Igbo Mass Readings for August 31 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 31 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-5

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Mbụ Pọl degaara Ndị Kọrịnt

Mgbe m bịakwutere ụnụ na mbụ, ụmụnna m, ejighị m oke okwu mọbụ oke mmụta gwa ụnụ ihe omimi niile nke okwu Chineke.

Kama, amamihe m gosiri na mụ nwere bụ banyere Jesu Kristi Onye ahụ a kpọgburu n’obe. Abịakwutere m ụnụ n’adịghị ike na oke egwu na ịma jijiji.

Nkuzi na ozi m zisara abịaghịkwa dịka okwu ire ụtọ na nke oke mmụta, ime ka ndị mmadụ kwere, kama ha bịara n’ụzọ igosi ọrụ nke Mmụọ Nsọ na nke ike Chineke; Ka okwukwe ụnụ ghara ịdabere n’amamihe nke mmadụ kama n’ike nke Chineke.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119:97, 98, 99, 100, 101, 102

Azịza: Onyenweanyị! Lee ka m siri hụ iwu gị n’anya nke ukwuu.

1. O! lee ka m siri hụ iwu gị n’anya nke ukwuu!

Ana m achịgharị ya n’obi m ụbọchị niile.

Azịza: Onyenweanyị! Lee ka m siri hụ iwu gị n’anya nke ukwuu.

2. Iwu gị mere ka m mara ihe karịa ndịiro m,

N’ihina ọ nọnyeere m mgbe niile.

Azịza: Onyenweanyị! Lee ka m siri hụ iwu gị n’anya nke ukwuu.

3. Enwere m nghọta karịa ndị nkuzi m

n’ihina ana m atụgharị uche n’iwu gị.

Azịza: Onyenweanyị! Lee ka m siri hụ iwu gị n’anya nke ukwuu.

4. Enwere m nghọta karịa ndị okenye,

n’ihina ana m edobe iwu gị.

Azịza: Onyenweanyị! Lee ka m siri hụ iwu gị n’anya nke ukwuu.

5. Esepụla m ụkwụ n’ụzọ ọjọọ niile,

ka m wee nwee ike idobe okwu gị.

Azịza: Onyenweanyị! Lee ka m siri hụ iwu gị n’anya nke ukwuu.

6. Anaghị m agbakụta iwu gị azụ,

n’ihina gị onwe gị kuziere m ya!

Azịza: Onyenweanyị! Lee ka m siri hụ iwu gị n’anya nke ukwuu.

MBEKU – 2 Kọr 5:19

Alleluia, Alleluia:

Chineke sitere na Kristi na-eme ka ya na ụwa dị na mma; o tinyela n’aka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ.

Alleluia

OZIỌMA – 4:16-30

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu bịaruru Nazaret ebe ọ nọrọ too; banye n’ụlọnzukọ, n’ụbọchị izuike dịka o si eme. O wee bilie igụ ihe; ha nyere ya akwụkwọ Aịzaya onye amụma.

O meghere akwụkwọ hụ ebe e dere sị, “E nyela m Mmụọ nke Dinwenụ, makana Dinwenụ eteela m ude ka mụ bugara ndị ogbenye oziọma, ka m kwusaara ndị e ji eji na ha enwerela onwe ha, ka m kwusaara ndị kpuru isi na ha ahụbala ụzọ, ka m mee ka ndị a na emegbu emegbu nwere onwe ha.

Ka m kwupụta afọ amara nke Dinwenụ.” O kpuchiri akwụkwọ ahụ, nyeghachi ya onye na-aga ozi, bịa nọdụ ala. Mmadụ niile nọ n’ụlọnzukọ lekwasịrị ya anya.

Ọ malite ịgwa ha okwu sị, “Taa, ka e mezuru na ntị ụnụ ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ a.” Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya.

Okwu ebube niile si n’ọnụ ya pụta tụkwara ha n’anya nke mere ha jiri jụọ sị, “Onye a, ọ bụghị nwa Josef?” Ma Jesu sịrị ha, “Ama m na ụnụ ga-atụrụ m ilu a: Dịbịa gwọọ onwe gị; ụnụ ga-asịkwa m, Mee ka anyị hụ n’obodo a mụrụ gị ụdị ihe ahụ anyị nụrụ na I mere na Kapanaum.

N’ezie agwa m ụnụ, a naghị anabata onye amụma ọbụla n’obodo a mụrụ ya. E nwere ọtụtụ ụmụnwaanyị isimkpe n’lzrel n’oge Elaịja, mgbe e mechiri eluigwe, mmiri ezoghịkwa afọ atọ na ọnwa isii, mgbe oke ụganị dara n’ala ahụ niile; ma o nweghị onye n’ime ha e zigaara Elaija ma ọ bụghị naanị otu nwaanyị ajadu nke bi n’obodo Zarefat nke dị n’ala Saịdọn.

Ọtụtụ ndị ekpenta nọkwa n’ala Izrel n’oge Elisha; ma o nweghị onye ọbụla n’ime ha e mere ka ọ dị ọcha ma ọ bụghị Neeman Onye Siria.” Mgbe ndị niile nọ n’ụlọnzukọ ahụ nụrụ okwu ndị a, iwe jupụtara ha n’obi.

Ha biliri kwapụ ya n’obodo ha, kpụrụ ya ruo n’otu ugwu nta a rụkwasara obodo ha n’elu ya, ka ha si ebe ahụ kwada ya. Ma ọ mịchapụrụ onwe ya n’aka ha si n’etiti igwe mmadụ ahụ laa.

Igbo Mass Readings for September 1 2026, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for August 31 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.