Igbo Mass Readings for February 3 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 3 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:32-40

Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaars Ndị Hibru

Olee the ọzọ m ga-ekwu? Oge ga-agwụnahụ m ikwu gbasara Gidiọn, Barak, Samsịn, Jefta, Devid na Samuel na ndịamụma. Ndị sitere n’okwukwe merie ọtụtụ alaeze, weta ikpe nkwụmọtọ, natakwa nkwa e kwere, mechiekwa ọnụ ọdụm.

Ha menyụruụ ọkụ dị egwu, gbalahụkwa mmaagha, nweta ike site n’adịghị ike. Ha bịakwara bụrụ ndị dị ike n’agha, wee chụlaa ndịagha ndị mba ọzọ. Ụmụnwaanyị ụfọdụ sitere n’okwukwe nweghachi ndị nke ha nwụrụ anwụ site na mbilite n’ọnwụ.

Ụfọdụ jụrụ ịnara ntọhapụ. Ha nọgidere n’ahụhụ ka ha wee nwee ike ibilite banye na ndụ ka mma. Ndị ọzọkwa ka e mere akaja, pịa ha ụtarị, ụfọdụ ka e kere agbụ, tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. A tụrụ ha okwute, kwọbie ha abụọ. E ji mmaagha gbuo ha.

Ha yi akpụkpọ atụrụ na ewu na agagharị, ha enweghị ihe ọbụla. A tara ha ahụhụ ma megbuokwa ha. Ha bụ ndị ụwa a na-ekwesịghị, ha na-akpagharị n’ọzara na n’elu ugwu na-ebikwa n’ọgba na n’ọnụ dị n’ime ala.

Ndị a niile anataghị ihe Chineke kwere na nkwa, n’agbanyeghị na ha gbaara ha akaebe site n’okwukwe. Etu ọ dị, Chineke akwadeberela anyị ihe kaara anyị mma ndị a gaghị eme ka ha zuo oke ma e wepụ anyị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 31:19, 20, 21, 22, 23.

Azịza: Nweenụ obi siri ike, ụnụ niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa

1. Lee ka ịdịmma gị siri dị ukwuu, O Osebụrụwa

nke i dobeere ndị niile na-atụ gị egwu,

na-enye ndị niile gbabara na gị

ka ụwa niile wee jiri anya ha hụ.

Azịza: Nweenụ obi siri ike, ụnụ niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa

2. N’ihu gị ka ị na-ezobe ha

ka atụmaatụ ndị ajọomume ghara imetụ ha;

na ndo nke gị ka ịna-ezobe ha

ka ọnụ ọjọọ ghara imetụ ha.

Azịza: Nweenụ obi siri ike, ụnụ niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa

3. Ngọzi dịrị Osebụrụwa,

onye ji ịhụnaanya arụrụ m ọrụ dị ịtụnaanya

n’obodo e wusiri ike.

Azịza: Nweenụ obi siri ike, ụnụ niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa

4. Nke a mere m ji tie mkpu sị,

“Esila n’ihu gị chụpụ m

Mana nụrụ arịrịọ m niile,

mgbe m tikuru gị mkpu enyemaka.

Azịza: Nweenụ obi siri ike, ụnụ niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa

5. Ụnụ ndị kwụsiri ike, hụnụ Osebụrụwa n’anya,

Chineke na-echekwaba ndị kwere na ya,

mana Ọ na-akwụ ndị ngala ụgwọ ka ọrụ ha si dị.

Azịza: Nweenụ obi siri ike, ụnụ niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa

MBEKU – 2 Cor 5:19

Alleluia, Alleluia:

Chineke sitere na Kristi mee ka anyị na ya dị n’otu ọzọ, O tinyela n’aka anyị ozi banyere ụzọ O si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ.

Alleluia.                              

OZIỌMA – 5:1-20

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Jesu na ndị na-eso ụzọ ya bịaruru n’akụkụ nke ọzọ nke osimiri Galili, n’ala ndị Gerasenes. Ma mgbe Jesu siri n’ụgbọ pụta, otu nwoke ndị mmụọ ọjọọ ji siri n’ebe a na-eli ozu wee bịakwute ya.

Nwoke a weere ebe a na-eli ozu dịka ebe obibi ya. O nweghị onye ọbụla nwere ike, ike ya agbụ, ọ bụladị ma e jiri ịga; n’ihina ọtụtụ mgbe ka e werelarịị ịga nta na ịga ukwuu kee ya, ma ọ nyajipụchara ịga ukwu niile ahụ, gbajisịkwaa ndị ntakịrị.

O nweghịkwa onye ọbụla nwere ike ijideli ya Abalị na ehihie niile ọ na-anọ n’elu ugwu na-eti mkpu, werekwa nkume na-achakasị onwe ya ahụ. Ma mgbe ọ nọ n’oteaka hụ Jesu, ọ gbakwuuru ya, sekpuoro ya, jiri olu ike tie mkpu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ Jesu, Nwa Chineke kacha dị elu?

Eji m aha Chineke na-agwa gị ka ị ghara ịta m ahụhụ.” Nwoke ahụ kwuru otu a n’ihina Jesu sịrị ya, “Si n’ime ya pụta, gị mmụọ ọjọọ! Jesu jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?” Nwoke ahụ zara sị, “Aha m bụ ‘Ọtụtụ’, n’ihina anyị dị ọtụtụ” Ma ọ rịọsikwara Jesu ike ka ọ ghara ịchụpụ ha n’ala ahụ.

Oke igwe ezi nọ nso n’ugwu ahụ na-akpa nri; ma ndị mmụọ ọjọọ ahụ rịọrọ Jesu sị, “Ziga anyị n’igwe ezi ndị a ka anyị banye n’ime ha.” Jesu nyere iwu, ndị mmụọ ọjọọ ahụ wee pụọ, banye n’ime igwe ezi ahụ nke dịka puku abụọ.

Ha siri n’ebe dị mkpọda jiri ọsọ gbaba n’ime oke osimiri ahụ: mmiri wee gbagbuo ha. Ndị na-elekọta ezi ahụ gbalagara, kọsaa ihe merenụ n’ime obodo na n’ala ahụ niile. Ọtụtụ mmadụ bịara ka ha were anya ha hụ ihe ahụ merenụ.

Ha bịakwutere Jesu, hụ nwoke ahụ ndị mmụọ ọjọọ nọbu n’ime ya, ebe ọ nọdụrụ ala, yiri uwe, uche ya ezukwaa oke; ụjọ wee tụọ ha. Ndị hụrụ ya kọsara otu e si gwọọ nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ji na ihe mere igwe ezi ahụ. Ha malitere ịrịọ Jesu ka ọ pụọ n’oke ala ha.

Ma mgbe Jesu na-achọ ịbanye n’ụgbọmmiri, nwoke ahụ ndị mmụọ ọjọọ jibu rịọrọ ka o sobe ya. Ma Jesu jụrụajụ, sị nwoke ahụ, “Lakwuru ndị enyi gị, kọọrọ ha ihe niile Chineke meere gị, na otu o si meere gị ebere.” Ọ pụrụ, gaa mpaghara Dekapọlis na-ekwusa ihe niile mere ya. Nke a gbagwojuru ndị mmadụ niile anya.

Igbo Mass Readings for February 4 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for February 3 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.