Igbo Mass Readings for August 19 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 19 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 24:15-24

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Ezekiel

A gwara m okwu nke Yahweh otu a, “Nwa nke mmadụ, aga m anapụ gị nwunye gị; mana ị gaghị eti mkpu mọbụ bee akwa, mọbụ gbaa anya mmiri, sụọ ude ma asụsila ya ike, eberela onye nwụrụ anwụ akwa, were akwa gị kee n’isi gị yiri akpụkpọ ụkwụ gị n’ụkwụ, ekpuchila egbugbere ọnụ gị, mọbụ rie achịcha ndị na-eru ụjụ.”

Agwara m ndị mmadụ nke a n’ụtụtụ, nwunye m anwụọ na mgbede, ka chi bọrọ emere m dịka Chineke si nye m n’iwu.

Ndị mmadụ ajụọ m, “Ọ bụ na ị gaghị agwa anyị ihe omume gị ndị a pụtara n’ebe anyị nọ?” Azara m ha sị, “Okwu nke Yahweh bịakwutere m sị, ‘Gwa ụlọ Izrel: otu a ka Yahweh Chineke kwuru.

Aga m emetọ ebe nsọ m, ihe ngala nke ike gị, ihe ụtọ nke anya gị, ihe mmasị nke mmụọ gị. Ụmụ gị ndị nwoke na ndị nwaanyị ị hapụrụ ga-ada na mmaagha.

Ụnụ ga-eme dịka m siri mee; ụnụ agaghị ekpuchi egbugbere ọnụ mọbụ rie achịcha ndị na-eru ụjụ: ụnụ ga-eji akwa ụnụ kee n’isi, yiri akpụkpọ ụkwụ ụnụ n’ụkwụ; ụnụ agaghị eru ụjụ mọbụ bee akwa.

Ụnụ ga-atala maka ihi njọ ụnụ, wee na-asụ ude n’etiti ụnụ. Izikel ga-abụ ihe ịrịbaama n’ebe ụnụ nọ. Ụnụ ga-eme dịka o si mee. Mgbe nke a mechara, ụnụ ga-ama na Ọ bụ m bụ Yahweh.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Deut 32:18-19, 20, 21

Azịza: Ụnụ chefuru Chineke onye nke bụ Nna ụnụ.

1. Ụnụ chefuru Nkume kpụrụ ụnụ

Chineke onye nke bụ Nna ụnụ

Yahweh hụrụ nke a wee iwe

Chụpụ ụmụ ya ndị nwoke na ndị nwaanyị. Azịza

2. Ọ sịrị, Agaghị m enyere ha aka ọzọ

Ka m hụ ihe ha ga-abụ n’ikpeazụ

Ọgbọ isiike nke na-ekwesịghị ntụkwasịobi. Azịza

3. Ha jiri ife arụsị kpalie ekworo m

Site n’ime ya kpasuo m iwe.

Aga m eji mba dị ala kpalie ekworo ha

Werekwa mba nzuzu kpasuo ha iwe. Azịza

MBEKU – Ps 119:135

Alleluia, Alleluia:

Mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị, ma kuziere m ime uche gị.

Alleluia

OZIỌMA – 19: 16-22

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Mgbe ahụ otu nwoke bịakwutere Jesu jụọ ya sị, “Onye nkuzi olee ezi ihe m ga-eme ka m wee nweta ndụ ebighịebi?”

Jesu ajụọ ya sị, “Gịnị mere I ji ajụ m ajụjụ banyere ezi ihe? Naanị otu onye dị nke dị mma. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbanye na ndụ dobe iwu.”

O wee jụọ Jesu sị, “Olee ndị ọ bụ?” Jesu azaa ya sị, “Egbula ọchụ, ayịla ọyị, ezula ohi, agbala ama asị, sọpụrụ nna na nne gị, ị ga-ahụkwa onye agbataobi gị n’anya dịka I si hụ onwe gị n’anya.”

Nwokorobịa ahụ sịrị ya; “Ana m edobe iwu ndị a niile. Gịnị ka ọ fọdụziri m?” Jesu sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ izu oke, gaa ree ihe niile I nwere, nye ndị ogbenye ihe i retara, Ị ga enwe akụ n’eluigwe.

Ị bịazie sobe m.” Mgbe nwokorobịa ahụ nụrụ nke a, ọ pụbara na mwute n’ihina o nwere nnukwu akụnụụba.

Igbo Mass Readings for August 20 2024, Ncheta Bernard dị Asọ, Abbọt na Dọktọ

Igbo Mass Readings for August 19 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 11, 2022