Igbo Mass Readings for March 11 2024, Mọnde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 11 2024, Mọnde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 65:17-21

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Aịzaya

Ma lee, ana m eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, agaghị echetakwa ihe ndị gara aga, nke ha na- abatakwa ọzọ n’uche mmadụ. Nwee obi ụtọ, ma ñụrịa ọñụ n’ihe m kere, n’ihi ana m eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọñụ, ka ndị nọ n’ime ya nwee obi añụrị.

Aga m añụrị na Jerusalem, ma nwee obi ụtọ n’ebe ndị nke m nọ; a gaghị anụ mkpu akwa ọzọ n’ime ya, ma ọ bụ akwa arịrị. N’ime ya, agaghị enwekwa ụmụ ntakịrị ọhụrụ ndị ga-anọ abalị ole-ma-ole, ma ọ bụ ndị okenye na-agaghị anọzu ụbọchị ha.

Ịnwụ n’otu narị afọ bụ ịnwụchu anwụchu; ma ebirughị otu narị afọ na-egosi abụmọnụ. Ha ga-arụ ụlọ ma birikwa n’ime ha; ha ga-akọ ubi osisi Vaịn ma riekwa mkpụrụ ha.

ABỤỌMA NA AZịZA – Ps. 30:2, 4, 5-6,11-13.

Azịza: Aga m eto gị O Chineke n’ihi na ị zọpụtala m.

1. Aga m eto gị O Chineke n’ihi na i zọpụtala m,

Ikweghị ka ndịiro m merie m.

Chineke, Ị zọpụtala m n’ala mmụọ,

Naanị m ka ị zọpụtara na ndị dabara n’ọnụ ọnwụ. Azịza

2. Ụnụ ndị kwụdosiri ike na Chineke kụọrọnụ ya egwu,

chetanụ ịdị nsọ ya, ma toonụ ya.

Iwe ya anaghị ete aka,

ma amara ya na-adịgide,

n’oge abalị ịkwa akwa na adị,

ma ka chi bọrọ añụrị na-adị. Azịza

3. Nụrụ olu m, ma meere m ebere, Chineke,

Chineke bụrụ onye enyemaka m,

I meela ka iru ụjụ m ghọọ ọñụ,

Chineke na Chukwu m, aga m eto gị ebeebe. Azịza

MBEKU – Jọn 11:25,26.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Jesu wee sị ya, “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ, onye ọbụla kwere na m agaghị anwụ ma ọlị.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 4:43-54.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gachara Jesu siri n’ebe ahụ pụọ gaba Galili. Jesu na onwe ya gbara akaebe sị, “A dịghị asọpụrụ onye amụma n’obodo ya.” Mgbe o rutere na Galili, ndị obodo ahụ nabatara ya nke ọma, n’ihina ha onwe ha gara Emume Ngabiga na Jerusalem, hụ nnukwu ọrụ ebube niile ọ rụrụ n’oge Emume ahụ.

Jesu bịaruru Kena nke dị na Galili ọzọ, ebe o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. N’obodo Kapanaum o nwere otu nwoke na-ejere ndị ọchịchị ozi, onye ahụ na- adịghị nwa ya.

Mgbe ọ nụrụ na Jesu esila na Judia bịa Galili, ọ gakwuru ya, rịọ ya ka ọ bịa Kapanaum gwọọ nwa ya n’ihina nwa ya nọ n’ọnụ ọnwụ. Ma Jesu sịrị ya, “Ọ bụrụ na ụnụ ahụghị ihe ịrịbaama na ọrụ ebube, ụnụ agaghị ekwe ma ọlị.”

Nwoke ahụ na-ejere ndị ọchịchị ozi sịrị ya, “Nnamukwu, bịa ngwa-ngwa tupu nwa m anwụọ.” Jesu sịrị ya, “Laba, nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Nwoke ahụ kweere n’okwu Jesu gwara ya, wee laba.

Ma mgbe ọ na-ala, ụmụodibo ya zutere ya n’ụzọ sị ya, “Nwa gị nwoke dị ndụ.” Ọ jụrụ ha oge ahụ bidoro dịwa ya mma. Ha asị ya, “Ụnyahụ n’elekere mbụ nke ehihie ka ahụọkụ hapụrụ ya.”

Nna nwata ahụ wee mata na ọ bụ n’oge elekere ahụ Jesu gwara ya sị, “Nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” N’ihi nke a ya na ezinụụlọ ya niile wee kwere. Nke a bụ ọrụ ebube nke abụọ nke Jesu rụrụ mgbe o siri na Juda bịa Galili.

Igbo Mass readings for March 12 2024, Tuzde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi

Igbo Mass Readings for March 11 2024, Mọnde Izuụka nke Anọ n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.

Last Update: November 2, 2021