Igbo Mass Readings for January 8 2024, Mmirichukwu nke Onyenweanyị.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 8 2024, Mmirichukwu nke Onyenweanyị.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 42:1-4, 6-7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: Onye a bụ Nwa M, Onye ihe Ya na-amasị M.

Lee nwodibo M, Onye M weliiri aka elu. Ọ bụ Onye M họtara ahọta, Onye ihe Ya na-atọ M ụtọ n’obi. Enyela M Ya mmụọ M ka o wee wetara mba nile ikpe nkwụmọtọ.

Ọ gaghị eweli olu Ya elu ma ọ bụ tie mkpu, nke ọ na-eme ka a nụ olu Ya n’ama. Ọ gaghị agbaji amị a gbajitụrụ agbaji. Ọ gaghịkwa emenyụ ire ọkụ na-eme bubebe.

Ọ ga-eguzosị ike n’ime ka ikpe nkwụmọtọ pụta ihe. Ọ gaghị enwe obi abụọ; a gaghị emeri Ya, ruo mgbe ikpe nkwụmọtọ ga-eguzoro n’elu ụwa n’ihi na mba nile na-eche iwu Ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 28:1-4, 9-10 Az. 11

Azịza: Onyenweanyị ga-eji udo agọzi ndị nke Ya

1. Ụnụ bụ ụmụ Chineke, nyenụ Dinwenụ, nyenụ Dinwenụ otito na ike.

Nyenụ Dinwenụ otito kwesịrị aha Ya,

sekpuoronụ Dinwenụ n’ebe Ya dị nsọ. Azịza.

2. Olu nke Dinwenụ na-ada ụda n’elu mmiri.

Olu nke Dinwenụ na-ada ụda n’elu nnukwu osimiri.

Olu nke Dinwenụ jupụtara n’ike;

olu Dinwenụ dị nnukwu ebube. Azịza.

3. Chineke dị ebube na-agba ka egbe eluigwe.

N’ebe Ya dị nsọ mmadụ nile na-eti mkpu na-asị:

“Otito Onyenweanyị nọ n’oche eze Ya n’elu mmiri.

Onyenweanyị nọ n’ugwu eze Ya ruo mgbe ebighịebi. Azịza

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 10:34-38.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi

Isi Okwu: Onyenweanyị ejirila Chukwu Mmụọ Nsọ tee Ya ude.

Pita wee bido okwuchukwu ya, sị: “Ugbu a ka m na-aghọta n’eziokwu, na Chineke abụghị Onye na-asọ mmadụ anya. Kama na mba ọ bụla, onye ọ bụla kwụbara aka ya ọtọ, na-atụkwara Ya egwu, ka Ọ na-anabata nke ọma.

Ọ bụ ezie na Chineke ziteere ụmụ Izrel okwu Ya. Ọ bụkwa ha ka e wetaara Oziọma nke udo site n’ọnụ Jesu Kristi. Ma Jesu Kristi bụ Onyenwe mmadụ niile.

E leghị anya, ụnụ anụla ihe ukwu ahụ merenụ na Judia, na nso nso a. Ọ bụ maka Jesu Onye Nazaret, Onye Chineke jiri Mmụọ Nsọ na ike chie echichi; na otu O si bido na Galili, mgbe Jọn kwuchara okwuchukwu maka mmirichukwu.

N’ihina Chineke nọnyeere Jesu, O jegharịrị na-eme mma, na-agwọ ndị niile danyere n’ike nke ekwensu.

ALELUYA – Mak 9:8

Aleluya, aleluya!

Eluigwe meghere. E wee nụ ka olu nke Nna kwuru sị: “Onye a bụ Nwa M, M hụrụ n’anya. Geenụ Ya ntị”.

Aleluya!

OZIỌMA – 3:13-17

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Otu ihu e mechara Jesu mmirichukwu, a hụrụ Mmụọ nke Chineke ka Ọ na-abịakwasị Ya.

N’oge ahụ, Jesu siri na Galili bịakwute Jọn n’osimiri Jọdan ka Jọn mee Ya mmirichukwu. Ma Jọn gbara mbọ ịjụ ajụ wee sị Ya: “Ọ bụ m kwesịrị ịbịakwute Gị ka i mee m mmirichukwu.

Olee otu I siri bịakwute m”? Jesu wee zaa ya, sị: “Hapụgodụ ya otu ahụ ugbu a, ka e were si otu ahụ mejuo iwu.” Jọn wee kwenye. Ma ngwa ngwa e mesịrị Jesu mmirichukwu, O si na mmiri pụta.

Eluigwe meghere na mberede. O wee hụ Mmụọ nke Chineke ka Ọ na-agbadata n’ụdị nduru. wee dakwasị Ya. Otu olu wee si n’eluigwe kwuo sị: “Onye a bụ Nwa M, M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya na-amasị M.”

Igbo Mass readings for January 9 2024, Tuzde Izuụka nke Mbụ n’oge na-adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for January 8 2024, Mmirichukwu nke Onyenweanyị.