Igbo Mass Readings for July 15 2024, Mọnde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 15 2024, Mọnde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:10-17

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Isaiah

Ugbu a, nụrụnụ okwu nke Yahweh, ụnụ ndị ọchịchị Sodọm! Geenụ ntị na nkuzi nke Chineke anyị ụnụ ndị obodo Gomora! Yahweh kwuru sị, kedụ ụrụ aja niile ndị a ụnụ na-achụnyere m baara m?

Aja nsureọkụ nke ebule na abụba nwa ehi ndị a ụnụ na-achụnyere m ejula m; achọkwaghị m ha ọzọ! Ihe na-atọ m ụtọ abụghị ọbara anụ ehi; ọbara nke atụrụ mọbụ nke mkpị.

Mgbe ụnụ bịara ife m ofufe, onye gwara ụnụ ka ụnụ metọchaa ụlọnsọ m? Ụnụ ebutezirila m onyinye na enweghị isi, mgbaisọma ụnụ na-achụnyere m bụzi arụ n’ebe m nọ.

Mmemme ọnwa ọhụrụ ụnụ, Sabat na ọgbakọ nsọ ụnụ niile agwụla m ike. Agaghị m edili arụ ụnụ na-akpa na nnukwu mmemme ụnụ.

Mmụọ m kpọrọ emume ọnwa ọhụrụ na mmemme ụnụ dị icheiche asị; Ha abụrụla m nnukwu ibu arọ; ike agwụkwala m idi ha. Mgbe ọbụla ụnụ gbasara aka n’ekpere, agaghị m ele ụnụ anya;

Ọ bụrụgodụ na ụnụ ekpee ọtụtụ ekpere, agaghị m ege ntị n’ihina aka ụnụ jupụtara n’ọbara. Sachaanụ onwe ụnụ, meenụ onwe ụnụ ka ọ dị ọcha;

Wepụnụ ajọomume ụnụ n’ihu m, kwụsịnụ ime njọ. Mụtanụ ka e si eme eziomume, na-achọkwanụ ikpe nkwụmọtọ; Kwụsịnụ mmegbu, chekwabanụ ụmụ ogbenye, na-ekwuchiterenụ ụmụnwaanyị ajadụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 50:8-9, 16-17, 21

Azịza: Aga m egosi nzọpụta nke Chineke n’ebe ndị eziomume nọ

1. Ọ bụghị n’ihi aja ụnụ ka m ji wee na-abara ụnụ mba,

aja nsureọkụ ụnụ nọ n’ihu m oge niile;

agaghị m anabata oke ehi ọbụla nke si n’ụlọ ụnụ,

ma-ọbụ ewu ọbụla nke si n’ụlọanụ ụnụ. Azịza

2. Kedụ ikikere ụnụ nwere iji na-agụgharị iwu m,

iji na-ekwupụta maka ọgbụgbandụ m?

N’ihina ụnụ jụrụ ịnabata nkuzi m,

ma leghara okwu m anya. Azịza

3. Ụnụ na-eme nke a chee na m ga-agba nkịtị?

Ụnụ chere na m dịka ụnụ?

Ugbu a aga m abara ụnụ mba

aga m eme ka o doo ụnụ anya.

Onye ọbụla na-achụnyere m aja ekele na asọpụrụ m

Ma aga m egosi nzọpụta nke Chineke

n’ebe ndị eziomume nọ. Azịza

MBEKU – 1 Thes 2:13

Alleluia, Alleluia:

Mgbe ụnụ nụrụ okwu Chineke nke anyị wetaara ụnụ, ụnụ naara ya, ọ bụghị dịka okwu mmadụ kama dịka ihe ọ bụ n’onwe ya, okwu nke Chineke.

Alleluia.

OZIỌMA – 10:34-11:1

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Jesu gwara ndị ụmụazụ ya iri na abụọ sị, Ụnụ echela na abịara m iweta udo n’elu ụwa, abịaghị m iweta udo kama mmaagha.

N’ihina abịara m ime ka nwa nwoke megide nna ya, nwa nwaanyị megide nne ya, ka nwunye nwa megide nne dị ya. Ndị iro mmadụ ga-abụkwa ndị ezinụụlọ ya.

Onye ọbụla na-ahụ nna mọbụ nne ya n’anya karịa m, etosịghị ịbụ onye na-eso ụzọ m. Onye ọbụla na-ahụ nwa ya nwoke mọbụ nwa ya nwaanyị n’anya karịa m, etosịghị ịbụ onye na-eso ụzọ m; ọzọkwa, onye ọbụla na-eburughị obe ya so m n’azụ etosịghị m.

Onye ọbụla na-achọ ndụ ya ga-atụfu ya, ma onye ọbụla tụfuru ndụ ya n’ihi m ga-achọta ya. “Onye nabatara ụnụ nabatara m, onye nabatara m nabatara onye ahụ nke zitere m.

Onye ọbụla nabatara onye amụma n’ihina ọ bụ onye amụma, ga-anata ụgwọ ọrụ nke onye amụma. Onye ọbụla nabatara onye eziomume n’ihina ọ bụ onye eziomume ga-anata ụgwọ ọrụ nke onye eziomume.

Ọzọkwa, onye ọbụla nke ga-ekunye otu n’ime ndị a na-eso ụzọ m ọ bụladị otu iko mmiri ọñụñụ n’ihina ọ bụ onye na-eso ụzọ m, aghaghị ịnata ụgwọ ọrụ ya.

Mgbe Jesu kuzichaara ndị na-eso ụzọ ya ihe ndị a. O siri n’ebe ahụ pụọ jee ikuzi nkuzi n’ekwusa okwu Chineke n’obodo niile dị ebe ahụ.

Igbo Mass Readings for July 16 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume

Igbo Mass Readings for July 15 2024, Mọnde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume

Last Update: September 10, 2022