Igbo Mass Readings for Monday of Third Week of Lent

MONDEE IZU UKA NKE ATO N’OGE AHUHU KRISTI.

EKPERE MMEGHE
Chineke Onye ebere, ekwela ka Nzuko Gi daba na njo ma chekwaba ya n’ajo ihe niile, na-eduzi anyi n’ihina ewezuga Gi, anyi agaghi enweta nzoputa. Site na Dinwenu anyi Jesu Kristi …

Ihe Ogugu nke mbu: 5:1-15
Ihe ogugu ewetara n’Akwukwo nke abuo nke Ndieze
Naaman onye isi agha nke Siria bu nwoke di ukwu n’ihu nna ya ukwu, n’ihina site na mgbali ya ka Yahweh ji nye Siria mmeri. Nwoke a bu dike n’agha, ma o bu onye ekpenta. N’otu n’ime agha ha busoro Izrel na mberede, ndi Siria dotara otu ntakiri nwaagbogho, onye nke mechara buru odibo nwuye Naaman.
Nwata a gwara nne ya ukwu si, “A si na nna m ukwu ga agakwuru onye amuma nke bi na Sameria! O ga-agwo ya oria ya.” Naaman jekwuru nna ya ukwu kosara ya kpomkwem, ihe niile nwatakiri ahu kwuru. Eze Siria zara ya si, “Gaba ugbu a, aga m enye gi akwukwoozi i ga enye eze Izrel.” O gabara, were talent olaocha iri, puku shekel olaedo isii na uwe emume iri. O wetaara eze Izrel akwukwoozi ahu nke ihe e dere n’ime ya bu, “Akwukwoozi a bu iji gwa gi na ezitere m nwodibo m bu Naaman ka i gwoo ya oria ekpenta ya. Mgbe eze ndi Izrel guru akwukwoozi ahu o dowaa uwe ya kwuo si, “Abu m Chineke onye onwu na ndu di n’aka mere nwoke a jiri zitere m ozi ka m gwoo onye ekpenta? Hukwanu otu Nwoke a si acho m okwu!” Mgbe Elaisha onye nke Chineke nuru ka eze ndi Izrel siri dowaa uwe ya, o zigaara ya ozi juo ya si, “Kedu ihe kpatara I jiri dowaa uwe gi? Gwa nwoke ahu ka o biakwute m, o ga-amata na enwere onye amuma n’ala Izrel.” Ya mere, Naaman jiri inyinya ya na ugboinyinya ya bia. guzoro n’onuuzoulo Elaisha. Elaisha zipuru onyeozi ka o gwa ya si, “Gaa saa ahu n’osimiri Jodan ugboro asaa, ahu gi ga-adikwa mma ozo.”
Naaman jiri iwe na onuma tugharia laba, na-ekwu si, “Echere m nnoo na o gaara aputa, guzoro, kpokuo aha Yahweh Chineke ya, fegharia aka ya n’elu ebe ahu, gwoo oria m. O bu na osimiri Abana na Fapa nke di na Damaskos adighi mma karia mmiri Izrel niile? O bu na enweghi m ike isa ahu n’ime ha wee di ocha?” Ya mere, o tugharia laba n’iwe. Ndi odibo ya biakwutere ya si ya, Nna anyi ukwu, a si na ihe onye amuma gwara gi mee bu ihe siri ike omume, o bu na i gaghi eme ya? Ma nke a buna o gwara gi naani saa ahu ka i dikwa ocha. Ya mere o gara sunye onwe ya n’ime osimiri Jodan ugboro asaa dika Elaisha gwara ya. Anuahu ya wee dikwa mma di ka ahu nwatakiri. Mgbe ahu, Naaman na ndi ozi ya laghachiri jekwuru onye nke Chineke ahu si ya, Ugbu a, amatala m na enweghi chi ozo n’elu uwa beluso n’ala Izrel. Biko nara ihe onyinye ekele sitere n’aka nwodibo gi.”
ABUOMA NA AZIZA: Ps:42:2, 3, 43: 3, 4.

Aziza: Akpiri na-akpo n nkų maka Chineke, Chukwu nke ndi di ndu, kedu oge m ga-Ahu ya ihu na ihu.

  1. Dika otu aguu mmiri si na-agu nne ele,
    otu ahu ka aguu si na-agu m maka gi O Chineke m. Az./
  2. Akpiri na-akpo m nku maka Chineke,
    Chukwu nke ndi di ndu,
    kedu oge m ga-enwe ike jee hu ihu nke Chineke? Az./
  3. Ziputa ihè gi na eziokwu gi
    ka ha na-edu m,
    Ka ha dubata m n’ugwu gi di nso
    ebe i jiri mere ebe obibi. Az./
  4. Mgbe ahu aga m aga n’ebe nchuaja nke Chineke,
    Chineke nke bu anuri m.
    Aga m eji añuri were ubo too gi
    Onyenweanyi, Chineke m. Az./
    MBEKU: Ps 95:8.
    Az./
    Taa, o buru na unu anu olu ya, unu akpochila obi unu. Az./

OZIOMA: 4:24-30
Ihe ogugu ewetara n’ Ozioma di aso nke Luk dere.
Mgbe Jesu biaruru Nazaret, ogwara ndi mmadu no n’ulo nzuko okwu si: N’ezie agwa m unu, anaghi anabata onye amuma obula n’obodo a muru ya. E nwere otutu umunwaanyi isimkpe n’Izrel n’oge Elaija. Mgbe e mechiri eluigwe mmiri ezoghikwa afo ato na onwa isii, mgbe oke ugani dara n’ala ahu dum; ma o nweghi onye n’ime ha e zigaara Elaija ma o bughi naani otu nwaanyi ajadu nke bi n’obodo Zarefat, nke di n’ala Saidon. Otutu ndi ekpenta nokwa n’ala Izrel n’oge Elisha; ma o nweghi onye obula n’ime ha e mere ka o di ocha ma o bughi Naaman, onye Siria.” Mgbe ndi niile no n’ulo nzuko ahu nuru okwu ndi a, iwe juputara ha n’obi.
Ha biliri, kwapu ya n’obodo ha, kpuru ya ruo n’otu ugwu nta a rukwasara obodo ha n’elu ya ka ha si ebe ahu kwada ya. Ma o michapuru onwe ya n’aka ha, si n’etiti igwe mmadu ahu laa.
EKPERE NHUNYE
Nna, Gozie onyinye ndi a ka ha ghoo sacramenti nke nzoputa anyi. Anyi na-ario Gi ihe ndja n’aha Kristi Dinwenu anyi

EKPERE ANATACHAA ORIRI NSO
Dinwenu, gbaghara njo ndi nke Gį ndi natara sacramenti Gi,ma kpokota anyi niile onu n’idi n’udo. Mezuoro anyi ihe ndi a site na Kristi Dinwenu anyi. Amen.

error: Alert: Content is protected !!