Igbo Mass Readings for April 29 2024, Mọnde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for April 29 2024, Mọnde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 14:5-18

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Ndị mba ọzọ, ndị Juu na ndịisi ha, gbara mbọ n’obodo Aịkonium imegide ndịozi na ịtụ ha okwute. Ha nụrụ nke a gbaa ọsọ ndụ, gbaga obodo Listra na Debe bụ obodo ndị dị n’ala Lịakonịa na obodo ndị gbara ya gburugburu.

Ha gbasakwara oziọma n’obodo ahụ. N’obodo Listra, o nwere otu nwoke agabeghị ije kamgbe a mụrụ ya. Ọ nọ na-ege okwuchukwu Pọl, Pọl legidere ya anya hụ na o nwere okwukwe, na aga agwọ ya, were oke olu sị ya, “Bilie, kwụrụ ọtọ.”

Nwoke ahụ wụlie, bido gaba ije. Oge igwe mmadụ ahụ hụrụ ihe Pọl mere ha tiri mkpu n’asụsụ Laịkonịa sị, “Ndị a bụ chi bịakwutere anyị n’ụdị mmadụ.” “Ha kpọrọ Banabas, Zeus; kpọkwaa Pọl, Hemes, maka na ya bụ onye ọka okwu.

Onye nchụaja arụsị bụ Zeus, nke ụlọ arụsị ya dị nso n’ihu obodo ahụ wetara ehi ụfọdụ na okooko osisi, chọọ ka ya na ndị mmadụ chụọrọ ha aja. Oge Pọl na Banabas nụrụ ihe ndị obodo ahụ chọrọ ime, ha dọwara uwe ha, were ike gbaba n’etiti ndị mmadụ na-eti mkpu sị, “Ndị enyi anyị gịnị mere ụnụ ji eme ihe a?

Anyị bụ mmadụ ibe ụnụ, anyị abụghị mmụọ. Anyị wetaara ụnụ oziọma, ka ụnụ hapụ ihe efu ndị a, bịakwute Chukwu dị ndụ, onye kere eluigwe na ala, kee oke osimiri na ihe niile dị n’ime ha.

N’oge gara aga, Ọ hapụrụ mba nịịle ka ha mewe ihe masịrị ha. N’agbanyeghị nke a ọ hapụghị idobere onwe ya ihe ndị ga na-agbara ya akaebe, site n’iheọma ndị ọ na-emere ụnụ.

Ọ na-ezitere ụnụ mmiri ozuzo site n’eluigwe, na-emekwa ka ihe niile a kụrụ n’ubi mịa mkpụrụ n’oge ha. Ọ na-enye ụnụ ihe oriri, na-emekwa ka obi ụnụ jupụta n’ọñụ.” Site na okwu ndị a, ha jisiri ike gbochie ndị mmadụ ịchụnyere ha aja.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 115: 1-2, 3- 4, 15-16.

Azịza: Ọ bụghị maka anyị, O Onyenweanyị, kama ka enye aha gị otito.

1. Ọ bụghị maka anyị, O Onyenweanyị,

ọ bụghi maka anyị,

kama ka enye aha gị otito,

n’ihina ịkwụdosirike n’ịhụnaanya gị.

Maka gịnị ka ndị mba ọzọ ga-eji na-asị,

olee ebe Chineke ha nọ? Azịza

2. Chineke anyị nọ n’eluigwe,

na-eme ihe ọbụla masịrị ya.

Arụsị ha bụ ọlaọcha na ọlaedo,

ọrụ aka ndị mmadụ. Azịza

3. Ka Chineke gọzie gị,

onye mere eluigwe na ụwa.

Eluigwe niile bụ nke Onyenweanyị,

mana o nyela ụmụ mmadụ ụwa. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Anyị maara na Kristi ebilitela n’ọnwụ, eze nke mmeri, bịa nọnyere anyị.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 14: 21-26.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Onye ọbụla natara iwu m, na-edobe ha, bụ onye hụrụ m n’anya. Onye hụrụ m n’anya ka Nna m na-ahụ n’anya. Aga m ahụkwa onye ahụ n’anya, gosikwa ya onwe m.”

Judas (nke na-abụghị nke Iskarịọt) sịrị ya, “Olee otu Ị ga-esi gosi anyị onwe gị, n’egosịghị ụwa onwe gị?” Jesu zara ya sị, “Ọ bụrụ na mmadụ ahụ m n’anya, ọ ga-edobe okwu m. Nna ga-ahụkwa ya n’anya.

Anyị ga-abịakwute ya, biri n’ime ya. Onye na-ahụghị m n’anya anaghị edobe okwu m niile. Okwu nke ụnụ na-anụ abụghị nke m, kama nke Nna, bụ onye zitere m.

Agwala m ụnụ ihe ndị a ugbu a mụ na ụnụ ka nọ. Ma onye nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna ga-ezite n’aha m, ga-akuziri ụnụ ihe nile. Ọ ga-emekwa ka ụnụ cheta ihe niile m gwara ụnụ.”

Igbo Mass readings for April 30 2024, Tuzde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Igbo Mass Readings for April 29 2024, Mọnde Izuụka nke Ise n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Last Update: April 15, 2022