Igbo Mass Readings for June 8 2026, Mọnde Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 8 2026, Mọnde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:1-6

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ nke Mbụ nke Ndịeze

N’oge a Elaịja onye Tishbe nke nọ na Giled gwara Ahab sị, “Ka Yahweh Chineke nke Izrel dị ndụ, onye m na-efe, igirigi agaghị ada nke mmiri ga-ezo n’afọ ndị a na-abịanụ ma ọ bụrụ na m ekwugharịghị ya.”

Onwetere okwu nke Chineke nke sị, “Si ebe a bilie, chewe ihu n’ọwụwa anyanwụ, gaa zoo onwe gị n’akụkụ Kerit nke dị n’ọwụwa anyanwụ Jọdan.

Enyele m ụmụnnụnụ iwu ka ha na-ebutere gị nri, ebe ị ga na-añụ mmiri bụ nke iyi ntakịrị ahụ. O mere ka Chineke siri gwa ya. Ọ gara biri n’akụkụ Kerit, iyi ntakịrị ahụ dị n’ọwụwa anyanwụ Jọdan.

Ụmụnnụnụ na-ebutere ya achịcha na anụ, ụtụtụ na mgbede; ọ na-añụkwa mmiri iyi ntakịrị ahụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 121: 1-2, 3-4, 5-6, 7-8

Azịza: Enyemaka anyị na-esi n’aka Onyenweanyị, onye mere eluigwe na ala

1. Ewelitere m anya m n’eluiigwu,

kedụ ebe enyemaka m ga-esi abịa?

Enyemaka m na-esi n’aka Onyenweanyị,

onye mere eluigwe na ala.

Azịza: Enyemaka anyị na-esi n’aka Onyenweanyị, onye mere eluigwe na ala

2. Ọ gaghị ekwe ka ihe ọbụla mee gị

n’ihina onye nche gị anaghị arahụ ụra.

Lee onye nche nke Izrel

anaghị ehi ụra nke ọ na-ekwo ụra.

Azịza: Enyemaka anyị na-esi n’aka Onyenweanyị, onye mere eluigwe na ala

3. Osebụrụwa bụ onye na-eche gị

Ọ nọ n’akụkụ gị na-echekwaba gị

Anyanwụ agaghị achagbu gị n’ehihie,

nke ọnwa na-etigbu gị n’abalị.

Azịza: Enyemaka anyị na-esi n’aka Onyenweanyị, onye mere eluigwe na ala

4. Osebụrụwa ga-echedo gị n’ihe ọjọọ niile

Ọ ga-echekwa ndụ gị.

Osebụrụwa ga-echedo ọpụpụ gị na mbata gị,

bido ugbu a ruo mgbe ebighịebi.

Azịza: Enyemaka anyị na-esi n’aka Onyenweanyị, onye mere eluigwe na ala

MBEKU – Matiu 4:14

Alleluia, Alleluia:

Ọ bụghị naanị site na nri ka mmadụ si adị ndụ, kama site n’okwu ọbụla nke si n’ọnụ Chineke pụta.

Alleluia.

OZIỌMA – 5:1-12

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Ka Jesu hụrụ igwe mmadụ ahụ, Ọ rịgooro n’elu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ malitere ịkụziri ha sị: “Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ, n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha.

Ngọzi na-adịrị ndị na-eru ụjụ, n’ihina a ga-akasi ha obi, Ngọzi na-adịrị ndị dị nwaayọ n’obi, n’ihina ha ga-eketa ụwa, Ngọzi na-adịrị ndị agụụ eziomume na-agụ, n’ihina a ga-enyeju ha afọ,

Ngọzi na-adịrị ndị obi ebere n’ihina a ga-emere ha ebere, Ngọzi na-adịrị ndị dị ọcha n’obi, n’ihina ha ga-ahụ Chineke anya, Ngọzi na-adịrị ndị na-achọ udo n’ihina a ga-akpọ ha ụmụ Chineke,

Ngọzi na-adịrị ndị niile a na-emegbu n’ihi eziomume, n’ihina alaeze eligwe bụ nke ha, Ngọzi na-adịrị ụnụ mgbe ndị mmadụ na-akọcha ụnụ, na-emegbu ụnụ, na-ekwukwa okwu asị ọjọọ niile dị icheiche megide ụnụ n’ihi m.

Ñụrịanụ ọñụ, nwekwaanụ obi ụtọ, n’ihina ụgwọ ọrụ ụnụ buru ibu n’eluigwe maka na otu a ka ha siri megide ndị amụma buru ụnụ ụzọ bịa.

Igbo Mass Readings for June 9 2026, Tuezde n’ime Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Igbo Mass Readings for June 8 2026, Mọnde Izuụka nke Iri N’Oge Adanyeghị n’Emume.