Igbo Mass Readings for May 20 2024, Mọnde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 20 2024, Mọnde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:13-18
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọozi Jemis
Onye bụ onye ma ihe na onye nwere nghọta n’etiti ụnụ? Ya site na ndụ ọma ya gosị ọrụ ya niile, n’ime ịdị nwayọọ nke amamihe na-eweta.
Ma ọ bụrụ na ajọ ekworo na oke ọchịchọ nke onwe juru n’obi ụnụ, ụnụ anyala isi, ụnụ ekwukwala okwu ụgha megide eziokwu ahụ. Amamihe dị otu a esighị n’eluigwe bịa.
Kama ọ bụ nke ụwa, bụrụkwa nke anụ ahụ na-achị na nke ndị mmụụ ọjọọ na-akuzi. N’ihina ebe ekworo na oke ọchịchọ nke onwe dị n’ebe ahụ ka ọgbaaghara na ajọomume niile na-adịkwa.
Ma amamihe nke si n’eluigwe bịa bụ nke dị ọcha, O jupụtakwara n’udo, obiọma na ịdị nwayọọ. Ọ na-atụle okwu nke ọma. O jupụtara n’ebere na-amịpụtakwa ezi mkpụrụ.
Amamihe nke a anaghị eme mmadụ obi abụọ. O nweghịkwa ihu abụọ. Ịdị mma na ezi ọrụ ka ndị na-eme udo na-ewepụta dịka mkpụrụ ha ji anya udo kụọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 19:7,8,9,14
Azịza: Iwu nke Onyenweanyị na-enye obi añụrị
1. Iwu nke Onyenweanyị zuru oke
Ọ na-enye mkpụrụobi ndụ ọhụrụ;
Atụmaatụ Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasịobi
Ọ na-enye ndị dị umeala amamihe. Azịza
2. Iwu nke Onyenweanyị kwụ ọtọ
Ọ na-enye obi anụrị;
lwu nke Onyenweanyị pụtara ihe;
Ọ bụ ihe e ji ahụ ụzọ. Azịza
3. Ịtụ egwu Onyenweanyị bụ ihe dị mma
ọ na-adị ebeebe;
Ikpe nke Onyenweanyị bụ eziokwu;
Ha niile kwụkwa ọtọ. Azịza
4. Mee ka okwu niile si m n’ọnụ apụta oge niile,
na echiche obi m niile dị mma n’ihu gị,
Onyenweanyị, nkume m, na onye nzọpụta m. Azịza
MBEKU – Ps. 119:135
Alleluia, Alleluia:
Mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị, ma kuziere m ime uche gị.
Alleluia.
OZIỌMA – 9:14-29
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu na Pita, Jemis na Jọn si n’elu ugwu ahụ dị elu na-arịdata. Mgbe ha ruru ebe ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ nọ, ha hụrụ oke igwe mmadụ gbara ha gburugburu, hụkwa ndị odeakwụkwọ ka ha na ha na-arụrịta ụka.
Ozigbo igwe mmadụ ahụ hụrụ Jesu, ọ tụrụ ha n’anya nke ukwuu, ha gbakwutere ya kelee ya. Jesu jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị ka ụnụ na ha na-ekwu?”.
Otu onye n’ime igwe mmadụ ahụ zara ya sị, “Onyenkuzi, akpọtaara m gị nwa m nwoke n’ihina o nwere mmụọ ọjọọ nke na-eme ka ọ ghara ikwu okwu. Mgbe ọbụla o jidere ya, ọ na-atụ ya n’ala, ọ na-agbọ ụfụfụ n’ọnụ ya, na-ata ikikere eze, ahụ ya niile ekwee bibiriri ka ụta.
Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike”. Jesu zara ha sị, “Ụnụ ọgbọ na-enweghị okwukwe! Ruo ole mgbe ka mụ na ụnụ ga-anọ?
Ruo ole mgbe ka m ga-edi omume ụnụ? Kpoọtara m nwatakịrị ahụ” Ha kpọtaara ya nwatakịrị nwoke ahụ. Ozigbo mmụọ ọjọọ dị n’ime nwata ahụ hụrụ Jesu, mmụọ ahụ sesiri ya ike; nwatakịrị ahụ adaa n’ala, na-atụrụ-gharị, na-asụ ụfụfụ n’ọnụ.
Jesu ajụọ nna nwatakịrị ahụ sị, “Olee mgbe ihe a malitere isogbu ya?” Ọ zaa sị, “Site na mgbe ọ bụ nwata. Ọtụtụ mgbe ka ọ na-atụba ya n’ọkụ, na n’ime mmiri, ka o wee la ya n’iyi.
Ma ọ bụrụ na i nwere ike ime ihe ọbụla, biko, mee ebere, nyere anyị aka”. Jesu sịrị ya, “Ọ bụrụ na i kwere, ihe niile pụrụ ime n’ebe onye kwere ekwe nọ”.
N’atụfughị oge nna nwata ahụ tiri mkpu sị, “Ekwere m, nyere m aka merie ekwesịghị ike m”. Mgbe Jesu hụrụ na igwe mmadụ ahụ na-agbakọba, na-achọ inugide ya, ọ baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, sị ya, “Gị mmụọ dara ogbi na nke ntị chiri, mụ onwe m na-enye gị iwu, si n’ime ya pụọ, abanyekwala n’ime ya ọzọ”.
Ka mmụọ ọjọọ ahụ tichara mkpu, ma sesie nwatakịrị ahụ oke ike, o siri n’ime ya pụọ. Nwatakịrị ahụ tọgbọọrọ dịka ozu, nke mere na ọtụtụ ndị mmadụ n’etiti ọgbakọ ahụ sịrị, “Ọ nwụọla!”
Jesu jidere nwatakịrị ahụ aka, selite ya elu; o wee bilie. Mgbe Jesu banyechara n’ụlọ, ndị na eso ụzọ ya jụrụ ya na-nzuzo sị, “Gịnị mere anyị onwe anyị enweghị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?”
Jesu zara ha sị, “Ụdị ajọ mmụọ a abụghị nke a na-achụpụ n’ụzọ ọbụla ma ọ bụghị site n’ekpere na ibu ọnụ”.
Igbo Mass Readings for May 21 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for May 20 2024, Mọnde Izuụka nke Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.