Igbo Mass Readings for June 9 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 9 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi nke abụọ Pọl degaara ndị Kọrịnt

Pọl, onyeozi nke Jesu Kristi dịka ọchịchọ nke Chineke si dị, na Timoti nwanne anyị nwoke, na-edegara nzukọ Chineke nke dị na Kọrịnt, na ndị nsọ niile ndị nọ n’ala Akaya akwụkwọ.

Ka amara na udo nke si n’aka Chineke Nna anyị na Dinwenụ anyị Jesu Kristi dịrị ụnụ. Ekele dịrị Chineke na Nna nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi, Nna onye ebere niile na onye ntasịobi, onye na-atasi anyị obi na mkpagbu anyị niile, ka anyị wee nwee ike ịtasi ndị ọzọ nwere mkpagbu obi site na ntasiobi ahụ anyị natara n’aka Chineke.

Ka anyị si keta oke n’ahụhụ Kristi, otu a ka anyị ga-esikwa keta oke na ntasiobi Kristi. Ọ bụrụ na anyị nọ na nsobgu, ọ bụ maka ọdịmma na nzọpụta ụnụ.

Ọ bụrụkwa na a gbara anyị ume, ọ bụ maka ntasiobi ụnụ nke pụtara ihe mgbe ụnụ weere ndidi nara ụdị ahụhụ ahụ anyị naara.

Nchekwube anyị nwere n’ebe ụnụ nọ siri ike, ebe anyị maara na dịka ụnụ si eketa oke n’ịta ahụhụ anyị ahụ, otu ahụkwa ka ụnụ ga-esi keta oke na ntasiobi ahụ anyị na-anata.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 34: 1-2,3-4, 5-6,,8-9

Azịza: Detu ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma!

1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile,

Otito ya ga-adị n’egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla.

Mkpụrụobi m na-egori n’Onyenweanyị

ka ndị umeala nụrụ ma ñụrịa.

Azịza: Detu ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma!

2. Soronụ m kwupụta ịdịukwu nke Onyenweanyị,

soronụ m too aha ya.

Akpọkuru m Onyenweanyị, Ọ za m,

Ọ zọpụtara m n’egwu niile na-atụ m.

Azịza: Detu ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma!

3. Ihu ọbụla chere n’ebe Onyenweanyị nọ na-amụke amụke.

Ihere anaghị eme ya ma ọlị.

Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye,

Ọ na-enyekwara ya aka na nsogbu ya niile.

Azịza: Detu ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma!

4. Mmụọọma nke Onyenweanyị na-eche ndị na-atụ ya egwu nche,

Ọ na-azọpụta ha;

Detu ire ka ị hụ ka Onyenweanyị sị dị mma!

Añụrị na-adịrị onye gbabara n’Onyenweanyị.

Azịza: Detu ire ka ị hụ ka Onyenweanyị si dị mma!

MBEKU – Matiu 4:14

Alleluia, Alleluia:

Ọ bụghị naanị site na nri ka mmadụ si adị ndụ, kama site n’okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta.

Alleluia.

OZIỌMA – 5:1-12

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Ka Jesu hụrụ igwe mmadụ ahụ, Ọ rịgooro n’elu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ malitere ịkụziri ha sị: “Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ, n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha.

Ngọzi na-adịrị ndị na-eru ụjụ, n’ihina a ga-akasi ha obi, Ngọzi na-adịrị ndị dị nwaayọ n’obi, n’ihina ha ga-eketa ụwa, Ngọzi na-adịrị ndị agụụ eziomume na-agụ, n’ihina a ga-enyeju ha afọ, Ngọzi na-adịrị ndị obi ebere n’ihina a ga-emere ha ebere,

Ngọzi na-adịrị ndị dị ọcha n’obi, n’ihina ha ga-ahụ Chineke anya, Ngọzi na-adịrị ndị na-achọ udo n’ihina a ga-akpọ ha ụmụ Chineke, Ngọzi na-adịrị ndị niile a na-emegbu n’ihi eziomume, n’ihina alaeze eligwe bụ nke ha,

Ngọzi na-adịrị ụnụ mgbe ndị mmadụ na-akọcha ụnụ, na-emegbu ụnụ, na-ekwukwa okwu asị ọjọọ niile dị icheiche megide ụnụ n’ihi m.

Ñụrịanụ ọñụ, nwekwaanụ obi ụtọ, n’ihina ụgwọ ọrụ ụnụ buru ibu n’eluigwe maka na otu a ka ha siri megide ndị amụma buru ụnụ ụzọ bịa.

Igbo Mass Readings for June 10 2025, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for June 9 2025, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.