Igbo Mass Readings for September 30 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 30 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:6-22
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ nke Job
O nwere otu ụbọchị mgbe ụmụ nke Chineke bịara igosi Yahweh onwe ha, Ekwensu abịakwa n’etiti ha.
Yahweh wee jụọ Ekwensu sị: “Ebee ka i si bịa?” Ekwensu wee zaa Yahweh sị: “Ana m aga n’ihu na azụ ma na-akpagharịkwa n’elu ụwa.”
Yahweh wee jụọ Ekwensu sị: “Ị tuleela nwodibo m Job; na o nweghị onye ọbụla dịka ya n’elu ụwa.
Nwoke enweghị ụta ọbụla ma na-ebi ndụ kwụ ọtọ, onye na-atụrụ Chineke egwu ma na-ezere ihe ọjọọ?”
Ekwensu wee zaa Yahweh sị: “Job ọ na-atụ Chineke egwu na nkịtị? Ọ bụ na ọ bụghị gị kwanyeere ya nchedo , ya na ezinụụlọ ya na ihe niile o nwere?
Ị gọziela aka ọrụ ya niile nke mekwara ka akụnụụba ya bawanye n’ụwa. Ma ugbu a, setịpụ aka gị metụ ihe niile o nwere ka ị hụ na ọ ga-akpọ gị iyi n’ihu gị.”
Ma Chineke gwara Ekwensu sị: “Lee, ihe niile o nwere dị gị n’aka, ma emetụkwala ndụ ya aka.”
Ekwensu wee si n’ebe Chineke nọ pụọ. Otu ụbọchị mgbe ụmụ ya ndị nwoke na ndị nwaanyị nọ na-eri ma na-añụkwa n’ụlọ nke diọkpara, otu onyeozi bịakwutere Job sị ya,
“Lee, ehiugbo gị niile na-arụ ọrụ n’ugbo , ma ịnyịnyaibu gị na-atakwa nri n’akụkụ ebe ahụ; ndị Sabea dakwasịrị ha wee bukoro ha ma were mmaagha gbuokwa ụmụodibo gị, ọ bụ naanị m bụ onye gbalahụrụ ha wee bịa ka m kọọrọ gị.”
Ka ọ na-ekwu nke a, onyeọzọ bịakwara sị ya: “Ọkụ nke Chineke si n’eluigwe daa wee gbapịasịa atụrụ na ụmụodibo gị niile, ọ bụ naanị m dị ndụ bịa ka m kọọrọ gị.”
Ka ọ na-ekwu nke a, onyeọzọ bịakwara sị ya: “Ndị obodo Kaldịa dị otu atọ bịara bukọrọ ịnyịnya gị niile were mmaagha gbuokwa ụmụodibo gị, ọ bụ naanị m bụ onye gbalahụrụ ha, wee bịa ka m kọọrọ gị.”
Ka ọ na-ekwu nke a, onyeọzọ bịakwara sị ya: “Ụmụ gị ndị nwoke na ndị nwaanyị nọ na-eri na añụkwa n’ụlọ nke dị ọkpara;
Ma oke ikuku si n’ọzara bịa kwatuo ụlọ ahụ, o wee dagbuo ụmụ gị ahụ niile, ọ bụ naanị m pụtanwuru wee bịa ka m kọọrọ gị.”
Job kuliri dọkasịa uwe ya, kpụchapụ ntụtụisi ya daa n’ala sekpuoro Chineke. O kwuo sị: “Agba ọtọ pụta n’afọ nne m, aga m agbakwa ọtọ laghachi;
Chineke wetara Chineke were; ngọzi dịrị aha Chineke. N’ihe ndị a niile Job emehieghị mọbụ kwutọọ Chineke.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 17:1, 2-3, 6-7
Azịza: Onyenweanyị, gee ntị n’arịrịọ m, che ntị nụrụ ekpere m.
1.Onyenweanyị nụrụ arịrịọ m na arịọ maka ikpe ziri ezi;
Gee ntị n’arịrịọ m
Chee ntị nụrụ ekpere m
N’ihina o nweghị asị ọbụla dị n’ọnụ m. Azịza.
2. Ọ bụ gị ga-egosịpụta eziokwu m
Gị onye na-ahụ ihe ziri ezi!
Ị na-anwale m mana o nweghị ihe ọjọọ ọbụla ị hụrụ
atamughị m ntamu. Azịza.
3.Ana m akpọku gị Chineke ma ị na-azakwa m
Chee ntị nụrụ ihe m na-ekwu
Gosịpụta nnukwu ọrụ ịhụnaanya gị,
gị onye nzọpụta ndị gbapụrụ n’ala ha! Azịza.
MBEKU – Jọn 14:5
Alleluịa, Alleluịa:
Mụ onwe m bụ ụzọ eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye ọbụla ga-abịakwute Nna ma ọ bụghị site na m.
Alleluịa.
OZIỌMA – 9:46-50
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ịrụụka dapụtara n’etiti ndị na-eso ụzọ Jesu, maka onye ka ibe ya ukwuu n’etiti ha. Ma mgbe Jesu matara ihe ha na-eche n’obi ha, O kuuru nwatakịrị, guzobe ya n’akụkụ ya.
Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nke ga-anara nwatakịrị a n’aha m, naara m. Onye ọbụla nke naara m, narakwara onye ahụ zitere m.
N’ihina onye dịkarịsịrị nta n’etiti ụnụ niile bụ onye kacha ukwu. Jọn azaa sị, “Onye nkuzi anyị hụrụ otu na-achụpụ ajọ mmụọ n’aha gị, anyị wee gbochie ya, n’ihina ọ bụghị onye otu anyị.”
Ma Jesu sịrị ha, “Ụnụ egbochila ya, n’ihina onye ba-adịghị emegide ụnụ, nọnyere ụnụ.
Igbo Mass Readings for October 1 2024, Emume Marịa Dị Ngọzi Ezenwaanyị Naịjirịa
Igbo Mass Readings for September 30 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Adanyeghị n’Emume.