Igbo Mass Readings for Monday Izu Uka Di Aso

MONDAY: IZU UKA DI ASO.

EKPERE MMEGHE
Chineke Nna ji ike niile, site n’ahuhu na onwu nke Nwa Gi, gbaa anyi ume ma chekwaba anyi n’adighi ike anyi. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi Nwa Gi…

Ihe Ogugu nke mbu. 42:1-7
Ihe ogugu ewetara n’Akwukwo onye amuma Aizaya
Nke a bu nwodibo m onye m ji eme onu, onye m hooro, onye ihe ya na-amasi m. Etinyela m mmuo m n’ime ya. O ga-ewetara mba niile ikpe nkwumoto. O gaghi eti mkpu, ma o bu kwusie okwu ike, a gaghi anu olu ya n’okporo uzo. Ogaghi agbaji osisi na-esighi ike, ma o bu menyuo oku na-acho inyu anyu. Ọ ga akwudosike n’iweta ikpe nkwumoto. Ike agaghi agwu ya, o gaghi adakwa mba ruo mgbe o ga-akwuwa ikpe nkwumoto n’elu n’uwa. Mba niile bi n’akuku osimiri ga-echere nkuzi ya. Nke a ka Oseburuwa Chineke kwuru: onye kere eluigwe gbasaa ya, kekwaa uwa na ihe niile di n’ime ya, onye nyere mmadu niile bi na ya ndu, tinyekwa mmuo n’ihe niile na-agaghari na ya. Mu onwe m bu Yahweh, akpoola m unu ka unu buru ndi eziomume. Esekpuuru m unu n’aka nye unu onodu. Unu aburula ihe ogbugbandu mu mu na ndi mmadu, ihè nke mba niile. Unu ga-eme ka ndi kpuru isi hukwa uzo, mee ka ndi eji eji nwere onwe ha, mee ka ndi no n’ochichiri nweta ihe.

ABUOMA NA AZIZA: Ps: 27: 1, 2, 3, 13-14.
Aziza: Dinwenu bụ ìhè m na nzoputa m.

  1. Dinwenu bu ihè na nzoputa m,
    onye ka m ga-atu egwu?
    Dinwenu bu ide nke ndu m,
    onye ga-eyi m egwu! Az./
  2. Mgbe ndí ajoomume na-achu m,
    ka ha dorie anu ahu m,

O bu ha ndiiro m,
bu ndi ga-akpobi ukwu, daa. Az./

  1. Oburugodu na igwe ndi agha agbaa m gburugburu.
    Egwu obula agaghi atu m
    Obuladi na e busoro m agha,
    okwukwe m ka siri ike. Az./
  2. Ekwere m na m ga-ahu idi mma nke Chineke
    n’ala ndi di ndu,
    Chekwube na Dinwenu. Obi sie gi ike;
    tukwasi ya obi, chekwube na ya. Az./

MBEKU:
Az./
Ka anyi toonu Onyenweanyi, O na agbaghara njo ndi nke ya. Az./

OZIOMA: 12:1-11.
Ihe ogugu ewetara na Ozioma di aso nke Jon dere.
Ka Emume Ngabiga foduru mkpuru ubochi isii, Jesu gara Betani obodo nke Lazuros bu onye Jesu mere ka o si n’onwu bilie. Ha siri ya nri anyası n’ebe ahu. Mata no na-eje ozi, ebe Lazuros so n’otu n’ime ndi ha na Jesu no na-eri nri. Meri weere otu mkpo ude na-esi isioma, nke dara oke onu, nke e ji ezi Naad mee, tee n’ukwu Jesu werekwa ntutuisi ya hicha ya. Isi ude ahu juputara n’ulo ha no n’ime ya. Ma Judas Iskariot, otu onye n’ime ndi na-eso uzo ya, onye ahu ga arara ya nye kwuru si, “Gini mere ereghi ude a nari ato, were ego ya nye umu ogbenye?” Nke a kao kwuru, o bughi maka okporo ndi ogbenye ihe, kama n’ihina o bu onye ohi. Dika onye na ejide akpa ego nke ndi otu, o na-ewebiri ihe e tinyere n’ime akpa ego ahu. Jesu siri, “Hapunu nwaanyi a, ka o dobe ya maka ubochi olili m. Unu na ndi ogbenye no mgbe obula, ma mu na unu anoghi n’udi a mgbe obula.”
Mgbe otutu ndi Juu nuru na Jesu no na Betani, ha biara, o bughi naani ka ha hu Jesu, kama ka ha hukwuo Lazuros, onye o mere ka o si n’onwu bilie. Nke a mere ndi isi nchuaja ji gbaa izu ka ha gbukwuo Lazuros. N’ihi na o bu n’ihi Lazuros ka otutu ndi Juu ji na-ahapu ndi ndu ha, na ekwerekwa na Jesu.
EKPERE NHUNYE
Dinwenu, were obi ebere Gi lekwasi onyinye anyi anya. Mee ka aja nke Nwa Gi Jesu Kristi dubata anyi na ndu ebighi ebi, n’ihina o bu Dinwenu ebighi ebi. Anyi na-ario Gi ihe ndja site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO
Chineke Onye ebere, nodụ ndi nke Gi nso. Legide anyi bu ndi natara sacramenti nzoputa nke a anya, ma chekwaba anyi n’ihunaanya Gi. Anyi na-ario Gi ihe ndja n’aha Kristi Dinwenu anyi. Amen.

error: Content is protected !!
Open chat
1
Catholic Lectionary
Hello 👋
How can I help you?