Igbo Mass Readings for January 16 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 16 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:1-10

Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru

A na-esi n’etiti ndị mmadụ họrọ onyeisi nchụaja ọbụla, ka ọ nọchite anya ndị mmadụ n’ihe banyere ife Chukwu, iji na-ehunye onyinye ịchụ aja maka njọ.

Ebe ọ bụ na ya onwe ya bụ onye na-adịghị ike, ọ pụrụ iji nwayọọ na-emeso ndị na-amaghị ihe na ndị na-ejehie ụzọ omume. N’ihi nke a, ọ ga-achụrịrị aja maka njọ nke onwe ya na nke ndị mmadụ.

O nweghị onye na-ewere ugwu nke a n’onwe ya, kama ọ bụ Chineke kpọrọ ya dịka o si kpọọ Erọn. N’otu aka ahụ, kristi ejighị aka ya bulie onwe ya elu ka e mee ya onyeisi nchụaja, kama a họpụtara ya site n’aka onye ahụ sịrị ya, “I bụ nwa m, taa ka m mụtara gị”.

Dịka o si kwu n’ebe ọzọ sị, “Ị bụ ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek”. Mgbe Jesu ka dị ndụ n’anụ ahụ, o ji ibe akwa na anyammiri chee ekpere na arịrịọ ya n’ihu onye ahụ nke nwere ike ịzọpụta ya n’ọnwụ, A nụrụ olu ya n’ihi ịtụ egwu Chineke, ya.

Ọ bụ ezie na ọ bụ nwa Chineke, ma o sitere n’oke ahụhụ mụta irubeisi; mgbe e mechara ya ka o zuo oke, ọ ghọọrọ ndị niile na-erubere ya isi, isi iyi nke nzọpụta ebeebe, bụrụ onye Chineke mere onyeisi nchụaja n’usoro nke Melkizedek.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 110:1, 2, 3, 4.

Azịza: Ịbụ ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek

1. Dinwenụ gwara gị nna m ukwu sị, “Nọrọ ala n’aka nri m,

aga m eme ndịiro gị ihe mgbakwasa ukwu gị.” Azịza

2. Onyenweanyị, ga-amanye ndịiro gị niile,

ka aha nọrọ n’okpuru ọchịchị gị na Zayọn. Azịza

3. Ugwueze bụ nke gị bido n’ụbọchị a mụrụ gị n’elu ugwu dị nsọ,

ị bụ eze site n’afọ, bido n’isi ụtụtụ nke ndụ gị. Azịza

4. Onyenweanyị añụọla iyi nke na ọ gaghị ala azụ na ya,

ị bụ ụkọchukwu ebeebe n’usoro nke Melkizedek. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Dinwenụ meghere obi ya, ige ntị n’ihe niile Pọl na-ekwu.

Alleluia.

OZIỌMA – 2:18-22

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

N’oge ahụ, ndị na-eso ụzọ Jọn, onye na-eme mmirichukwu, na ndị na eso ụzọ ndị Farisii na-ebu ọnụ; ndị mmadụ bịara jụọ Jesu sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji ebu ọnụ ma ndị na-eso ụzọ gị anaghị ebu ọnụ?”

Jesu wee jụọ ha sị, “Ndị bịara maka oriri alụm di na nwunye, ha na-ebu ọnụ mgbe ha na onye na-alụ nwaanyị ọhụrụ nọ? Mba! ha agaghị ebu ọnụ mgbe ha na onye na-alụ nwaanyị nọ.

Ma oge na-abịa mgbe a ga-akpọpụ onye na-alụ nwaanyị ọhụrụ site n’etiti ha; mgbe ahụ, ha ga-amalite ibu ọnụ.

O nweghị onye na-ewere ibiribe akwa dị ọhụrụ dụkwasa n’uwe ochie; o mee nke a ndọka jọkarịrị njọ na-apụta. O nweghịkwa onye na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime kalama ochie; o mee otu a, mmanya ahụ ga-agbawa kalama ahụ, ha abụọ alaa n’iyi; Mba! mmanya ọhụrụ n’ime kalama ọhụrụ.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for January 16 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X
Scroll to Top

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.