Igbo Mass Readings for June 19 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 19 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:1-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pọl Degaara ndị Kọrịnt
Ebe anyị na Chineke na-arụkọ ọrụ, anyị na-arịọ ụnụ ka ụnụ ghara ịnabata amara Chineke dịka ihe efu. N’ihina o kwuru sị, “N’oge nnabata anụrụ m olu ụnụ, N’ụbọchị nzọpụta enyekwaara m ụnụ aka”. Lee, ugbu a bụ oge nnabata, ugbu a bụkwa oge nzọpụta ahụ.
Anyị adịghị etinye ihe mgbochi n’ụzọ onye ọbụla ka ndị mmadụ ghara ikwutọ ije ozi anyị. Ma dịka ndị na-ejere Chineke ozi, anyị na-eme ka ndụ na omume anyị bụrụ ihe atụ: anyị na-enwe ogologo ntachịobi n’ime oke mkpagbu niile, n’ime ihe isi ike nile, n’ime oke ahụhụ niile.
Ọtụtụ mgbe ndị mmadụ mere ka ọgbaaghara dị n’obodo n’ihi anyị, tie anị ihe, tụba anyị n’ụlọmpkọrọ, anyị dọgburu onwe anyị n’ọrụ, nọdụ na nche, buo ọnụ ọtụtụ mgbe.
Anyị mekwara nke a site na ndụ ịdị ọcha nke anyị na-ebi, site n’ịghọta ihe ọmụma, site n’ogologo ntachịobi nke anyị nwere, site n’inwe obiọma na ezi ịhụnaanya n’ebe mmadụ niile nọ, na site n’ike Mmụọ Nsọ, sitekwa n’ikwu eziokwu na site n’ike nke Chineke.
Anyị buuru eziomume dịka ngwaagha n’aka nri na n’aka ekpe, ụfọdụ na-asọpụrụ anyị, ma ụfọdụ na-akparị anyị, ụfọdụ na-akpọ anyị aha ọjọọ ebe ndịọzọ na-akpọ anyị aha ọma.
Ụfọdụ na-akpọ anyị ndị nduhie ma anyị bụ ndị eziokwu. Anyị dịka ndị a maghị mana anyị bụ ndị a ma nke ọma; ụfọdụ mmadụ na-agụnye anyị dịka ndị na-anwụ anwụ, ma anyị dị ndụ, a tara anyị ahụhụ, mana anyị; anwụghị; anyị na ahụ ihe mwute dị icheiche, ma anyị na añụrị ọñụ mgbe niile, anyị na ejegharị ka ụmụ ogbenye, ma anyị na-eme ọtụtụ mmadụ ka ha bụrụ ọgaranya, anyị na-eme ka ndị enweghị ihe ọbụla, ma anyị nwezuru ihe niile.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 98:1, 2-3, 3-4
Azịza: Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya
1. Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,
n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube,
aka nri ya na aka ya dị nsọ
eweterela ya mmeri. Azịza
2. Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya,
o meela ka mba mile mata eziomume ya
O chetala ịhụnaanya ya na ịkwụdosiike ya
n’ebe ezinụụlọ Izrel nọ. Azịza
3. Akụkụ ụwa niile
ahụla nzọpụta nke Chineke anyị,
ụwa nile tierenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ,
werenụ ukwe na mkpu ọñụ too ya. Azịza
MBEKU – Ps. 95:8
Alleluia, Alleluịa:
Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 15:38-42
Ihe Ọgugụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ụnụ anụla na e kwuru sị, ‘Anya laara anya; eze laara eze. Ma ana m agwa ụnụ; ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi mmadụ ọbụla ihe ọjọọ o mere ụnụ.
Ọ bụrụ na mmadụ ama gị ụra na ntị akanri, tụgharịara ya ntị akaekpe. Ọ bụrụ na mmadụ agbaa gị akwụkwọ ka ọ nara gị uwe mkpuchi gị, hapụkwara ya uwe mwụda gị.
Ọ bụrụ na onye ọbụla amanye gị ka i jee otu nzọụkwụ, soro ya jee nzọụkwụ abụọ. Nyee onye ọbụla rịọrọ gị ihe, agbakụtakwala onye ọbụla chọrọ ibiri gị ihe azụ.
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.