Igbo Mass Readings for November 6 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 6 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:29-36

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom

Enye anarakwa adịghị n’onyinye na n’ọkpụkpọ Chineke. Ụnụ onwe ụnụ, ndị mba ọzọ, ndị na-enupụrụ Chineke isi na mbụ anatala ebere Chineke ugbu a n’ihi nnupụisi nke ndị Juu.

Otu aka ahụ, ndị Juu na enupụrụ Chineke isi ugbu a, ka Chineke wee site n’ebere Ọ na-emere ụnụ, meere ha ebere ugbu a. N’ihina Chineke emeela mmadụ niile ndị nnupụisi ka o wee mere ha niile ebere.

Onye maara ụdị akụ dị n’ime Chineke? Onye pụrụ igwupụta ntọala amamihe ya na nke ike ọmụma ya? Onye pụrụ ịchọpụta otu o si kpebie na ihe niile ga-adị? Onye pụrụ ịmatazu ụzọ ya niile?

Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, “Onye ma ihe nọ Onyenweanyị n’uche? Onye pụrụ inye ya ndụmọdụ? Onye nyerela ya ihe onyinye mbụ nke na Ọ ga-akwụghachi onye ahụ? Chineke kere ihe niile. Ihe niile sitekwara n’aka ya; ha niile dịkwaara ya; ka otito niile dịrị Chineke, ruo ebeebe! Amen.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 69:30-31, 33-34, 36-37

Azịza: Onyenweanyị, za m n’oke ịhụnaanya gị

1. Ma, n’ebe m nọ, nwa ogbenye a na-emegbu emegbu

Site n’ike nke nzọpụta gị. Chineke, kulite m elu!

Aga m eji ukwe too aha nke Chineke

Aga m eji ekele m bulie aha ya. Azịza

2. Mgbe ahụ ndị umeala hụ nke a ha ga-añụrị

Ka ụnụ nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke!

Onyenweanyị na-ege ndị niile nọ na mkpa ntị mgbe niile

Ọ naghị echezọ ndị nke ya e ji eji. Azịza

3. Maka Chineke ga-azọpụta Zayọn,

Wugharịa obodo Juda ọzọ

Ụmụụmụ odibo ya ga-eketakwa ha

Ndị niile hụrụ aha ya n’anya ga-ebikwa na ya. Azịza

MBEKU – Ps. 119:105

Alleluia, Alleluia:

Okwu gị bụ mpanaka na-edu m bụrụkwa ihe n’ụzọ m.

Alleluia

OZIỌMA – 14:12-14

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu gwakwuru onye kpọrọ ya oriri sị, “Mgbe ọbụla ị kpọrọ oriri anyasị mọbụ nnukwu oriri ọbụla, akpọla sọ ndị enyi gị mọbụ ụmụnne gị, mọbụ ụmụnna, mọbụ ndị agbataobi gị bara ọgaranya, n’ihina ha ga-akpọkwa gị oriri n’ụlọ ha; wee si n’ụzọ dị otu a kwụghachi gị ụgwọ ihe ha riri n’ụlọ gị.

Kama, mgbe ọbụla ị kpọrọ oriri, kpọọ ndị ogbenye, ndị ọlụsị, ndị ngwọrọ na ndị isi. Ngọzi ga-adịrị gị, n’ihina i meere ndị na-agaghị akwụghachili gị iheọma. A ga-akwụghachi gị na mbilite n’ọnwụ ndị eziomume.

Igbo Mass Readings for November 7 2023

Last Update: October 16, 2022