Igbo Mass Readings for June 23 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 23 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:1-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Yahweh sịrị Abram, “Hapụ obodo gị, ọnụmara gị na ụlọ nna gị ka i jee n’obodo nke m ga-egosi gị. Aga m eme gị nnukwu obodo, aga m agọzi gị ma mekwaa ka aha gị daa ụda; otu ị ga-eji bụrụ akara ngọzi.
Aga m agọzi ndị gọziri gị; aga m abụ ha ọnụ bụ ndị bụrụ gị ọnụ; agbụrụ niile nọ n’ụwa ga-agọzi onwe ha site na gị. E mechaa Abram agawa dịka Yahweh gwara ya; Lọt sokwara ya gaba.
Abram gbara iri afọ asaa na ise oge ọ hapụrụ obodo Haran. Abram kpọọrọ nwunye ya, Seraị, nwa nwanne ya nwoke bụ Lọt, na ihe niile nke ọ kpatara na ndị mmadụ nke ha nwetara n’ime obodo Haran.
Ha ebilie gaba ala Kenaan wee rute ebe ahụ. Abram siri n’obodo ahụ gafee garuo ebe ahụ dị nso n’obodo Shekem, n’osisi Ook dị n’obodo More. Ndị Kenaan bi n’obodo ahụ n’oge ahụ.
Yahweh egosi Abram onwe ya sị ya, “Aga m enye ụmụ ụmụ gị obodo nke a” ya mere Abram ji wuo ebe nchụaja maka Yahweh onye gosiri ya onwe ya n’ebe ahụ.
O siri n’ebe ahụ gaba n’ugwu ndị ahụ dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Betel ebe ọ rụrụ ụlọikwu ya; n’ebe e si na-ele Betel ka ọ nọ n’ọdịda anyanwụ nakwa ele Aị n’ofe ọwụwa anyanwụ.
N’ebe ahụ ka o wuuru Yahweh ebe nchụaja wee kpọkuo Yahweh. Abram malitikwara njem ya gaba obodo Negeb.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 33:12-13, 18-19, 20, 22
Azịza: Añụrị na Ngọzi na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.
1. Añụrị na Ngọzi na-adịrị mba Chineke bụ chukwu ha,
ndị nke ọ họọrọ dịka ndị nke ya.
Chineke si n’eluigwe eledata anya,
Ọ na-ahụ ụmụ mmadụ niile.
Azịza: Añụrị na Ngọzi na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.
2. Ma lee ka Onyenweanyị si eleta ndị niile na-atụrụ ya egwu
anya, ndị niile tụkwasịrịobi ha n’ịhụnaanya ya.
Ka O wee zọpụta mkpụrụobi ha n’ọnwụ,
ma chekwaba ha oge ụnwụ.
Azịza: Añụrị na Ngọzi na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.
3. Mkpụrụobi anyị na-eche Onyenweanyị;
ya bụ onye enyemaka na onye ogbugbo anyị,
ka ịhụnaanya gị dị n’ebe anyị nọ, O Chineke
ebe nchekwube anyị dị na gị.
Azịza: Añụrị na Ngọzi na-adịrị mba Chineke họọrọ dịka ndị nke ya.
MBEKU – Ps. 130:5
Alleluia, Alleluịa:
Ana m eche Onyenweanyị, mkpụrụobi m na-eche ya, na nkwa ya ka m nwere nchekwube.
Alleluịa
OZIỌMA – 7:1-5
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ekpela mmadụ ibe gị ikpe ka a ghara ikpe gị ikpe. N’ihina otu i siri kpee mmadụ ibe gị ikpe ka a ga-esi kpee gị ikpe. Ihe i jiri tụnyere onye ọzọ, ka a ga-eji tụnyere gị.
Gịnị mere i jiri hụ mpekele ihe dị n’anya nwanne gị, ma ị hụghị ogwe osisi dị n’anya gị onwe gị? Mọbụ kedụ ka ị ga-esi agwa nwanne gị sị, ‘Ka m wepụ gị mkpekele ihe dị gị n’anya’ ebe gị onwe gị bu ogwe osisi n’anya nke gị?
Onye ihuabụọ, buru ụzọ wepụ ogwe osisi dị gị n’anya, ka i wee hụ ụzọ nke ọma iwepụ mpekele ihe dị n’anya nwanne gị.
Igbo Mass Readings for June 24 2025, Nnukwu Emume nke Ọmụmụ Jọn Ome Mmirichukwu.
Igbo Mass Readings for June 23 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.