Igbo Mass Readings for September 16 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 16 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:17-26, 33
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt
Na nkuzi ndị a, anaghị m eto omume ụnụ. N’ihina mgbe ụnụ na ezukọ, ụnụ anaghị eme ka ụnụ dị mma karịa, kama ka ụnụ dị njọ karịa.
Nke mbụ, anụrụ m na mgbe ọbụla ụnụ zukọrọ dịka nzukọ Kristi, na nkewa dị icheiche na-adapụta n’etiti ụnụ. Ekwenyere m nwa ntịntị na ọ bụ eziokwu.
N’ihina nkewa otu dị icheiche aghaghị ịdị n’etiti ụnụ ka e wee mata ndị bụ ezigbo ndị otu Kristi n’etiti ụnụ. Mgbe ụnụ na-ezukọ n’otu ebe, ọ bụghị nri anyasị nke Onyenweanyị ka ụnụ na-eri.
N’ihina mgbe ụnụ nọ na-eri, onye ọbụla na-eburu ndịọzọ ụzọ richapụ ihe oriri nke o wetara, nke mere na ụfọdụ na-anọdụ n’agụụ, ebe ndiọzọ na añụbiga mmanya oke.
Gịnị kpatara nke a? Ọ bụ na ụnụ enweghị ụlọ ebe ụnụ ga-anọ rijuo afọ, ñụjukwaa afọ? Gịnị ka m ga-agwa ụnụ? Aga m eto ụnụ na nke a?
Mba! Agaghị m eto ụnụ maka nke a! N’ihina anatara m n’aka Onyenweanyị nkuzi ahụ nke m nyekwara ụnụ n’aka idobe;
Na Dinwenụ Jesu, n’abalị ahụ a raara ya nye n’aka ndịiro ya weere achịcha, mgbe O nyechara Chineke ekele, Ọ nyawaa ya sị, “Nke a bụ ahụ m nke a na-enye maka ụnụ, na-emenụ nke a na ncheta nke m.”
N’otu aka ahụ, mgbe ha richara nri anyasị, o buuru iko mmanya sị, “Nke a bụ iko nke ọgbụgbandụ ọhụrụ nke ọbara m, oge ọbụla ụnụ na añụ ya na-emenụ nke a na ncheta nke m.”
N’ihina mgbe ọbụla ụnụ na-eri achịcha ahụ na-añụkwa iko nke a ụnụ na-ekwusa ọnwụ Onyenweanyị ruo mgbe ọ ga-abịa ọzọ. Ya bụ ụmụnna m, mgbe ụnụ zukọrọ iri nri nke Dinwenụ cherenụ ibe ụnụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 40:7-8, 8-9, 10, 17
Azịza: Na-ekwusanụ ọnwụ Onyenweanyị ruo mgbe ọ ga-abịa ọzọ
1. Ị naghị achọ ịchụ aja mọbụ ihe nrunye
Kama ntị ghe oghe
Ị naghị achọ aja nsureọkụ mọbụ aja maka njọ
Kama ekwuru m sị, Anọ m ebe a ana m abịa. Azịza
2. N’ime akwụkwọ iwu e dere na m tosịrị ime uche gị
Chineke m ahụrụ iwu gị n’anya
Eji m obi m niile hụ ya n’anya. Azịza
3. Ekwupụtala m eziomume nke Onyenweanyị na nnukwu ọgbakọ
Lee emechighị m ọnụ m, ị maara nke a O Onyenweanyị. Azịza
4. Ka ha jupụta na-añụrị bụ ndị niile na-achọ gị.
Ka ha na-ekwu oge niile sị,
Onyenweanyị dị ukwuu! Azịza
MBEKU – Ps. 147:2, 15
Alleluia, Alleluia:
Jerusalem too Onyenweanyị; Ọ na-ezisara ụwa niile okwu ya.
Alleluia
OZIỌMA – 7:1-10
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ka Jesu gwachara ndị mmadụ okwu. Ọ banyere na Kapanaum. E nwere otu onye ọchịagha onye nwere ohu nke ọ hụrụ n’anya, ohu ahụ rịara ọrịa nke mere o ji nọdụ n’ọnụ ọnwụ.
Mgbe ọ nụrụ maka Jesu, o ziri ndị okenye nke ndị Juu, ka ha gakwuru Jesu rịọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya. Mgbe ndị okenye nke ndị Juu bịakwutere Jesu ha rịọsiri ya ike sị, “Ọchịagha nke a kwesịri ka i meere ya ihe a ọ rịọrọ gị, n’ihina ọ hụrụ obodo anyị n’anya, o wukwaara anyị ụlọnzukọ anyị.”
Jesu sooro ha, ma mgbe Jesu bịaruru nso n’ụlọ onye ọchịagha ahụ, o zipụrụ ndị enyi ya ka ha zute Jesu gwa ya sị, “Dinwenụ m, enyela onwe gị nsogbu, n’ihina etosighị m ka ị bata n’okpuru ụlọ m, ya bụ echeghị m ịbịakwute gị, ma kwuo naanị okwu ka ahụ dị nwodibo m mma.
N’ihina mụ onwe m bụ onye nọ n’okpuru ike ọchịchị, nwekwa ndịagha nọ n’okpuru m. Ana m enye otu onye iwu sị Gaa, ọ gaba; gwa onye nke ọzọ sị, Bịa ọ bịa; gwakwa ohu m, Mee nke a o mee ya.”
Mgbe Jesu nụrụ nke a, o juru ya anya, o wee tụgharịa sị igwe mmadụ ndị na-eso ya, “Agwa m ụnụ, ahụbeghị m ụdị okwukwe dị otu a ọ bụladị n’lzrel.”
Ma mgbe ndị ọchịagha ahụ zitere lọghachiri n’ụlọ ya, ha chọpụtara na ahụ adịla ohu ahụ mma.
Igbo Mass Readings for September 17 2024, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for September 16 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.