeghe.

Uzo nke Obe - Igbo Stations of the Cross - Ekpere Mmeghe
Ekpere Mmeghe

EKPERE MMEGHE

Jesu kpọrọ Pịta, Jemis na Jọn baa n’ogige Getsemanị sị ha: “Ọnụma juru m mmụọ na-egbu m egbu, nọrọnụ ebe a, soronụ m chebe nche ka ụnụ ghara ịdaba n’ọnwụnwa”.

Ọ pụọ kpee ekpere sị: Nna, o bụrụ na ihe a enweghị ike ịgafe m beelụsọ m ñuru ya, ka uche Gi mee. Mgbe ọkpụ okwu a n’ọnụ, Judas nwaazụ ahụ rere ya akpọrọ igwe mmadụ bucha mmagha na okpiri bata.

Ha jide Jesu kpụgara ya Kaifas onyeisi nchụaja. (Matiu 26:36-42, 47, 50).

Electric Incense Burner

Electric Incense Burner with Arabian Fragrance

Now Available in Nigeria!

Sekpurunụ Ala

Ndị iro m niile ezukọọla na-agbara m ajọ izu; na-echere m echiche ọjọọ. Nke ka nke bụ na enyi m nọ m n’obi, onye m tụkwasara obi m na ya agbala m nkele ụkwụ (heels). Onyenwe m biko mere m ebere kulite m ka m bịa kwụọ ha ụgwọ ya. (Abụọma 41:7,9-10)

Ọha:    Jesu m; ahụrụ m gị n’anya karichaa ihe niile;

              E ji m obi m niile chegharịa maka mmeghe m mehiere Gị.

              Ekwela ka m kewapụ onwe m ọzọ n’ebe Ị nọ;

              Mee ka m hụ Gị na anya mgbe ọbụla;

              Bịa were m mee ihe ọbụla masịrị Gị.

Kulitenụ: a ga eji olu a na-eji ekwe “Marịa dị asọ yọbara anyị…” ekwe ukwe a. Kwerenụ ukwe a gaa na nkwụsị nke mbụ.

Ukwe: Ọ bụ Kaifas dụrụ ha ọdụ;

             Ọ ka mma otu onye nwụọrọ ỌHA;

             Ka ỌHA ghara ịnwụrụ ya. (Jon.18:14).

Subscribe to Receive Igbo Daily Mass Readings via Email

Follow us on Social Media:

Nke a bụ Uzo Nke Obe (Igbo Stations of the Cross) – Ekpere Mmeghe.

Nkwụsị nke Mbụ: A ma Jesu Ikpe ọnwụ

error: Alert: Content is protected !!