Igbo Mass Readings for February 24 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 24 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Sịrak

Amamihe niile si na Yahweh abịa, amamihe bụkwa nke ya ebighịebi. Aja mmiri nke osimiri, mmiri ozuzo, ụbọchị na-enweghị mbido na njedebe, onye pụrụ ịgụ ha ọnụ?

Ka eluigwe si dị elu, ka ụwa si dị obosara, ka osimiri si mie emi, ọ bụladị amamihe onye nwere ike ịchọpụtacha omimi ihe ndị a?

E keelarị amamihe tupu ihe ndịọzọ niile, mkpachapụ anya na nghọta dịkwarịrịị adị bido na gboo. Isi amamihe bụ okwu Chineke nọ n’eluigwe.

Ụzọ ya niile bụ iwu nke dị ebighịebi. Mgbọrọgwụ amaihe – onye ka o gosiri ya? Ịtụ nkọ ya niile na usoro o si eme ihe onye machaara ha? Onye ka e gosirila ọnụmara nke amamihe?

Onye ghọtarala ụzọ ya niile. Ọ dị sọ otu onye bụ onye maara ihe bụkwa onye e kwesịrị ịtụ oke egwu, onye nọ n’ocheeze ya.

Yahweh n’onwe ya kere amamihe, Ọ hụrụ ya ma ghọta otu o si dị mkpa, O were wụsa ya n’elu ọrụ aka ya niile. O nyere onye ọbụla onyinye amamihe ya, ma ndị hụrụ ya n’anya ka O nyere ya n’uju.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.: 93:1, 1-2, 5.

Azịza: Onyenweanyị bụ eze, o yi ebube dịka uwe.

1. Onyenweanyị bụ eze, o yi ebube dịka uwe;

kere ike n’ukwu ka ajị.

Azịza: Onyenweanyị bụ eze, o yi ebube dịka uwe.

2. O mere ka ụwa kwụrụ chịm;

nke a na-enweghị ike ịkwagharị ya

Ocheeze gị dị bido na mgbe ochie,

Ị dịrịị tupu e kee ụwa.

Azịza: Onyenweanyị bụ eze, o yi ebube dịka uwe.

3. Iwu gị niile kwụịrị ike,

ebe obibi gị dị nsọ ebeebe, O Onyenweanyị.

Azịza: Onyenweanyị bụ eze, o yi ebube dịka uwe.

MBEKU – Ps. 119:135

Alleluia, Alleluia:

Mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị, ma kuziere m ime uche gị.

Alleluia.                            

OZIỌMA – 9:14-29

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Jesu na Pita, Jemis na Jọn si n’elu ugwu ahụ dị elu na-arịdata. Mgbe ha ruru ebe ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ nọ, ha hụrụ oke igwe mmadụ gbara ha gburugburu, hụkwa ndị odeakwụkwọ ka ha na ha na-arụrịta ụka.

Ozigbo igwe mmadụ ahụ hụrụ Jesu, ọ tụrụ ha n’anya nke ukwuu, ha gbakwutere ya kelee ya. Jesu jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị ka ụnụ na ha na-ekwu?”. Otu onye n’ime igwe mmadụ ahụ zara ya sị, “Onyenkuzi, akpọtaara m gị nwa m nwoke n’ihina o nwere mmụọ ọjọọ nke na-eme ka ọ ghara ikwu okwu.

Mgbe ọbụla o jidere ya, ọ na-atụ ya n’ala, ọ na-agbọ ụfụfụ n’ọnụ ya, na-ata ikikere eze, ahụ ya niile ekwee bibiriri ka ụta. Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike”.

Jesu zara ha sị, “Ụnụ ọgbọ na-enweghị okwukwe! Ruo ole mgbe ka mụ na ụnụ ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-edi omume ụnụ? Kpoọtara m nwatakịrị ahụ” Ha kpọtaara ya nwatakịrị nwoke ahụ.

Ozigbo mmụọ ọjọọ dị n’ime nwata ahụ hụrụ Jesu, mmụọ ahụ sesiri ya ike; nwatakịrị ahụ adaa n’ala, na-atụrụ-gharị, na-asụ ụfụfụ n’ọnụ. Jesu ajụọ nna nwatakịrị ahụ sị, “Olee mgbe ihe a malitere isogbu ya?”

Ọ zaa sị, “Site na mgbe ọ bụ nwata. Ọtụtụ mgbe ka ọ na-atụba ya n’ọkụ, na n’ime mmiri, ka o wee la ya n’iyi. Ma ọ bụrụ na i nwere ike ime ihe ọbụla, biko, mee ebere, nyere anyị aka”.

Jesu sịrị ya, “Ọ bụrụ na i kwere, ihe niile pụrụ ime n’ebe onye kwere ekwe nọ”. N’atụfughị oge nna nwata ahụ tiri mkpu sị, “Ekwere m, nyere m aka merie ekwesịghị ike m”.

Mgbe Jesu hụrụ na igwe mmadụ ahụ na-agbakọba, na-achọ inugide ya, ọ baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, sị ya, “Gị mmụọ dara ogbi na nke ntị chiri, mụ onwe m na-enye gị iwu, si n’ime ya pụọ, abanyekwala n’ime ya ọzọ”.

Ka mmụọ ọjọọ ahụ tichara mkpu, ma sesie nwatakịrị ahụ oke ike, o siri n’ime ya pụọ. Nwatakịrị ahụ tọgbọọrọ dịka ozu, nke mere na ọtụtụ ndị mmadụ n’etiti ọgbakọ ahụ sịrị, “Ọ nwụọla!”

Jesu jidere nwatakịrị ahụ aka, selite ya elu; o wee bilie. Mgbe Jesu banyechara n’ụlọ, ndị na eso ụzọ ya jụrụ ya na-nzuzo sị, “Gịnị mere anyị onwe anyị enweghị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?”

Jesu zara ha sị, “Ụdị ajọ mmụọ a abụghị nke a na-achụpụ n’ụzọ ọbụla ma ọ bụghị site n’ekpere na ibu ọnụ”.

Igbo Mass Readings for February 25 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for February 24 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.