Igbo Mass Readings for August 14 2024, Nnukwu Emume Mbugoro N’Eluigwe nke Marịa dị Ngọzi – Ụka Nche Abalị.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 14 2024, Nnukwu Emume Mbugoro N’Eluigwe nke Marịa dị Ngọzi – Ụka Nche Abalị

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15:3-4, 15-16; 16:1-2

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ mbụ nke lhe e mere (Kronịkul)

Devid kpọkụtara ụmụ Izrel niile na Jerusalem, ka ha bugote igbe ọgbụgbandụ nke Dinwenụ n’ọnọdụ ya, bụ nke o meziiri ya. Devid kpọkọtara ụmụ Erọn ndị nwoke niile ọnụ, na ndị agbụrụ Levaị niile.

Ndị agbụrụ Levaị jiri okporo osisi buru igbe ọgbụgbandụ ahụ n’ubu ha, dịka Mosis siri nye n’iwu site n’okwu nke Yahweh. Devid nyekwara ndịisi niile nke agbụrụ Levaị iwu ka ha si n’etiti ụmụnna ha họpụta ndị ukwe, ndị ga-eji ngwa egwu dị iche-iche, ụbọ akwara, une na ọyọ, tipụta egwu ọñụ.

Ha bubatara igbe ọgbụgbandụ nke Chineke, dote ya n’ime ụlọ mkpu nke Devid rụrụ maka ya; ha a bịa chụọ aja nsureọkụ na aja udo n’ihu nke Chineke. Mgbe Devid chụchara aja nsureọkụ na nke udo ahụ, o jiri aha Dinwenụ gọzie ndị mmadụ ahụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 132: 6-7, 9-10, 13-14,

Azịza: Bilie Onyenweanyị gaa n’ebe ezumike gị; gị na igbe ọgbụgbandụ nke ike gị

1. Gee ntị, anyị nụrụ maka ya n’obodo Efrata,

anyị hụrụ ya n’obosara ala nke Yiarim.

Ka anyị gaa n’ụlọ obibi ya

wee kpọọ isi ala nye ya, n’ihu ocheeze ya!” Azịza

2. Ka ndị ụkọchukwu gị yiri eziomume dịka uwe,

ka ndị nsọ gị tikwaa mkpu añụrị.

N’ihi nwodibo gị bụ Devid,

a chụpụla onye nke gị i tere mmanụ. Azịza

3. N’ihina Onyenweanyị ahọrọla Zayọn,

ọ họrọla ya ka ọ bụrụ ebe obibi.

“Ebe a ka m ga-anọ ebeebe,

ebe a bụ ebe obibi m họọrọ. Azịza

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 15:54-57

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Mgbe ahụ a nke pụrụ ire ure yikwasịrị ereghị ure, ahụ a nke pụrụ ịnwụ anwụ yikwasịrị anwụghị anwụ, mgbe ahụ okwu ahụ e dere n’Akwụkwọ nsọ ga-emezu sị, “E loola ọnwụ na mmeri”

Ọnwụ! olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ olee ebe ihe ụfụ gị dị? Ihe ọgbụgba nke ọnwụ bụ mmehie. Ihe na-enye mmehie ike bụ iwu. Ma ekele dịrị Chineke onye na-enye anyị mmeri site n’Onyenweanyị Jesu Kristi.

MBEKU

ALLELUIA, ALLELUIA:

“Ngọzi na-adịrị ha karịa, bụ ndị nụrụ okwu Chineke dobekwa ya!”

ALLELUIA.

OZIỌMA – 11:27-28

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Mgbe Jesu na-ekwu okwu ndị a, otu nwaanyị si n’etiti igwe mmadụ ahụ welie olu sị, “Ngọzi na-adịrị afọ nke mụrụ gị na ara nke Ị ñụrụ!”

Ma Ọ zara sị, “Ngọzi na-adịrị ha karịa, bụ ndị nụrụ okwu Chineke dobekwa ya!”

Igbo Mass Readings for August 15 2024, Emume Mbugoro N’Eluigwe nke Marịa dị Ngọzi

Igbo Mass Readings for August 14 2024, Nnukwu Emume Mbugoro N’Eluigwe nke Marịa dị Ngọzi – Ụka Nche Abalị.

Last Update: December 10, 2022