Igbo Mass Readings for January 22 2024, Mọnde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for January 22 2024, Mọnde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:1-7, 10
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ abụọ nke Samuel
Agbụrụ Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, sị ya, “Anyị na gị bụ otu ọbara. Na mgbe gara aga, mgbe Sọl bụ eze anyị, ọ bụ gị na-edu ndị Izrel eje agha. Yahweh kwekwara gị nkwa na ị ga-abụ eze na onyendu ndị nke ya Izrel.”
Ndị okenye Izrel niile wee bịakwute Devid na Hebrọn, ha na ya gbaa ndụ n’ebe ahụ n’ihu Yahweh. Ha wee tee Devid mmanụ ịbụ eze ha.” Devid gbara iri afọ atọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịkwara Izrel iri afọ anọ. Na Hebrọn, Devid chịrị Juda afọ asaa na ọnwa isi.
Ọ sikwara na Jerusalem chịa Izrel niile na Juda iri afọ atọ na atọ. N’oge ahụ, Devid na ndịagha ya jere Jerusalem ibuso ndị Jebus, ndị bi n’obodo ahụ agha. Ndị Jebus chere na Devid agaghị emerili ha. Ya mere, ha sịrị ya, “Ị gaghị abatalị n’ebe a.
Ọbụladị ndị isi na ndị ngwụrọ bi n’obodo a ga-egbochi gị.” Ma Devid meriri ha, nara ha ebe e wusiri ike nke Zayọn. O wee bụrụzie “Obodo Devid”.
Devid dịwanyere ukwu, na-aga n’ihu, n’ihina Yahweh, bụ Chineke nke igwe ndịagha nọnyere ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 89:20, 21-22, 25-26
Azịza: Ịhụnaanya m na ịkwụdosiike m ga-anọnyere ya oge niile.
1. N’otu oge ị gwara ndị nke gị okwu n’ọhụ sị:
“Ekpuwela m otu onye dị ike n’agha okpueze
Ebuliela m ọkwa onye ahụ m họtara.” Azịza
2. Ahọrọlam nwodibo m bụ Devid
Eteelam ya mmanụ ka ọ bụrụ eze
Aga m anọnyere ya oge niile,
Enyemaka m ga-abụ ike ya. Azịza
3. Ịhụnaanya m na ịkwụdosike m ga-anọnyere ya oge niile,
Aga m enye ya mmeri oge niile n’ihi aha m
Alaeze ya ga-abawanye ruo osimiri. Azịza
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Were eziokwu gị doo ha nsọ, n’ihina okwa gị bụ eziokwu.
Alleluia.
OZIỌMA – 3:22-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Ndị odeakwụkwọ si na Jerusalem gbadata na-ekwukwa sị, “Mụọ Belzebul ejidele ya, ọ bụkwa n’ike mmụọ ọjọọ ka o ji achụpụ ndị ajọmmụọ”. N’ihi nke a Jesu kpọrọ ha, tụọrọ ha ilu ndị a sị, “Olee otu ekwensu ga-esi achụpụ ekwensu?”.
Alaeze ọbụla kewara ekewa iji megide onwe ya agaghị eguzo. Ezinụụlọ ọbụla kewara ekewa iji megide onwe ya agaghị eguzokwa. Ọ bụrụkwa na ekwensu ebilie megide onwe ya, ọ gaghị eguzo; kama isi njedebe ya abịala nso.
O nweghị onye nwere ike ịbanye n’ụlọ dike zuo ihe o ji biri, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ kee ya agbụ; mgbe o mere nke a ka ọ ga-enwe ike zuo ihe dị n’ụlọ ya.
N’ezie agwa m ụnụ, a ga-agbaghara ụmụ mmadụ mmehie ha niile na nkwulụ ha ọbụla; ma onye ọbụla kwulụrụ Mmụọ Nso agaghị enweta mgbaghara, kama ọ nọ n’ikpe ọmụma nke njọ, ebeebe”.
O kwuru nke a n’ihina ụfọdụ n’ime ha sịrị, “O nwere mmụọ ọjọọ n’ime ya”.
Igbo Mass Readings for January 23 2024, Tuzde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for January 22 2024, Mọnde n’ime Izuụka nke Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.