Igbo Mass Readings for July 8 2024, Mọnde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 8 2024, Mọnde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:16, 17-18, 21-22
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Hosea
“Ma lee, aga m arara ya, duba ya n’ime ọzara ma were obi nwayọ gwa ya okwu, ọ bụ Yahweh na-ekwu. Ebe ahụ, ọ ga-azakwa m dịka o mere mgbe Ọ bụ agbọghọbịa n’oge ahụ o si n’ala ljipt pụta.
Ma n’ụbọchị ahụ Yahweh na-ekwu ị ga-akpọ m: “Di m,” ị gaghị akpọkwa m “Baal m. Aga m ewere gị ka onye m ga-alụ ebeebe; n’eziomume na n’ikpe nkwụmọtọ na nnukwu ịhụnaanya na n’obi ebere, ebeebe.
Aga m eji nkwụdosiike were gị dịka onye m ga-alụ, mgbe ahụ ị ga-amatakwa Yahweh.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 145:2-3, 4-5, 6-7, 8-9
Azịza: Onyenweanyị bụ onye amara na onye obi ebere
1. Ụbọchị niile, aga m eto gị
aga m eto aha gị ruo mgbe ebighịebi.
Onyenweanyị dị ukwuu kwesịkwa inye otito niile,
ebube ya dị omimi karịkwara nghọta. Azịza
2. Aga m na-eto akaọrụ gị site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ,
na-ekwupụtakwa ọrụ ebube gị
Aga m ekwupụta otito na ebube gị,
aga m atụgharị uche m n’ọrụ ebube gị niile. Azịza
3. Ndị mmadụ ga-ekwupụta maka ike gị dị egwu,
mụ onwe m ga-ekwụsiike banyere ịdị ukwuu nke gị
Ha niile ga-añụrị maka obiọma gị
werekwa ọñụ na-ekwupụta eziomume gị. Azịza
4. Onyenweanyị bụ onye amara na onye obi ebere,
ọ naghị ewe iwe ọsọọsọ o jupụtara n’ịhụnaanya
Onyenweanyị na-egosi mmadụ niile obiọma ya,
ebere nke Onyenweanyị na-erute ihe niile o kere. Azịza
MBEKU – Ps. 119:88
Alleluia, Alleluịa:
Onyenweanyị zọpụta m, ka m wee nwee ike idobe iwu gị.
Alleluịa.
OZIỌMA – 9:18-26
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu ka na-agwa ha ihe ndị a mgbe otu onyeisi ọchịchị bịara sekpuru n’ihu ya, rịọ ya sị, “Ọ dịbeghị anya nwa m nwaanyị nwụrụ, biko bịa bikwasa ya aka, ka ọ dịkwa ndụ ọzọ”.
Jesu biliri kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sobe ya. Mgbe ha na-aga, otu nwaanyị rịarala mbiọbara afọ iri na -abụọ siri n’azụ metụ ọnụ uwe Jesu aka, n’ihina o kwuru n’obi ya sị, “Ọ bụrụ na m metụ naanị uwe ya aka, ahụ ga-adị m mma”.
Mgbe Jesu tụgharịrị hụ nwaanyị ahụ, Ọ sịrị ya, “Obi sie gị ike nwa m nwaanyị, okwukwe gị agwọọla gị”. Ozigbo ahụ, ahụ adị nwaanyị ahụ mma. Mgbe Jesu bịaruru n’ụlọ onye ọchịchị ahụ, ọ hụrụ ndị na-afụ ọja na igwe mmadụ ndị na-atụ ụzụ.
Wee sị ha, “Sinụ ebe a pụọ, n’ihina nwaagbọghọ a anwụghị anwụ, kama ọ na-arahụ ụra”. Ha chịrị ya ọchị. Mgbe a chụpụchara igwe mmadụ ahụ n’ezi, Jesu banyere n’ime ụlọ, jide nwagbọghọ ahụ n’aka, o wee bilie. Akụkọ ihe a Jesu mere gazuru akụkụ ala ahụ niile.
Igbo Mass Readings for July 9 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume
Igbo Mass Readings for July 8 2024, Mọnde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.