Marịa ka I cheta anyị n’ikpere ohimiri [Complete Hymn with Lyrics]

The hymn entitled ‘Marịa ka I cheta anyị n’ikpere ohimiri‘ is one of the popular Igbo Marian hymns which is used in Christian communities during worship. Catholic faithful use this hymn as one of the hymns for Mass and other liturgical celebrations. You will find below the lyrics of this hymn.

Marịa ka I cheta anyị n’ikpere ohimiri Lyrics

m:-.s:m/f:-.m:r/d.d:-.m:m/r.r:r:-/m:-:m/r:r:-/

m:-:m/r:r:-m:m:m/r:m:f/m:-:-//

Chorus: Marịa ka I cheta anyị,

N’ikpere ohimiri,

Nne nke Jesu ekwena,

Ka ụmụ gị laa n’iyi.

1. Ka anyị nọ n’elu ụwa nke a,

Nke bụ ụzọ nke eluigwe,

Anyị na-eje dị ka n’ụgbọ,

Ka oke ifufe na-efe,

Anyị na-arịọ gị Marịa,

Onye nọ n’eluigwe,

Echefukwana ndị ije,

Chebe ụgbọ ndị ije.

2. Ka anyị nọ n’ime ahụhụ,

Na mkpa, ya na nsogbu,

Ka mmiri na-ebugharị ụgbọ,

N’oge ebili ji-atụ,

Anyị na-arịọ Gị, Marịa,

Onye nọ n’eluigwe,

Ka ụgbọ ghara ikpu na mmiri

Chebe ụgbọ ndị ije.

3. Ka anyị wee rue n’oge ọnwụ,

Ka e wee kpee anyị ikpe,

Ka ụgbọ nke anyị na-enye n’ala,

Biko bịa kwudebe,

Anyị na-arịọ Gị Marịa,

Onye nọ n’eluigwe,

Echezọkwana ụmụ gị,

Chebe ụgbọ ndị ije.

Other Igbo Marian Hymns

Other Catholic Hymns