Igbo Mass Readings for August 26 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 26 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-5, 11-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke Abụọ Pọl degaara Ndị Tesalonịka
Pọl, Silvanọs na Timoti na-edegara nzukọ nke ndị Tesalonịka, akwụkwọozi, ndị bụ ndị nke Chineke Nna, na nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi.
Ka amara na udo nke si n’aka Chineke Nna na nke Onyenweanyị Jesu Kristi dịrị ụnụ. Ụmụnna m, anyị aghaghị ikele Chineke ekele mgbe ọbụla banyere ụnụ.
O kwesịrị ka anyị mee otu a, n’ihi okwukwe ụnụ na-abawanye. Ịhụnaanya onye ọbụla n’ime ụnụ nwere n’ebe ibe ya nọ na-ebuwanyekwa ibu.
Anyị onwe anyị ji ụnụ anya isi n’etiti nzukọ Chineke niile maka ntachiobi na okwukwe nke ụnụ nwere n’ime nsogbu niile na mkpagbu niile nke ụnụ na-edi.
Ihe ndị a na-egosi ikpe nkwụmọtọ nke Chineke, ka e wee mara ndị kwesịrị alaeze nke Chineke, alaeze nke ụnụ na-ata ahụhụ n’ihi ya.
Gbasara nke a, anyị na-ekpere ụnụ ekpere mgbe niile ka Chineke mee ka ụnụ bụrụ ndị kwesịrị oku ahụ a kpọrọ ụnụ.
Site n’ike ya ka o mejuoro ụnụ iheọma niile na-akpa ụnụ, ka o mejupụtakwa ihe niile ụnụ ji okwukwe eme, ka e wee too aha Dinwenụ anyị Jesu n’ime ụnụ, tokwaa ụnụ n’ime ya, dịka amara nke Chineke na Dinwenụ anyị Jesu Kristi si dị.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 96:1-2, 2-3, 4-5
Azịza: Kwupụta ọrụ ịtụnaanya nke Onyenweanyị n’ụwa niile.
1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ;
ụwa niile kweere Onyenweanyị ukwe.
Kweerenụ Onyenweanyị ukwe, too aha ya; Azịza
2. Kwupụta nzọpụta ya ụbọchị niile.
Mee ka ụwa niile mara maka otito ya
Kwupụtakwa ọrụ ịtụnaanya ya n’ebe ndị mmadụ nọ. Azịza
3. N’ihina Onyenweanyị dị ukwuu, ma kwesịkwa inye nnukwu otito;
O kwesịrị ịtụ ya egwu karịa ihe niile.
N’ihina chi niile nke ndị mba ọzọ bụcha arụsị!
mana Onyenweanyị kere eluigwe. Azịza
MBEKU – Ps 27:11
Alleluia, Alleluia:
Kuziere m ụzọ gị O Dinwenụ, dube m n’ụzọ kwụ ọtọ.
Alleluia
OZIỌMA – 23:13-22
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu kwuru sị: “Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ụnụ, bụ ndị ihuabụọ. Ụnụ na-akpọchibido ndị mmadụ ọnụụzọ nke eluigwe makana ụnụ onwe ụnụ anaghị abanye nke ụnụ na-ekwe ka ndịọzọ baa.
Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ụnụ bụ ndị ihuabụọ, ụnụ na-apụnarị ụmụnwaanyị ajadu ihe ndị ha nwere n’aka ike n’agbanyeghị na ụnụ na-egosipụta na ụnụ na-ekpe oke ekpere.
Ahụhụ dị egwu ga-abụ ụgwọ ụnụ ga-anata. Azị gbakwa ụnụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ụnụ ndị ihuabụọ. Ụnụ na-agafe oke osimiri na mba dị icheiche iji tọghata otu onye ga-esonyere ụnụ.
Mgbe ụnụ tọghatara ya ụnụ emee ya ka ọ bụrụ nwa nke ọkụmmụọ okpukpu abụọ dịka ụnụ onwe ụnụ bụ. Azị gbakwa ụnụ, ndị ndu kpuru isi.
Ụnụ na-asị na onye ọbụla jiri ụlọnsọ ñụọ iyi o nweghị ihe ọbụla ọ bụ, ma ọ bụrụ na onye ọbụla ejiri ọlaedo nke dị n’ụlọnsọ ñụọ iyi iwu ji ya. Ụnụ ndị nzuzu kpuru isi!
Olee nke ka ibe ya, ọlaedo dị n’ụlọnsọ ka ọ bụ ụlọnsọ nke mere ọlaedo ahụ ka ọ dị nsọ? Ụnụ na-akụzikwa sị, ọ bụrụ na onye ọbụla ejiri ekwuaja ñụọ iyi, ọ dịghị ihe ọ bụ.
Ma ọ bụrụ na onye ọbụla ewere onyinye dị n’elu ya ñụọ iyi iwu ji ya. Ụnụ ndị kpuru isi. Olee nke ka ibe ya, onyinye ka ọ bụ ekwuaja nke mere ya ka ọ dị nsọ?
Ya mere, onye ọbụla ji ekwuaja ñụọ iyi jikwazi ma ekwuaja ma ihe niile dị n’elu ya ñụọ iyi. Ọzọkwa onye ọbụla jiri ụlọnsọ ñụọ iyi jikwazi ma ụlọnsọ ma onye bi n’ime ya ñụọ iyi. Onye ọbụla nke ji eluigwe ñụọ iyi jikwazi ma ocheeze Chineke ma onye nọ na ya ñụọ iyi.
Igbo Mass Readings for August 27 2024, Ncheta Mọnịca dị Asọ
Igbo Mass Readings for August 26 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.