Igbo Mass Readings for September 6 2027, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 6 2027, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:24-2:3
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Kolosi
Ugbu a ana m añụrị ọñụ n’ahụhụ m na-ata maka ụnụ. N’anụahụ m, ana m emezukwa ihe fọdụrụ n’ahụhụ Kristi maka ahụ ya bụ nzukọ.
Ọ bụ n’ihi nke a ka m ji bụrụ onyeozi dịka ọnọdụ ọrụ nke e nyere m maka ụnụ, ka m mee ka a matazuo okwu nke Chineke n’uju.
Nke a bụ ihe omimi nke e zoro site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, ma ugbu a, e meela ka ndị nsọ ya mata ya. Chineke họọrọ ime ka e si n’etiti ha mara otu ụba nke ebube ihe omimi a si dị ukwuu n’etiti ndị mba ọzọ, nke bụ Kristi bi n’ime ụnụ, onye bụ nchekwube nke otito.
Ọ bụ ya ka anyị na-ekwupụta na-adọ onye ọbụla aka na ntị, jiri amamihe niile na-akụziri onye ọbụla, ka anyị chee mmadụ niile n’otu n’otu n’ihu Chineke dịka ndị tozuru oke n’ime Kristi.
Ọ bụ maka nke a ka m ji na-adọgbu onwe m, jirikwa ike dị egwu nke ọ kpalitere n’ime m na-arụsi ọrụ ike. Ọ bụ n’ime ya ka e zoro akụ niile nke amamihe na mmụta.
Ana m ekwu nke a ka onye ọbụla ghara iji ire ụtọ na okwu nrafu duhie ụnụ ụzọ. N’agbanyeghị na anọghị m n’etiti ụnụ n’anụahụ, anọ m n’etiti ụnụ na mmụọ.
Obi na-atọkwa m ụtọ mgbe m na-ahụ usoro ọma ụnụ ji eme ihe na otu okwukwe ụnụ n’ime Kristi si sie ike.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 62: 6-7,9
Azịza: Na Chineke ka nzọpụta m na otito m dị
1. Sọ na Chineke ka obi m ga-ezuike
Na ya ka olileanya m si abịa
Naanị ya bụ nkume m, nzọpụta m,
Na Chineke ka m chọtara ebe nchedo.
Azịza: Na Chineke ka nzọpụta m na otito m dị
2. Ndị mmadụ daberenụ na ya oge niile
Buterenụ ya mkpa ụnụ
Chineke bụ ebe nchedo anyị.
Azịza: Na Chineke ka nzọpụta m na otito m dị
MBEKU – Ps. 119:18
Alleluia, Alleluia:
Meghee anya m ka m wee hụ ihe ịtụnaanya dị n’iwu gị.
Alleluia.
OZIỌMA – 6:6-11
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
N’ụbọchị Sabat nke ọzọ, mgbe Ọ banyere n’ụlọnzukọ ikuzi ihe, e nwere otu nwoke nọ n’ebe ahụ onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ.
Ndị Odeakwụkwọ na ndị Farisii nọ na-ele ka ha hụ ma Ọ ga-agwọ mmadụ n’ụbọchị Sabat ka ha hụ ihe ha ga-eji bo ya ebubo.
Ebe ọ bụ na Ọ maara echiche obi ha, Jesu gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị, “Bịa guzoro ebe a.”
O bilie guzoro ebe ahụ. Jesu asị ha, “Ana m ajụ ụnụ, o ziri ezi n’iwu ụbọchị Sabat ime ihe ọma ka ọ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta ndụ ka ọ bụ imebi ya?
O lezuru ha niile anya bịa si nwoke ahụ, “Gbatịa aka gị.” O mere nke a, aka ya wee dịkwa mma. Iwe na ọnụma jupụtara ha obi nke mere ha ji na-ekwukọrịta n’etiti onwe ha ihe ha ga-eme Jesu.
Igbo Mass Readings for September 6 2027, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.