Igbo Mass Readings for October 23 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 23 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:20-25

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom

Abraham e jighịkwa ekweghịekwe nwe obi abụọ banyere nkwa ahụ Chineke kwere ya. Kama okwukwe ya mere ka ọ gbasie ike, ka ọ na enye Chineke otito.

Obi siri ya ike nke ukwu na Chineke pụrụ imezu ihe o kwere na nkwa. N’ihi nke a ka Chineke ji site n’okwukwe ‘gụọ Abraham n’onye eziomume.’ E deghị okwu a bụ, ‘A gụnyere ya n’onye eziomume’ maka naanị Abraham.

Edekwara ya maka anyị bụ ndị kwere n’onye ahụ mere ka Dinwenụ anyị Jesu Kristi si n’ọnwụ bilie. Jesu Kristi onye e gburu n’ihi mmehie anyị, sikwa n’ọnwụ bilie n’ihi nzọpụta anyị.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Luk 1:69-70, 71-72, 73-75

Azịza: Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel, maka na Ọ bịara leta ndị nke ya.

1. O weliterela anyị onye nzọpụta

site n’agbụrụ Devid, nwodibo ya;

Otu o siri kwuo n’oge ochie,

site n’ọnụ ndị amụma ya; Azịza

2. Na a ga-azọpụta anyị site n’aka ndị iro anyị,

Gosi ebere nke o kwere nnanna anyị ha na nkwa,

bịa chetakwa ọgbụgbandụ ya dị nsọ. Azịza

3. Ọ ñụụrụ nnanna anyị bụ Abraham iyi

Kwekwa nkwa na ya ga-azọpụta anyị n’aka ndị iro anyị

Ka anyị nwee ike na-ekpere ya atụghị egwu ọbụla

ụbọchị niile nke ndụ anyị. Azịza

MBEKU – Matt 4:4

Alleluịa, Alleluịa:

Ọ bụghị naanị site na nrị ka mmadụ si adị ndụ, kama site n’okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta.

Alleluịa.

OZIỌMA – 12:13-21

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.

Otu onye n’ime igwe mmadụ sịrị Jesu, “Onye nkụzi, gwa nwanne m nwoke ka anyị kee ihe anyị nwetara n’aka nna anyị.”

Ma Jesu zara ya sị, “Nwoke m, onye mere m onye ikpe mọbụ onye na-eke ihe n’ebe ụnụ?”

Ọ gwara ha sị, “Kpacharanụ anya, zerekwanụ anyaukwu niile; n’ihina ihe mejupụtara ndụ mmadụ abụghị oke akụnụụba o nwere.”

Ọ gwakwara ha okwu n’ụkabụilu sị, “Ala ubi otu nwoke bara ọgaranya wetara ọtụtụ ihe; o wee na-eche n’ime obi ya sị, ‘Gịnị ka m ga-eme n’ihina enweghị m ebe m ga-echekwa ihe ubi m ndị a?’

O kwuru sị, ‘Nke a ka m ga-eme: aga m akwatu ọba m niile, rụọ ndị nke ha obosara, ebe ahụ ka m ga-echekwa ọka m niile na akụnụụba m niile.  

Mgbe ahụ aga m asị mkpụrụobi m, ‘Mkpụrụobi I nwere ọtụtụ akụnụụba e debeere gị maka ọtụtụ afọ; dere jụụ, rie ñụọ, nwee obi añụrị.

Ma Chineke sịrị ya, ‘Onye nzuzu!  N’abalị taa ka m ga-achọ mkpụrụobi gị n’aka gị; ihe niile ị kpakọrọ nke onye ka ha ga-abụ?

Otu a ka ọ dị onye ọbụla na-akwadoro onwe ya akụ ma ọ bụghị ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for October 23 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: October 16, 2022