Igbo Mass Readings for July 29 2024, Mọnde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 29 2024, Mọnde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 13:1-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jeremaya

Osebụrụwa gwara m sị, “Gaa ka ị zụta akwa a na-awa n’ukwu, kee ya n’ukwu gị, emesakwala ya mmiri. Azụrụ m ihe a dịka Yahweh siri kwuo ma warakwa ya n’ukwu.

Okwu nke Yahweh bịakwutere m nke ugboro abụọ, Were akwa a na-awa n’ukwu nke ị zụrụ, nke ahụ ị wakwa n’ukwu gị, bilie, gaa na Yufretes dịka Yahweh siri kwuo.”

Mgbe mkpụrụ ụbọchị olemaole gachara, Yahweh gwara m sị, “Bilie gaa na Yufretes ma werekwa akwa ahụ a na awa n’ukwu nke m gwara gị ka ị zoo ebe ahụ.”

M were gaghachi Yufretes werekwa akwa ahụ ebe m zoro ya, ma lee, akwa ahụ emebiela ọ dịghịzi mma ọbụla. Okwu nke Chineke bịakwutere m sị, “Otu a ka m ga-esi mebie ngala Juda ya na nke Jerusalem.

Ndị ọjọọ a, ndị nke jụrụ ịnụ olu m, ndị kpọchiri obi ha na-efe chi ndịọzọ, ha ga-adị ka akwa ahụ a na-awa n’ukwu enweghị uru ọ bara.

Dịka akwa ahụ a na-awa n’ukwu si atapara n’ahụ, otu a ka m si eme ezinụụlọ nke Izrel na nke Juda ka ha bịakwute m, bụrụ ndị nke m, otito m, ugwu m na ndị m ji anya isi, ma ha egeghị ntị,” ọ bụ Yahweh na-ekwu.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Deut 32:18-19, 20, 21

Azịza: Ụnụ chefuru Chineke onye nke bụ Nna ụnụ.

1. Ụnụ chefuru Nkume kpụrụ ụnụ

Chineke onye nke bụ Nna ụnụ

Yahweh hụrụ nke a, wee iwe

Chụpụ ụmụ ya ndị nwoke na ndị nwaanyị. Azịza

2. Ọ sịrị, Agaghị m enyere ha aka ọzọ

Ka m hụ ihe ha ga-abụ n’ikpeazụ

Ọgbọ isiike

nke na-ekwesịghị ntụkwasịobi. Azịza

3. Ha jiri ife arụsị kpalie ekworo m

Site n’ime ya kpasuo m iwe.

Aga m eji mba dị ala kpalie ekworo ha

Werekwa mba nzuzu kpasuo ha iwe. Azịza

MBEKU – Ps. 19:9

Alleluia, Alleluia:

Iwu nke Onyenweanyị na-enye obi añụrị, Iwu nke Onyenweanyị bụ ihe eji ahụ ụzọ.

Alleluia.

OZIỌMA – 13:31-35

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwakwara oke igwe mmadụ ahụ okwu ọzọ n’ụkabụilu sị, “Alaeze eluigwe dịka mkpụrụ osisi mọstad nke otu nwoke kụrụ n’ubi ya.

Mkpụrụ ahụ dị nta karịa mkpụrụ osisi niile; ma mgbe o tochara ọ na-akacha osisi niile. N’ihi nke a, ụmụnnụnụ nke eluigwe na-abịa, kpaa akwụ ha n’alaka ya”.

Ọ gwakwara ha okwu ọzọ n’ụkabụilu sị, “Alaeze eluigwe dịka ihe na-eko achịcha, nke nwaanyị na-eme achịcha weere gwakọta ya na-akpa ntụ ọka atọ, ruo mgbe ha koro.

Jesu jiri ụkabụilu gwa igwe mmadụ niile ihe ndị a. N’ezie, o nweghị okwu ọbụla ọ gwara ha n’ejighị ụkabụilu.

Nke a bụ iji mejupụta ihe onye amụma kwuru sị ‘Aga m eji ụkabụilu gwa ha okwu, aga m ekpughe ihe e zoro ezo site na mbido nke ụwa.

Igbo Mass Readings for July 30 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for July 29 2024, Mọnde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 10, 2022