ukwe na ekpele nk’anyị.
2. Ka mmụọma gwalụ Marịa,
N’Elizabeth tụl’ime,
Oje si ‘ike k’ọgafụ ya,
Nọnyelụ ya ọnwa ịtọ.
Eze anyị..
3. K’oge lulu iji mụ nwa,
Ọ mụpụtalụ Jesu,
N’ime ụchịchị, na Bethelhem,
N’ime ụlọ anụ, bụ be fa.
Eze anyị…
4. Okute Jesu n’ụlọ ụka,
Na mbọsị nke mwụcha ya;
Ebe Simeon kelelụ,
Ma gọzie Eze nk’ụwa.
Eze anyị…
5. K’olulu n’ụbọsị nk’ịtọ,
Ekwudolu Nwa Jesu,
Κ’Ọ nọnyelụ, n’akuzili
N’aza ndị mal’akwụkwọ.
Eze anyị…