Igbo Mass Readings for January 15 2024, Mọnde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 15 2024, Mọnde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15:16-23
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ mbụ nke Samuel
Samuel wee sị Sọl “Kwụsị! Aga m agwa gị ihe Chineke gwara m n’abali taa.” Sọl asị ya “Gwa m.” Samuel gwa ya, sị, “Ọ bụ ezie na ị dị nta n’anya gị, ma ị bụ onye ndu nke agbụrụ Izrel niile.
Yahweh tere gị mmanụ ka ị bụrụ eze Izrel. O zigakwara gị nye gị iwu, ka I jee kpọchapụ mba obi ọjọọ ahụ bụ ndị Amalek. Ọ gwara gị ka I buo agha megide ha ruo mgbe I kpochapụrụ ha.
Gịnị mere I rubereghị Yahaweh isi? Gịnị mere I ji bụrụ ihe a lụtara n’agha lọta, wee mee ihe dị njọ n’anya Yahweh? Sọl azaghachi Samuel, “N’eziokwu erubeere m Yahweh isi. Ejere m dịka ọ gwara m, gbuo ndị Amalek niile, kpụrụ eze ha bụ Agag, lọta na ndụ.
Ndịagha mụ na ha so, n’akụkụ nke ha, egbughịkwa ndị kachasị mma n’igwe ewu, na atụrụ, na ehi ndị ala ahụ, ndị ha nwudere. Kama, ha chịịrị anụmaanụ ndị a bịa na Gịlgal, ịchụrụ Yahweh bụ Chineke gị aja.”
Ma Samuel gwara ya sị, Olee nke na-atọ Chineke ụtọ karịa, ọ bụ irubere ya isi, ka ọ bụ ịchụrụ ya aja nsureọkụ na aja dị icheiche? N’ezie irubeisi ka mma karịa ịchụ aja, mmadụ iwedata onwe ya ka mma karịa iji abụba ebule chụọ aja.
Inupụisi dị njọ dịka ịgba afa. Isiike dị njọ dị ka ikpere arụsị. “N’ihina ị jụrụ ime ihe Yahweh kwuru, Yahweh ajụla gị ịbụ eze.”
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 50:8-9, 16-17, 21-23
Azịza: Aga m egosi ndị eziomume ike nzọpụta nke Chineke.
1. Ọ bụghị n’ihi aja ụnụ ka m ji wee na-abara ụnụ mba
Aja nsureọkụ ụnụ nọ n’ihu m oge niile
Agaghị m anabata oke ehi ọbụla nke si n’ụlọ ụnụ
mọbụ ewu ọbụla nke si n’ụlọanụ ụnụ. Azịza
2. Kedụ ikikere ụnụ nwere iji na-agụgharị iwu m
Iji na-ekwupụta maka ọgbụgbandụ m?
N’ihina ụnụ jụrụ ịnabata nkụzi m,
Ma leghara okwu m anya. Azịza
3. Ụnụ na-eme nke a, chee na m ga-agba nkịtị?
Ụnụ chere na m dịka ụnụ?
Ugbu a aga m abara ụnụ mba
Aga m eme ka o doo ụnụ anya
Onye ọbụla na-achụnyere m aja ekele na asọpụrụ m,
Ma aga m egosi nzọpụta nke Chineke
n’ebe ndị ezioumume nọ. Azịza.
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Dinwenụ meghere obi ya, ige ntị n’ihe niile Pọl na-ekwu.
Alleluia.
OZIỌMA – 2:18-22
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
N’oge ahụ, ndị na-eso ụzọ Jọn, onye na-eme mmirichukwu, na ndị na eso ụzọ ndị Farisii na-ebu ọnụ; ndị mmadụ bịara jụọ Jesu sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji ebu ọnụ ma ndị na-eso ụzọ gị anaghị ebu ọnụ?”
Jesu wee jụọ ha sị, “Ndị bịara maka oriri alụm di na nwunye, ha na-ebu ọnụ mgbe ha na onye na-alụ nwaanyị ọhụrụ nọ? Mba! ha agaghị ebu ọnụ mgbe ha na onye na-alụ nwaanyị nọ.
Ma oge na-abịa mgbe a ga-akpọpụ onye na-alụ nwaanyị ọhụrụ site n’etiti ha; mgbe ahụ, ha ga-amalite ibu ọnụ. O nweghị onye na-ewere ibiribe akwa dị ọhụrụ dụkwasa n’uwe ochie; o mee nke a ndọka jọkarịrị njọ na-apụta.
O nweghịkwa onye na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime kalama ochie; o mee otu a, mmanya ahụ ga-agbawa kalama ahụ, ha abụọ alaa n’iyi; Mba! mmanya ọhụrụ n’ime kalama ọhụrụ.
Igbo Mass Readings for January 16 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for January 15 2024, Mọnde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.