Igbo Mass Readings for June 22 2026, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 22 2026, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:5-8, 13-15, 18

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke Abụọ nke Ndịeze

Mgbe ahụ, eze Asiria lụsoro obodo ahụ niile agha. Mgbe o rutere Sameria, ya na ndịagha ya gbakwara ya gburugburu chebido ya, na ebuso ha agha ruo afọ atọ.

N’afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshia, eze Asiria meriri Sameria, kpụga ụmụ Izrel n’Asiria, nye ụfọdụ ebe obibi na Hala, ụfọdụ, n’ikpere mmiri Habọ bụ osimiri Gozan, ndịọzọ, n’obodo ndị Medes.

Nke a mere n’ihina ndị Izrel emehiela Yahweh, Chineke ha, onye siri n’Ijipt kpọpụta ha site n’aka Fero bụ eze Ijipt. Ha febere chi ndịọzọ.

Ha sooro omenaala obodo ndịọzọ, bụ ndị Chineke chụpụrụ n’ihi ụmụ Izrel na omenaala ndịeze Izrel webatara.

N’agbanyeghị omume ndị a, Yahweh sikwara n’ọnụ ndịamụma, ndị ọhụụzọ, dọọ ha aka na ntị sị, “Sinụ n’omume ọjọọ ụnụ pụta ma dobe iwu na ọkwa ndị a site n’ịgbaso usoro iwu niile nke m nyere nna nna ụnụ ndị m si n’ọnụ ndị amụma ndị odibo m kwupụtara ha.”

Mana ha achọghị ige ntị. Ha kpọchiri ntị, gbaa isi akwara dịka nna nna ha ndị enweghị okwukwe na Yahweh Chineke ha.

Ha ledara iwu ya na ọgbụgbandụ ya na nna nna ha mere anya wee nupu isi na ndụmọdụ na ọkwa ndị ọ maara ha.

Ha gbasoro chi ndịọzọ bụ ihe efu, si otu a bụrụkwa ihe efu n’onwe ha; site n’iñomi obodo ndị gbara ha gburugburu n’agbanyeghị na Yahweh dọrọ ha aka na ntị ka ha kwụsị ihe ha na-eme.

Maka ihi ya, Yahweh weere ụmụ Izrel nnukwu iwe, chụpụ ha n’ebe ọ nọ. Sọọsọ agbụrụ Juda ka ọ hapụrụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 60:3, 4-5, 12-13

Azịza: Onyenweanyị, zaa anyị oku ma were aka nri gị zọpụta anyị

1. Chineke ị jụla anyị. Ị tikpọọla ebe nchedo anyị

Ị na-eweso anyị iwe; laghachikwute anyị! Azịza

2. I meela ka ala maa jijiji tiwaa abụọ;

ma ugbu a mechikwaa oghere ndị a ọ ka na-agbakwasị;

Ị hapụla ndị nke gị ka ha taa ahụhụ,

mee ka anyị ñụọ mmanya na-egbu anyị egbu. Azịza

3. Chineke, Ị jụla anyị n’ezie?

Ịnakwaghị eso ndịagha anyị eje agha

Nyere anyị aka n’oge ọgbaaghara

enyemaka mmadụ abụghị ihe ọbụla, Azịza

MBEKU – Ps. 130:5

Alleluia, Alleluịa:

Ana m eche Onyenweanyị, mkpụrụobi m na-eche ya, na nkwa ya ka m nwere nchekwube.

Alleluịa

OZIỌMA – 7:1-5

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ekpela mmadụ ibe gị ikpe ka a ghara ikpe gị ikpe. N’ihina otu i siri kpee mmadụ ibe gị ikpe ka a ga-esi kpee gị ikpe. Ihe i jiri tụnyere onye ọzọ, ka a ga-eji tụnyere gị.

Gịnị mere i jiri hụ mpekele ihe dị n’anya nwanne gị, ma ị hụghị ogwe osisi dị n’anya gị onwe gị? Mọbụ kedụ ka ị ga-esi agwa nwanne gị sị, ‘Ka m wepụ gị mkpekele ihe dị gị n’anya’ ebe gị onwe gị bu ogwe osisi n’anya nke gị?

Onye ihuabụọ, buru ụzọ wepụ ogwe osisi dị gị n’anya, ka i wee hụ ụzọ nke ọma iwepụ mpekele ihe dị n’anya nwanne gị.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for June 22 2026, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 9, 2022