Igbo Mass Readings for November 4 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 4 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:1-4

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara ndị Filipi

Ọ bụrụ na e nwere agbamume n’ime Kristi, ihe na-akpalite ịhụnaanya, mmekọrịta n’ime mmụọ, obi ịhụnaanya na ime ebere, mejupụtanụ ọñụ m site n’inwe otu obi, inwe otu ịhụnaanya, ịdịkọ n’otu na inwe otu obi.

Ụnụ emela ihe ọbụla n’ụzọ ịchọ ọdịmma naanị ụnụ, mọbụ n’ụzọ ịchọ otito n’efu. Ma n’obi umeala, hụnụ ndịọzọ ka ha ka ụnụ mma. Ka onye ọbụla n’ime ụnụ ghara ịdị na-achọ sọ ọdịmma nke ya. Kama na achọkwanụ ọdịmma nke ndị ọzọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 131:1, 2, 3

Azịza: Onyenweanyị, achọtala m udo m na gị.

1. Onyenweanyị ngala na mpako ọbụla anọghị m n’obi,

Anya m adịghị na nnukwu ihe.

oke ọchịchọ adịghị m n’obi

nke m ji etinye aka n’ihe kariri m ike. Azịza

2. Mana e dobela m mmụọ m jụụ

dịka nwa ọhụrụ si anọ nwayọọ n’ara nne ya

mkpụrụobi m dịka nwa ọhụrụ nọ nwayọọ. Azịza

3. Izrel nwee nchekwube n’Onyenweanyị

bido ugbu a ruo mgbe ebighịebi. Azịza

MBEKU – Ps. 119:105

Alleluia, Alleluia:

Okwu gị bụ mpanaka na-edu m bụrụkwa ihe n’ụzọ m.

Alleluia

OZIỌMA – 14:12-14

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Jesu gwakwuru onye kpọrọ ya oriri sị, “Mgbe ọbụla ị kpọrọ oriri anyasị mọbụ nnukwu oriri ọbụla, akpọla sọ ndị enyi gị mọbụ ụmụnne gị, mọbụ ụmụnna, mọbụ ndị agbataobi gị bara ọgaranya, n’ihina ha ga-akpọkwa gị oriri n’ụlọ ha; wee si n’ụzọ dị otu a kwụghachi gị ụgwọ ihe ha riri n’ụlọ gị.

Kama, mgbe ọbụla ị kpọrọ oriri, kpọọ ndị ogbenye, ndị ọlụsị, ndị ngwọrọ na ndị isi. Ngọzi ga-adịrị gị, n’ihina i meere ndị na-agaghị akwụghachili gị iheọma. A ga-akwụghachi gị na mbilite n’ọnwụ ndị eziomume.

Igbo Mass Readings for November 5 2024, Tuzde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for November 4 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: October 16, 2022