Igbo Mass Readings for March 25 2024, Mọnde n’ime Izuụka dị Asọ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 25 2024, Mọnde n’ime Izuụka dị Asọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 42:1-7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Aịzaya

Nke a bụ nwodibo m onye m ji eme ọnụ, onye m họọrọ, onye ihe ya na-amasị m. Etinyela m mmụọ m n’ime ya. Ọ ga-ewetara mba niile ikpe nkwụmọtọ.

Ọ gaghị eti mkpu, ma ọ bụ kwusie okwu ike, a gaghị anụ olu ya n’okporo ụzọ. Ọ gaghị agbaji osisi na-esighị ike, ma ọ bụ menyụọ ọkụ na-achọ ịnyụ anyụ. Ọ ga-akwụdosike n’iweta ikpe nkwụmọtọ.

Ike agaghị agwụ ya, ọ gaghị adakwa mba ruo mgbe ọ ga-akwụwa ikpe nkwụmọtọ n’elu n’ụwa. Mba niile bi n’akụkụ osimiri ga-echere nkuzi ya. Nke a ka Osebụrụwa Chineke kwuru: onye kere eluigwe gbasaa ya, kekwa ụwa na ihe niile dị n’ime ya, onye nyere mmadụ niile bi na ya ndụ, tinyekwa mmụọ n’ihe niile na-agagharị na ya.

Mụ onwe m bụ Yahweh, akpọọla m ụnụ ka ụnụ bụrụ ndị eziomume. Esekpụụrụ m ụnụ n’aka nye ụnụ ọnọdụ. Ụnụ abụrụla ihe ọgbụgbandụ mụ na ndị mmadụ ihe nke mba niile. Ụnụ ga-eme ka ndị kpuru isi hụkwa ụzọ, mee ka ndị eji eji nwere onwe ha, mee ka ndị nọ n’ọchịchịrị nweta ihe.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 27: 1, 2, 3, 13-14.

Aziza: Dinwenụ bụ ihe m na nzọpụta m.

1. Dinwenụ bụ ihe na nzọpụta m,

onye ka m ga-atụ egwu?

Dinwenụ bụ ide nke ndụ m,

onye ga-eyi m egwu! Azịza

2. Mgbe ndị ajọomume na-achụ m,

ka ha dọrie anụ ahụ m,

Ọ bụ ha ndịiro m,

bụ ndị ga-akpọbi ụkwụ, daa. Azịza

3. Ọ bụrụgodụ na igwe ndị agha agbaa m gburugburu.

Egwu ọbụla agaghị atụ m

Ọbụladị na e busoro m agha,

okwukwe m ka siri ike. Azịza

4. Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke Chineke,

n’ala ndị dị ndụ,

Chekwube na Dinwenụ. Obi sie gị ike;

tụkwasị ya obi, chekwube na ya. Azịza

MBEKU

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

Ka anyị toonụ Onyenweanyị, Ọ na-agbaghara njọ ndị nke ya.

R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.

OZIỌMA – 12:1-11.

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Ka Emume Ngabiga fọdụrụ mkpụrụ ụbọchị isii, Jesu gara Betani obodo nke Lazụrọs bụ onye Jesu mere ka o si n’ọnwụ bilie. Ha siiri ya nri anyasị n’ebe ahụ.

Mata nọ na-eje ozi, ebe Lazụrọs so n’otu n’ime ndị ha na Jesu nọ na-eri nri. Meri weere otu mkpọ ude na-esi isiọma, nke dara oke ọnụ, nke e ji ezi Naad mee, tee n’ụkwụ Jesu werekwa ntụtụisi ya hicha ya.

Isi ude ahụ jupụtara n’ụlọ ha nọ n’ime ya. Ma Judas Iskarịọt, otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ ya, onye ahụ ga-arara ya nye kwuru sị, “Gịnị mere e reghị ude a narị atọ, were ego ya nye ụmụ ogbenye?”

Nke a ka o kwuru, ọ bụghị maka na-ọkpọrọ ndị ogbenye ihe, kama n’ihi na ọ bụ onye ohi. Dịka onye na-ejide akpa ego nke ndị otu, ọ na-ewebiri ihe e tinyere n’ime akpa ego ahụ.

Jesu sịrị, “Hapụnụ nwaanyị a, ka o dobe ya maka ụbọchị olili m. Ụnụ na ndị ogbenye nọ mgbe ọbụla, ma mụ na ụnụ anọghị n’ụdị a mgbe ọbụla.” Mgbe ọtụtụ ndị Juu nụrụ na Jesu nọ na Betani, ha bịara, ọ bụghị naanị ka ha hụ Jesu, kama ka ha hụkwuo Lazụrọs, onye o mere ka o si n’ọnwụ bilie.

Nke a mere ndị isi nchụaja ji gbaa izu ka ha gbukwuo Lazụrọs. N’ihi na ọ bụ n’ihi Lazụrọs ka ọtụtụ ndị Juu ji na-ahapụ ndị ndu ha, na-ekwerekwa na Jesu.

Igbo Mass readings for March 26 2024, Tuzde n’ime Izuụka dị Asọ.

Igbo Mass Readings for March 25 2024, Mọnde n’ime Izuụka dị Asọ.

Last Update: November 7, 2021