Igbo Mass Readings for August 14 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 14 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 10:12-22

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Diuterọnọmi

Mosis gwara ụmụ Izrel sị: “Ma ugbu a, ụmụ Izrel! Gịnị ka Yahweh bụ Chineke ụnụ chọrọ n’aka ụnụ? Ihe Ọ chọrọ bụ ka ụnụ fee ya meekwa ihe niile O nyere n’iwu.

Ọ chọrọ ka ụnụ hụ ya n’anya, ka ụnụ were obi ụnụ niile na mmụọ ụnụ niile, fee ya. Ka ụnụ dobe iwu ya niile m na-enye ụnụ taa maka ọdịmma nke ụnụ.

N’ezie eluigwe kachasị dị elu bụ nke Chineke; ụwa na ihe niile dị n’ime ya bụkwa nke ya. Ma ọ bụ maka ịhụnaanya Chineke nwere n’ebe nna-nna ụnụ ha nọ ka o jiri họrọ ụnụ bụ ụmụụmụ ha n’etiti mba niile ka ụnụ bụrụ ndị nke ya, nke ụnụ bụkwa ruo taa.

Ya mere site ugbu a gaba wedatanụ onwe ụnụ ruwere Yahweh isi. Ụnụ emekwarala ya isiike ọzọ. N’ihina Yahweh bụ Chineke ụnụ bụ chi nke kachasị chi niile na eze kachasị eze niile.

Ọ bụ Chineke ukwu, onye dị ike na onye a na-atụ egwu ya. Ọ naghị asọ mmadụ anya n’ikpe. Ọ naghịkwa anara ngarị. Ọ na-ahụrịrị na nwamgbenye na nwaanyị ajadụ nwetara ikpe ziri ezi.

Ọ na-ahụkwa ndị ọbịa n’anya, na-enyekwa ha nri na uwe. Na-ahụnụ ndị ọbịa n’anya n’ihina ụnụ bụbu ndị ọbịa n’ala ljipt. Tụọnụ egwu Yahweh, bụ Chineke ụnụ.

Fekwaanụ naanị ya. Kwesienụ ike na ya. Werekwanụ naanị aha ya na-añụ iyi. Toonụ aha ya n’ihina ya onwe ya bụ Chineke ụnụ onye rụụrụ ụnụ ọrụ ịtụnaanya ndị a nke ụnụ jiri anya ụnụ hụ.

Mgbe nnanna ụnụ ha gara ljipt, ha dị naanị mmadụ iri asaa. Ma ugbu a, Yahweh bụ Chineke ụnụ emeela ka ụnụ baa ụba mmadụ dị ọtụtụ dịka kpakpando nke dị na mbara igwe.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 147:12-13, 14-15, 19-20

Azịza: Jerusalem! too Onyenweanyị

1. Jerusalem too Onyenweanyị

Zayọn too Chineke gị

N’ihina ọ bụ ya mere ọnụụzọ ama gị niile ka ha sie ike

Ọ na-agọzi ụmụ gị niile. Azịza

2. Ọ na-enye gị udo n’oke ala gị niile

Ọ na-eji ọka nke kacha mma azụ gị nri.

Ọ na-etiri ụwa iwu

okwu ya agazuo ụwa niile ọsọọsọ. Azịza

3. Ọ na-ekpughere ụmụ Jekọb okwu ya

na-egosịkwa ụmụ Izrel iwu ya na ikpe ya

Ọ naghị emere mba ndịọzọ otu a

Ọ naghị akụziri ha iwu ya. Azịza

MBEKU – 2 Thes 2:14

Alleluia, Alleluia:

Site n’oziọma anyị, Chineke kpọrọ ụnụ ka ụnụ wee nweta otito nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi.

Alleluia.

OZIỌMA – 17:22-27

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Ma mgbe ha gbakọrọ na Galili, Jesu gwara ha sị, “A ga-aranye Nwa nke mmadụ n’aka ndị mmadụ. Ha ga-egbu ya, ma n’ụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si n’ọnwụ bilie.”

Nke a wutere ha nke ukwuu. Oge ha rutere na Kapanaum, ndị ọnaụtụ ọkara Shekel gakwuuru Pita jụọ ya sị “Ọ bụ na Nna ụnụ ukwu anaghị atụ ụtụ ụlọnsọ?”

Pita zara ya sị “Ọ na-atụ.” Mgbe Pita batara n’ụlọ, Jesu buru ụzọ jụọ ya sị, “Gịnị ka I chere, Saịmọn? Ole ndị ka ndịeze nke ụwa a na-ana ụtụ ahịa mọbụ ụtụ isi?

Ọ bụ ụmụ ha ka ọ bụ ndị ọbịa?” Mgbe Pita zara ya sị, “Ọ bụ ndị ọbịa.” Jesu sịrị ya, “Ọ dị mma, iwu a ejighị ndị bụ ụmụ.

Ma ka anyị ghara ịkpasu ha iwe, gaa n’osimiri tụnye nkoazụ gị; were azụ nke ọbụla buru ụzọ banye na nko gị. Mgbe I meghere ọnụ azụ ahụ Ị ga ahụ otu Shekel, were ya nye ha maka mụ na gị.”

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for August 14 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 11, 2022