Igbo Mass Readings for November 27 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 27 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-6,8-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Daniel
N’afọ nke atọ, n’oge nke eze Jehoiakim eze Juda, Nebụkadneza, eze Babịlọn bịara buso Jerusalem agha. Yahweh nyefere Jehoiakim eze Juda n’aka ya, na ihe ụfọdụ e jiri chọọ ụlọnsọ Chineke mma.
O buuru ha niile gaba obodo Shina, wee dobe ikonsọ ndị ahụ n’ụlọ arụsị ya. Onyeeze ahụ nyere Ashipenaz onyeisi ụmụodibo ya ndị a pịrị apị iwu, ka ọ họpụta ụfọdụ ụmuụokorobịa Izrel, ndị si n’agbụrụ ndịeze, mọbụ nke ndị ọgaranya, ha agaghị enwe ntụpọ ọbụla n’ahụ, ha ga-ama mma ile anya, a ga-azụ ha n’ụdị amamihe ọbụla, ha ga-abụ ndị nwere nnukwu akọnuuche, nweekwa nghọta banyere ihe dị icheiche, tosị ịgba odibo n’obi onyeeze.
Ashipenaz n’onwe ya ga-akụziri ha asụsụ na edemede nke ndị Kaldia. Onyeeze si n’oche nri ya na-ewepụta nri na mmanya a ga-enye ha ụbọchị niile.
Ha ga-enwe ọzụzụ ga-anọ afọ atọ, nke ọ ga-abụ ha mechaa, ha enwe ike itosị etosị ịnọ n’obi onyeeze. N’ime ụmụokorobịa ndị a họtara bụ Daniel, Hananịa, Mishel na Azarịa, ha bụ ndị Juda.
Daniel, onye ọ na-anụ ọkụ n’obi ịhụ na ya emerụghị onwe ya site n’iri nri, mọbụ ịñụ mmanya si n’oche nri onyeeze, rịọrọ onyeisi ụmụodibo eze ka ọ zọpụta ya site na mmerụ nke a, site n’amara Chineke, Daniel nwetara ihuọma na obi ebere n’aka onyeisi ụmụodibo eze.
Ma ọ dọrọ Daniel aka na ntị sị, “Ana m atụ egwu maka nna m ukwu onyeeze, ya onwe ya jiri aka ya wepụta nri na mmanya ụnụ, ọ bụrụ na ọ hụ na ụnụ tara ahụ karịa ndị ọgbọ ụnụ ndịọzọ, ndụ m ga-anọ na nsogbu n’aka onyeeze n’ihi ụnụ.
Mgbe o kwuru nke a, Daniel gwara onyenche nke onyeisi ụmụodibo eze gwara ka ọ na-eche Daniel, Hananịa, Mishael na Azarịa sị, “Biko were abalị iri nwalee ụmụodibo gị, n’oge a sọọsọ ihe anyị ga-eri bụ akwụkwọ nri na mmiri.
I nweziri ike ịtụle otu anyị dị na otu ụmụokorobịa ndịọzọ ndị na-eri nri onyeeze dị, site n’ihe ị hụrụ, meere ụmụodibo gị otu o tosiri.” Nwoke ahụ wee kwenye ime ihe ha rịọrọ, wee nwalee ha abalị iri.
Mgbe abalị iri gachara, ha jupụtara na ndụ karịa ụmụokorobịa ndị na-eri nri si n’oche nri onyeeze. Ya mere, onyeisi ụmụodibo ahụ kwụsịrị iwetara ha nri na mmanya si n’oche nri onyeeze, wee na-enye ha sọọsọ akwụkwọ nri.
Chineke mere ka ụmụokorobịa anọ ndị a nwee ọgụgụisi pụrụ iche n’ihe ọbụla gbasara edemede na amamihe. Daniel nwekwara onyinye ịkọwa ụdị ọhụ mọbụ nrọ ọbụla.
Mgbe oge ọzụzụ ha zuru, onyeisi ụmụodibo eze kpọgaara ha Nebukadneza. Ha na onyeeze kparịtara nkata; o wee chọpụta na n’ime ụmụokorobịa ndị a, o nweghị nke e nwere ike iji tụnyere Daniel, Hananịa, Mishel na Azarịa.
O wee mee ka ha sonye n’otu ndị ndụmọdụ ya. Ọ chọpụtara n’ajụjụ ọbụla ọ jụrụ ha gbasara amamihe, na ọsịsa ha na-enye ya karịrị nke ndiị amansị niile na ndị ọkachamara nọ n’alaeze ya ugboro iri.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Dan 3: 52, 53, 54, 55, 56
Azịza: Ebube na otito dịrị gị ebeebe.
1. Ngọzi dịrị gị, Yahweh, Chineke nke nnanna anyị ha,
Otito na nsọpụrụ dịrị gị ebeebe
Ngọzi dịrị aha gị dị nsọ,
Otito na nsọpụrụ dịrị gị ebeebe. Azịza
2. Ngọzi dịrị gị n’ụlọnsọ gị dị ebube;
Ngọzi kacha elu dịrị gị ebeebe. Azịza
3. Ngọzi dịrị gị n’ocheeze gị
Otito kacha elu dịrị gị ebeebe. Azịza
4. Ngọzi dịrị gị onye mazuru ihe niile
nọrọkwa n’oche nke Kerub
ka e nye gị otito na ngọzi kacha elu ebeebe. Azịza
5. Ngọzi dịrị gị n’eluigwe,
Ị dị ngọzi dịkwa elu karịchaa ihe niile ebeebe. Azịza
MBEKU – Mkpughe 2:10.
Alleluịa, Alleluịa:
Bụrụ onye kwesịrị ntụkwasịobi ruo n’ọnwụ, Dinwenụ na-ekwu; Aga m enyekwa gị okpueze nke ndụ.
Alleluịa.
OZIỌMA – 21:1-4.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu letịrị anya elu, hụ ndị ha ọgaranya ka ha na-etinye ego ha n’ime igbe onyinye. Ọ hụrụ otu nwanyị ajadu dara ogbenye nke tụnyere ntakịrị mkpụrụ ego ọlaọkụ abụọ.
Ọ gwara ha sị, “N’ezie agwa m ụnụ, nwaanyị ajadu a dara ogbenye tinyere ego karịa ha niile.
N’ihina ha niile nyere site n’akụnụụba ha, ma nwaanyị a sitere n’ụkọ ya tinye ihe niile o nwere.