Igbo Mass Readings for July 28 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 28 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 32:15-24, 30-34
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ọpụpụ
Mosis wee tụgharịa si n’elu ugwu rịdawa. Ọ bụkwa mbadamba okwute abụọ nke ọgbụgbandụ ahụ, e dechiri ihe ma n’ihu ma n’azụ, n’aka ya. Mbadamba okwute ndị ahụ bụ aka ọrụ Chineke.
Ọ bụkwa Chineke n’onwe ya dere ihe ndị ahụ n’elu okwute ndị a. Mgbe Joshua nụrụ mkpọtụ ụmụ Izrel na-eme, ọ sịrị Mosis, “Ana m anụ mkpọtụ agha n’ogige ụmụ Izrel”.
Mosis zara ya sị, “Mana ọ bụghị mkpu ọñụ nke mmeri mọbụ akwa nke ndị e meriri emeri ka m na-anụ, kama ọ bụ ụda olu ukwe”.
Ozigbo Mosis rutere nso n’ogige ụmụ Izrel hụ nwa ehi ahụ a kpụrụ akpụ na ka ha na-agbara ya egwu, nnukwu iwe were ya nke na ọ tụpụrụ mbadamba okwute abụọ ahụ n’ukwu ugwu ahụ.
Ha wee darisie. Ọ kpọrọ nwa ehi ahụ ha kpụrụ akpụ ọkụ, gwerichaa ya ka ntụ, fesaa ya n’elu mmiri nke o mere ka ụmụ Izrel ñụọ. Mosis jụrụ Erọn sị: “Gịnị ka ndị a mere gị i jiri bukwasị ha nnukwu ihe ọjọọ nke a?”
Erọn zara ya sị, “Biko nna m ukwu, iwe gị adịla ọkụ, gị onwe gị makwa na ọ naghị ara ndị a ahụ ime ihe ọjọọ. Ha gwara m sị, “Meere anyị chi ndị ga-ebutere anyị ụzọ n’ihina anyị amakwaghị ihe ji Mosis mọbụ ebe ọ nọ bụ onye ahụ siri n’ala ljipt dupụta anyị’.
Azara m ha sị: ‘Ngwa, onye ọbụla n’ime ụnụ nwere ọlaedo nyapụta ya’. Ha nyechara m ha, m tụnye ha n’ime ọkụ, nwa ehi a wee pụta”. Ka chi bọrọ, Mosis gwara ụmụ Izrel sị, ‘Ụnụ emeela nnukwu njọ.
Ugbu a aga m agakwuru Yahweh ikekwe, aga m arịọtara ụnụ mgbaghara n’aka ya”. Mosis wee gakwuru Yahweh ọzọ sị ya, “Biko, n’ezie, ndị a emeela nnukwu njọ site n’ịkpụrụ onwe ha chi ọlaedo.
Ugbu a, ana m arịọ gị ka ị gbaghara ha, ma ọ bụrụ na ị gaghị agbaghara ha njọ a, ka i si n’akwụkwọ ahụ i dere kachapụ aha m”.
Mana Yahweh zara ya sị, “Sọọsọ onye ahụ mejọrọ m ka m ga-esi n’akwụkwọ m kachapụ. Mana gawa ugbu a ka i duruo ụmụ Izrel ebe ahụ mụ gwara gị, lee mmụọozi m ga-ebutere gị ụzọ. Ka o sila dị, n’ụbọchị m ga-abịakwute ha, aga m ata ha ahụhụ njọ a”.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 106:19-20, 21-22, 23
Azịza: Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihina ọ dị mma.
1. Ha kpụrụ nwa ehi na Horeb.
Ha kpọrọ isi ala nye arụsị a pịrị apị,
si otu a were ebube na otito dịịrị Chineke,
nye onyinyo chi na-ata ahịhịa.
Azịza: Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihina ọ dị mma.
2. Ha chefuru Chineke nke zọpụtara ha,
onye nke rụrụ ọrụ dị egwu n’ala ljipt.
Onye nke rụrụ ọrụ ịtụnaanya n’ala ljipt,
na ihe na-atụga egwu n’osimiri uhie.
Azịza: Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihina ọ dị mma.
3. Ya mere o jiri chee echiche ikpochapụ ha,
Ọ gaara eme nke a, ma a si na Mosis,
onye nke ọ họtara anọchịghị n’etiti ha
wee medaa iwe ya dị ọkụ.
Azịza: Nyenụ Onyenweanyị ekele n’ihina ọ dị mma.
MBEKU – Ps. 19:9
Alleluia, Alleluia:
Iwu nke Onyenweanyị na-enye obi añụrị, Iwu nke Onyenweanyị bụ ihe eji ahụ ụzọ.
Alleluia.
OZIỌMA – 13:31-35
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwakwara oke igwe mmadụ ahụ okwu ọzọ n’ụkabụilu sị, “Alaeze eluigwe dịka mkpụrụ osisi mọstad nke otu nwoke kụrụ n’ubi ya.
Mkpụrụ ahụ dị nta karịa mkpụrụ osisi niile; ma mgbe o tochara ọ na-akacha osisi niile. N’ihi nke a, ụmụnnụnụ nke eluigwe na-abịa, kpaa akwụ ha n’alaka ya”.
Ọ gwakwara ha okwu ọzọ n’ụkabụilu sị, “Alaeze eluigwe dịka ihe na-eko achịcha, nke nwaanyị na-eme achịcha weere gwakọta ya na-akpa ntụ ọka atọ, ruo mgbe ha koro.
Jesu jiri ụkabụilu gwa igwe mmadụ niile ihe ndị a. N’ezie, o nweghị okwu ọbụla ọ gwara ha n’ejighị ụkabụilu.
Nke a bụ iji mejupụta ihe onye amụma kwuru sị ‘Aga m eji ụkabụilu gwa ha okwu, aga m ekpughe ihe e zoro ezo site na mbido nke ụwa.
Igbo Mass Readings for July 29 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for July 28 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.