Igbo Mass Readings for September 23 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 23 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:27-34

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ilu

Ajụla imere ndị chọrọ iheọma n’aka gị ọgọ mgbe ị nọ n’ọnọdụ ime ya. Agwala onye agbataobi gị, “Gaba, bịa ọzọ echi,” ebe i nwere ike ime ya ugbu a. Echela ihe ọjọọ megide onye agbataobi gị, onye weere gị ka enyi ya.

Gị na mmadụ ibe gị esela okwu na nkịtị, mgbe o meghị gị ihe ọjọọ ọbụla. Enwekwala anya ukwu n’ebe onye ajọomume nọ, eñomikwala ihe ọjọọ ya ọbụla; n’ihina onye ihe ọjọọ bụ arụ n’ihu Yahweh, ndị eziomume ka ọ na-achọ.

Yahweh na-abụ ụlọ onye ajọomume ọnụ, ma ọ na-agọzi ebe obibi onye eziomume. Ọ bụ ndị na-akwa emu ka ọ na-akwa emu, ọ na-egosi ndị umeala amara ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 15:2-3, 3-4, 5

Azịza: Onye na-ebi ndụ eziomume ga-ebi n’ugwu nsọ nke Onyenweanyị.

1. Onye nwere ikike ịbata n’ụlọ gị?

Ọ bụ nwoke ahụ na-ebughị njọ ọbụla na ndụ ya,

onye na-eme ihe dị mma,

onye ji obi ya niile ekwu eziokwu

onye na-anaghị ekwutọ ndịọzọ. Azịza

2. Onye anaghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ

mọbụ bo ya ebubo asị

Onye na-eleda ndị amaghị Chineke anya

ma na-enye ndị na-atụ Yahweh egwu nsọpụrụ. Azịza

3. Onye na-ebinye ego n’anaghị ọmụrụ nwa,

Onye anaghị eri ngarị iji megide Onye enweghị ihe ọjọọ o mere

Ọ bụrụ na mmadụ e mee ihe ndị a

O nweghị ihe ọbụla ga-eme ka egwu tụọ ya. Azịza

MBEKU – Phil 2:15-16

Alleluia, Alleluia:

Chawapụtanụ dị ka ihe n’ụwa; Ụnụ na-ebutere ya okwu nke ndụ.

Alleluia

OZIỌMA – 8:16-18

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “O nweghị onye ọbụla ga-etinyecha ọkụ na mmụọkụ, were efere kpuchie ya, mọbụ dọba ya n’okpuru akwa ndina; kama ọ na-adọba ya n’elu ihe e ji adọba ọkụ, ka ndị na-abata n’ụlọ hụ ihe mgbe ha na-abata.

N’ihina ọ nweghị ihe ọbụla e zoro eze nke a agaghị eme ka ọ pụta ihe. O nweghịkwa ihe nzuzo ọbụla nke mmadụ na-agaghị ama, mekwaa ka ọ pụta ihe.

Ya mere, lezienụ anya otu ụnụ si anụ, n’ihina onye ọbụla nwere enwe, ka a ga-enyewanye, onye ọbụla na-enweghị enwe, ọ bụladị nke ntakịrị ọ na-eche na ya nweere ka a ga-anapụ ya.

Igbo Mass Readings for September 24 2024, Tuzde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for September 23 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: October 14, 2022