Connect with us

Igbo Mass Readings

Igbo Mass Readings for January 23 2023, Mọnde Izuụka nke Atọ N’Oge Nkịtị

Published

on

Igbo Mass Readings for January 23 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 23 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:15, 24-28

Ihe Ọgụgụ Ewetara N’akwụkwọozi E Degaara Ndị Hibru

Kristi bụ onye ogbugbo nke ọgbụgbandụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ nwee ike ịnata ihe nrite ebeebe ahụ e kwere na nkwa, ebe ọ bụ na otu onye nwụrụ iji gbapụta ha na njọ n’okpuru ọgbụgbandụ nke mbụ. Kristi n’onwe ya abanyeghị n’ebensọ e ji aka mee, nke bụ naanị ihe atụ nke ezigbo ihe nsọ ahụ.

Kama ọ banyere n’eluigwe n’onwe ya ebe ọ nọ ugbu a n’ihu Chineke n’ihi anyị. Kristi anaghị eji onwe ya achụ aja mgbe niile dịka onyeisi nchụaja si eji ọbara na-abụghị nke ya aba ebe dị nsọ ahụ afọ ọbụla.

Advertisement

A sị na ọ dị otu ahụ, Kristi gaara na-ata ahụhụ ugboro ugboro kamgbe ụwa bidoro. Ma otu ọ dị, ọ pụtara naanị otu ugboro na ngwụcha oge, were onwe ya chụọ aja iji wepụ njọ.

Otu ọ bụ na e meela ya na mmadụ ga-anwụ otu ugboro, nke a gachaa ọ bụrụ ikpe; N’otu aka ahụ, Kristi jiri onwe ya chụọ aja naanị otu ugboro iji buru njọ ọtụtụ ndị mmadụ.

Ọ ga-abịa nke ugboro abụọ, ọ bụghị ịlụso njọ ọgụ, kama ọ bụ iji zọpụta ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-eche ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 98:1, 2-3, 3-4, 5-6

Azịza: Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ, n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube.

Advertisement

1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,

n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube,

aka nri ya na aka ya dị nsọ eweterela ya mmeri. Azịza

2. Onyenweanyị egosịla ike nzọpụta ya,

Advertisement

o meela ka mba niile mata eziomume ya.

O chetala ịhụnaanya ya na ịkwụdosiike ya n’ebe ezinụụlọ Izrel nọ. Azịza

3. Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị

Ụwa niile tijerenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ.

Advertisement

Werenụ ukwe na mkpu ọñụ too ya. Azịza

4. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe

Werenụ ụbọ akwara na ihe egwu dị icheiche

tiere Onyenweanyị egwu

Advertisement

Werenụ opi igwe na mpi kwupụta na Onyenweanyị bụ eze. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Were eziokwu gị doo ha nsọ, n’ihina okwa gị bụ eziokwu.

Alleluia.

Advertisement

OZIỌMA – 3:22-30

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.

Ndị odeakwụkwọ si na Jerusalem gbadata na-ekwukwa sị, “Mụọ Belzebul ejidele ya, ọ bụkwa n’ike mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ ndị ajọmmụọ”. N’ihi nke a Jesu kpọrọ ha, tụọrọ ha ilu ndị a sị, “Olee otu ekwensu ga-esi achụpụ ekwensu?”. Alaeze ọbụla kewara ekewa iji megide onwe ya agaghị eguzo.

Ezinụụlọ ọbụla kewara ekewa iji megide onwe ya agaghị eguzokwa. Ọ bụrụkwa na ekwensu ebilie megide onwe ya, ọ gaghị eguzo; kama isi njedebe ya abịala nso.

O nweghị onye nwere ike ịbanye n’ụlọ dike zuo ihe o ji biri, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ kee ya agbụ; mgbe o mere nke a ka ọ ga-enwe ike zuo ihe dị n’ụlọ ya.

Advertisement

N’ezie agwa m ụnụ, a ga-agbaghara ụmụ mmadụ mmehie ha niile na nkwulụ ha ọbụla; ma onye ọbụla kwulụrụ Mmụọ Nso agaghị enweta mgbaghara, kama ọ nọ n’ikpe ọmụma nke njọ, ebeebe”. O kwuru nke a n’ihina ụfọdụ n’ime ha sịrị, “O nwere mmụọ ọjọọ n’ime ya”.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for January 23 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Catholic Lector is the founder of Catholiclectionary.com. I am a Theologian, a commissioned Lector, and Liturgy Minister. I lead the team that operates Catholiclectionary.com which is a Catholic Church-related website that provides you, on daily basis, with the following: (a) Catholic Daily Mass Readings (b) Reflections on the Daily Mass Readings (c) Daily Prayers (d) Catholic Hymns, and (e) Saints of the Day. I and my team work for the collective growth in spiritual lives of all the faithful.

Advertisement

Get Daily Mass Readings through Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.