Igbo Mass Readings for June 17 2024, Mọnde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 17 2024, Mọnde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 21:1-16
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke mbụ nke Ndịeze
Nabọt onye Jezril nwere ubi vaịn na Jezril n’akụkụ ụlọ Ahab, eze Samerịa. Ahab gwara Nabọt sị, “nye m ubi vaịn gị ka m wee ya mere ubi akwụkwọ nri m, ebe ọ bụ na ọ dị nso n’ụlọ m, aga m enye gị ubi vaịn ka ya mma, mọbụ ọ masị gị, aga m akwụgị ihe ọ dara n’ego.”
Nabọt zara Ahab sị, “Chineke ekwekwala ka m nye gị ihe nnanna m ha. Ahab ji ihu mgbarụ na iwe laa n’ụlọ ya, n’ihi ihe Nabọt onye Jezril sara ya sị. “Agaghị m enye gị oke si n’aka nnanna m ha rute m aka.”
O dinara n’akwa ya, tụfuo ihu ya jụkwa iri ihe ọbụla. Nwunye ya Jezibel bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị bụ iwe gị nke na ị naghịkwa eri ihe?”
Ma ọ zara ya sị, “Agwara m Nabọt onye Jezril ka o resị m ubi vaịn ya, mọbụ ọ bụrụ na ọ ka masị ya, ka m nye ya ọzọ maka ya.
Ma ọ zara m sị, “agaghị m enye gị ubi vaịn mụ.” Mgbe ahụ ka nwaanyị ya Jezibel ji sị ya: “Ọ bụ na ọ bụghị gị na-achị Izrel? Bilie rie nri, gbasapụ ihu aga m enye gị ugbo vaịn Nabọt onye Jezril ahụ.”
Ọ bịara dee akwụkwọozi n’aha Ahab, were akara e jiri mara ya bụ eze suchie ọnụ ha.
O zigaara ya ndị okenye na ndị nwere agba n’obodo Nabọt. Ihe o dere n’akwụkwọozi ndị a bụ, “kpọọnụ oku maka ebumọnụ ma guzobenụ Nabọt n’ebe pụtara ihe n’etiti ọha mmadụ.
N’ebe ahụ ụnụ ga-edunyere ya ndị efulefu abụọ ka ha boo ya ebubo sị, “Ị kpọọla Chineke na eze iyi Kpụpụzienụ ya ezi were okwute tụgbuo ya.”
Ndị obodo ya ahụ, ndị okenye na ndị niile nwere agba na ya mere dịka Jezibel si deere ha n’akwụkwọozi. Ha kpọrọ oku ebumọnụ bịa guzobe Nabọt n’ebe pụtara ihe n’etiti ọha mmadụ obodo ahụ.
Ndị efulefu abụọ kwụụrụ n’ihu Nabọt boo ya ebubo n’ihu ọha mmadụ sị, “Nabọt ekwutọọla Chineke na eze anyị.” Ha kpọpụrụ ya n’obodo ahụ were okwute tụgbuo ya.
Ha zigakwaara Jezibel ozi sị, “A tụgbuola Nabọt n’okwute, ọ nwụọla.” Mgbe Jezibel nụrụ na atụgbuola Nabọt n’okwute, ọ sị Ahab, “Kulie, gaa were ubi vaịn ahụ Nabọt onye Jezril jụrụ iresị gị n’ihina Nabọt adịghịkwa ndụ, ọ nwụọla. Ozigbo Ahab nụrụ na Nabọt anwụọla o kuliri ịga n’ubi Nabọt onye Jezril iweghara ya ka oke ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 5:2-3,5-6, 7
Azịza: Onyenweanyị, gee ntị n’akwa enyemaka m.
1. Osebụrụwa gee m ntị,
Chee echiche maka ọsụ m na-ama.
Gee ntị n’akwa enyemaka m
Ị bụ Eze m na Chineke m! Azịza
2. Ọ bụ gị ka m na-arịọ, Osebụrụwa
n’ihina oge chi bọrọ Ị na-ege m ntị;
Ndị na-anya isi anaghị akwụdosi ike n’ihu gị.
Ị na-akpọ ndị ajọ mmadụ niile asị,
na-ekpochapụ ndị ụgha.
Onyenweanyị na-akpọ ndị na-egbu mmadụ
na ndị aghụghọ asị. Azịza
MBEKU – Ps. 95:8
Alleluia, Alleluịa:
Taa, ọ bụrụ na ụnụ anụ olu ya, ụnụ akpọchila obi ụnụ.
Alleluia.
OZIỌMA – 15:38-42
Ihe Ọgugụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ụnụ anụla na e kwuru sị, ‘Anya laara anya; eze laara eze. Ma ana m agwa ụnụ; ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi mmadụ ọbụla ihe ọjọọ o mere ụnụ.
Ọ bụrụ na mmadụ ama gị ụra na ntị akanri, tụgharịara ya ntị akaekpe. Ọ bụrụ na mmadụ agbaa gị akwụkwọ ka ọ nara gị uwe mkpuchi gị, hapụkwara ya uwe mwụda gị.
Ọ bụrụ na onye ọbụla amanye gị ka i jee otu nzọụkwụ, soro ya jee nzọụkwụ abụọ. Nyee onye ọbụla rịọrọ gị ihe, agbakụtakwala onye ọbụla chọrọ ibiri gị ihe azụ.
Igbo Mass Readings for June 18 2024, Tuzde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
Igbo Mass Readings for June 17 2024, Mọnde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.