Igbo Mass Readings for August 21 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 21 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:11-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ndịikpe
Ụmụ Izrel mechara megide Yahweh malite ife Baal dị icheiche ofufe. Ha kwụsịrị ife Osebụrụwa bụ Chineke nke nnanna ha onye nke si n’ljipt kpọpụta ha.
Ha malitere ife chi ọzọ bụ chi dị icheiche nke mba niile gbara ha gburugburu. Ha kpọọrọ ha isiala wee kpasuo Yahweh iwe. Ha kwụsịrị ife Yahweh febe ọtụtụ Baal na Ashtarọt.
Iwe Chineke dị ọkụ megide Izrel, o wee nyefee ha n’aka ndịiro ha. Ha naara ha ihe ha nwegara. O mekwara ka ndịiro gbara ha gburugburu kara ha ike nke na ha enweghịkwa ike iguzogide ndịiro ha.
Mgbe niile ha jere agha, aka Yahweh biliri imegide ha dịka o kwuru na ga-eme ha ihe ọjọọ. Ha nọọrọ n’oke nsogbu.
Mgbe ahụ, Yahweh nyere ha ndị ọkaikpe ndị zọpụtara ha n’aka ndị na-emegbu ha, mana ha egeghị ndị ọkaikpe ha ntị. Ha gbasoro chi ndị ọzọ, na-akpọrọ ha isiala.
Ha siri otu a hapụ ụzọ nnanna ha soro ndị dobere iwu Chineke niile; ma ha esoghị nzọụkwụ ha. Mgbe ọbụla Yahweh nyere ụmụ Izrel onye ọkaikpe, ọ na-anọnyere ya, zọpụta ụmụ Izrel n’aka ndịiro ha oge niile onye ọkaikpe ahụ dị ndụ.
N’ihina ebere ha na-eme ya mgbe ọ nụrụ ude ha na-asụ, n’ihi ndị na-emegbu ha, na-akpagbukwa ha. Mgbe ọbụla onye ndu ahụ nwụrụ, ndị Izrel na-alaghachi mee omume jọrọ njọ karịa nke ndị nnanna ha.
Ha na-agbasokwa chi niile ọzọ, fee ha ofufe, kpọọrọ ha isiala, jụkwa ịhapụ omume ọjọọ ha niile.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 106:34-35, 36-37, 39-40, 43, 44
Azịza: Onyenweanyị! Cheta anyị n’ihi ịhụnanya inwere maka ndị nke Gị
1. Ha egbuchaghị ndị mba ọzọ dịka
Osebụrụwa si nye iwu,
Mana ha na ha-alụkọrịta nwaanyị
Wee mụta ime ka ha si eme. Azịza
2. Ha bidoro febe arụsị ha,
nke bụụrụ ha ọnya
Ha weere ụmụ ha nwoke na ụmụ ha nwaanyị
chụọrọ ndị ajọ mmụọ aja. Azịza
3. Ha siri otu a jiri ọbara merụọ ala ha,
omume ha bụ nke akwụna.
Iwe nke Onyenweanyị wee dị ọkụ n’ebe ndị nke ya nọ
O wee leghara ndị nke ya anya. Azịza
4. Ọtụtụ oge ka ọ zọpụtara ha,
mana ha kpachara anya na-enupụrụ ya isi
na-abawanye n’ime ihe ọjọọ
N’agbanyeghị nke a o meere ha ebere n’ọnọdụ ha Mgbe ọbụla ọ nụrụ mkpu akwa ha. Azịza
MBEKU – Ps 119:135
Alleluia, Alleluia:
Mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị, ma kuziere m ime uche gị.
Alleluia
OZIỌMA – 19: 16-22
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe ahụ otu nwoke bịakwutere Jesu jụọ ya sị, “Onye nkuzi olee ezi ihe m ga-eme ka m wee nweta ndụ ebighịebi?” Jesu ajụọ ya sị, “Gịnị mere I ji ajụ m ajụjụ banyere ezi ihe?
Naanị otu onye dị nke dị mma. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbanye na ndụ dobe iwu.” O wee jụọ Jesu sị, “Olee ndị ọ bụ?”
Jesu azaa ya sị, “Egbula ọchụ, ayịla ọyị, ezula ohi, agbala ama asị, sọpụrụ nna na nne gị, ị ga-ahụkwa onye agbataobi gị n’anya dịka I si hụ onwe gị n’anya.”
Nwokorobịa ahụ sịrị ya; “Ana m edobe iwu ndị a niile. Gịnị ka ọ fọdụziri m?” Jesu sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ izu oke, gaa ree ihe niile I nwere, nye ndị ogbenye ihe i retara, Ị ga enwe akụ n’eluigwe.
Ị bịazie sobe m.” Mgbe nwokorobịa ahụ nụrụ nke a, ọ pụbara na mwute n’ihina o nwere nnukwu akụnụụba.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.