Igbo Mass Readings for May 13 2024, Mọnde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 13 2024, Mọnde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 19:1-8

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

N’oge ahụ Apọlọs nọ na Kọrịnt, Pọl siri elu ala bịaruo Efesus. Ọ hụrụ ụfọdụ mmadụ ndị na-eso ụzọ Jesu. Ọ jụọ ha sị, “Ụnụ natara Mmụọ Nsọ mgbe ụnụ kwenyere?” Ha zara sị: “Mba!

Ọ bụrụ na o nwere ihe a na-akpọ Mmụọ Nsọ anyị anụbeghị.” Ọ jụrụ ha sị: “Olee ụdị mmirichukwu nke e mere ụnụ?” Ha zara ya sị “mmirichukwu nke Jọn.”

Pọl sịrị ha: “Mmirichukwu Jọn bụ nke chọrọ n’aka mmadụ naanị nchegharị, na-agwakwa ndị mmadụ ka ha kwere n’onye ahụ nke na-esote ya, bụ Jesu.”

Mgbe ha nụrụ nke a, e mere ha mmirichukwu n’aha nke Onyenweanyị Jesu. Mgbe Pọl bikwasara ha aka n’isi, Mmụọ Nsọ dakwasara ha. Ha kwuru okwu n’olu dị iche- iche, bukwaa amụma.

Ha niile dị mmadụ iri na abụọ. Pọl banyere n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Ọ nọrọ n’Efesus ọnwa atọ, na-agwa ndị mmadụ okwu Chineke n’atụghị egwu. O weere ịrụ ụka na arịrịọ na-agwa ndị mmadụ okwu maka ala eze Chineke.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 68:2-3,4-5, 6-7.

Azịza: Bụọrọnụ Chineke abụ, ụnụ alaeze nke ụwa.

1. Ka Chineke bilie, ka ndị iro ya gbasasịa,

ka ndị niile kpọrọ ya asị gbapụ n’ihu ya

ị na-achụsa ha dịka anwụrụ ọkụ, dịka mgba si agbaze n’ọkụ Azịza

2. Mana oge Chineke na-abịa nso,

ndị eziomume na-añụrị ọñụ,

ha na-añụrị oke ọñụ na-ekwekwa ukwe añụrị.

Bụọrọ Onyenweanyị abụ, kụọrọ ya egwu,

ñụrịa na Yahweh, nwee oke ọñụ n’ọbịbịa ya! Azịza

3. Nna ndị na enweghị nne na nna,

onye ogbugbo ndị ajadụ,

otu ahụ ka Chineke si dị n’ebe obibi ya dị nsọ

Chineke na-enye ndị ajụrụ ajụ ebe obibi,

ọ na-enye ndị nọ na mkpọrọ añụrị

site na-ime ka ha nwere onwe ha. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Gaanụ, meenụ ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, a nọnyere m ụnụ oge niile ruo na-njedebe nke oge.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 16:29-33.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Ndị na-eso ụzọ Jesu sịrị ya, “Lee, ugbu a ị na-ekwukwa okwu n’ụzọ dọrọ anya. Ị naghịkwa agwa anyị okwu n’ilu! Ugbu a anyị amatala na ị mazuru ihe niile, na ọ dịghị mkpa ka onye ọbụla jụọ gị ajụjụ.

Nke a ka anyị ji kwere na i si n’ebe Chineke nọ pụta,” Jesu zara ha sị: “Ụnụ ekwerela ugbu a? Oge ahụ na-abịa, n’eziokwu, ọ bịala mgbe ụnụ nile ga-agbasacha, onye ọbụla n’ụlọ ya, ma hapụ naanị m.

N’agbanyeghị nke a, ọ bụghị naanị m nọ, mụ na Nna m nọ. Agwala m ụnụ ihe ndị a, ka ụnụ wee nwee udo n’ime m. N’ụwa ụnụ ga-enwe mkpagbu. Ma nweenụ añụrị, mụ onwe m emeriela ụwa!”

Igbo Mass readings for May 14 2024, Emume Ncheta Matịas dị Asọ – Apọstụl

Igbo Mass Readings for May 13 2024, Mọnde Izuụka nke Asaa n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Last Update: April 15, 2022