Igbo Mass Readings for November 20 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 20 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:10-15, 41-43, 54-57, 62-63
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Makabii nke Mbụ
Site n’ime ha ka otu ajọ mgbọrọgwụ siri pụta bụ nwoke a na-akpọ Antiokus Epifanes nwa eze Antiokus onye nke e jibu eji na Rom ka onyemba. Antiokus Epifanes a bidoro ichi eze na narị afọ iri atọ na asaa n’ime ọchịchị nke alaeze ndị Grik.
N’oge ahụ ndị mmebi iwu siri Izrel pụta duhie ọtụtụ mmadụ ụzọ na-asị, Ka anyị gaa ka anyị na ndị mba ọzọ dị anyị gburugburu gbaa ndụ, maka na ihe ọjọọ dị icheiche na adakwasa anyị site n’oge anyị na ha kewara.
Atụmaatụ a masịrị ha. Ụfọdụ n’ime ha jiri mmasị jekwuru onyeeze ahụ. O nyere ha ikikere ka ha na-edebe iwu na omenaala ndị mba ọzọ. Ha were rụọ ebe egwuregwu na Jerusalem dịka omenaala ndị mba ọzọ siri chọọ.
Ha wepụrụ akara ibeugwu e jiri mara ha hapụ ọgbụgbandụ dị nso bịa soro ndị mba ọzọ na-akpa agwa ọjọọ dị icheiche. Mgbe ahụ ka onyeeze desara akwụkwọ iwu n’ala eze ya niile na-asị na agbụrụ niile ga-abụ otu, na ndị ọbụla ga-ahapụ omenaala nke ha.
Ndị mba ọzọ niile nabatara iwu nke a eze tinyere. Ọtụtụ ndị Izrel jikwara obi añụrị sobe okpukperechi eze ahụ; ha na-achụnyere arụsị aja, na-emerụkwa ụbọchị izu ike.
Ugbu a, n’ụbọchị nke iri na ise nke ọnwa Chislev na narị afọ na iri anọ na ise, ha wuru ihe arụ n’elu ekwu nke aja nsureọkụ. Ha wuchara ebe nchụaja nke arụsị n’ebe niile gbara Juda gburugburu.
Ha suru mgbaisiọma ọkụ n’ọnụụzọ ụlọ ha nakwa n’okporo ụzọ. Ha dọkachara akwụkwọ iwu dị nsọ ọbụla ha hụrụ ma sue ha ọkụ. Onye ọbụla a hụrụ ka o ji akwụkwọ ọgbụgbandụ, mọbụ na-ebi ndụ n’usoro iwu, e gbuo ya dịka onyeeze si tie n’iwu.
Mana ọtụtụ mmadụ n’Izrel kwụsiri ike ma kpebie n’obi ha, na ha agaghị eri ihe ọbụla rụrụ arụ. Ha họọrọ karịa imerụ onwe ha site na nri mọbụ imerụ ọgbụgbandụ ha dị nsọ. Ha nwụkwara ya bụ ọnwụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 119: 53, 61, 134, 150, 155, 158
Azịza: Nye m ndụ, Onyenweanyị, aga m na-emekwa ihe inyere n’iwu.
1. Nnukwu iwe na-ewe m mgbe m hụrụ ndị obi ọjọọ
Ka ha na-emebi iwu gị. Azịza
2. N’agbanyeghị na ọnya ndị obi ọjọọ jidere m
Anaghị m echefu okwu gị. Azịza
3. Zọpụta m na mmegbu nke ndị mmadụ,
Ka m nwee ike idobe iwu gị. Azịza
4. Ndị ji obi ọjọọ na-emegide m na-abịa m nso.
Iwu gị dị anya n’ebe ha nọ. Azịza
5. Nzọpụta tere aka n’ebe ndị ajọ mmadụ nọ
Maka na ha achọghị idobe iwu gị. Azịza
6. Eji m iwe na ọnụma ele ndị enweghị okwukwe na gị anya
Maka na ha anaghị edobe iwu gị. Azịza
MBEKU – Jọn 8:12.
Alleluịa, Alleluịa:
Abụ m ihe nke ụwa, Onyenwenayị na-ekwu. Onye ọbụla na-eso m ga-enwe ihe nke ndụ.
Alleluịa.
OZIỌMA – 18:35-43
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Ka Jesu na-abịaru Jeriko nso, otu onye isi nọdụrụ ala n’akụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ. Ọ nụrụ ụzụ igwe mmadụ ka ha na-agafe, o wee jụọ ihe kpatara ụzụ ji atụ.
Ha gwara ya sị, “Jesu onye Nazaret na-agafe!” O tiri mkpu sị, “Jesu, nwa Devid, meere m ebere!”
Ndị nọ n’ihu baara ya mba, na-agwa ya ka o mechie ọnụ; o tisikwara mkpu ike karịa sị, “Jesu nwa Devid, meere m ebere!”
Jesu kwụsịrị, nye iwu ka e dutere ya onye isi ahụ. Mgbe ọ bịaruru ya nso ọ jụọ ya sị: “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?”
Ọ zara ya sị, “Onyenwe m, mee ka m hụkwa ụzọ ọzọ.” Jesu gwara ya sị: “Hụbakwa ụzọ, okwukwe gị agwọọla gị.”
O bidoro hụba ụzọ ozigbo, soro ya na-aga, na-eto Chineke. Ndị mmadụ niile hụrụ nke a, nyere Chineke otito.