Igbo Mass Readings for March 18 2024, Mọnde Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi
Nke a bụ Igbo Mass Readings maka March 18 2024, Mọnde Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 13:1-9, 15-17, 19-30, 33-62
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Daniel
O nwere otu nwoke bi na Babịlọn aha ya bụ Joakịm. Ọ lụtara nwaanyị aha ya bụ Suzana, ada Hịlkịa; nwaanyị a mara mma nke ukwuu, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke.
Nne ya na nna ya bụ ndị eziomume, ha zụlitere ada ha bụ Suzana n’iwu Mosis. Joakịm bụ nwoke bara ọgaranya nke ukwuu. O nwere nnukwu ubi dị n’akụkụ ụlọ ya.
Ndị Juu na-abịakarị na nke ya, n’ihi na ọ bụ nwoke nwere nnukwu ùgwù n’etiti ha. N’ime afọ ahụ, a họtara ndị okenye abụọ n’ime ha, ka ha bụrụ ndị ọkaikpe.
Ọ bụ maka ndị dị otu a ka Yahweh jiri kwuo sị, “Ihe ọjọọ si Babịlọn bịa, o sitere n’aka ndị okenye bụ ndị ọkaikpe, ndị a tụrụ anya na ha ga-achị ndị mmadụ nke ọma.”
Ndị ọkaikpe a na-anọkwa na nke Joakịm ugboro ugboro, ebe ahụ ka ndị niile nwere ikpe na-abịakwute ha. Ọ na-abụ, n’oge ehihie, mgbe ndị mmadụ lachara, Suzana agaa n’ime ubi di ya a gbara ogige ka ọ gaa gagharịa, nara ikuku.
Ndị okenye abụọ a na-ahụ ya ụbọchị niile ka ọ na-abịa na ya bụ ubi a gbara ogige na-agagharị. Ha bidoro nwee agụụ maka ya. Ha tụfuru akọnuuche ha, sepụ anya n’ebe Chineke nọ, hapụkwa iche maka ikpe ziri ezi.
Otu ụbọchị, mgbe ha ka na-eche oge dị mma inweta nwaanyị a, ọ bịara banye dịka o si emebu na ya bụ ubi a gbara ogige, chọọ ịsa ahụ, n’ihi na okpomọkụ dị nke ukwu; ya na sọọsọ ụmụagbọghọ abụọ na-agbara ya odibo so.
O nweghị onye ọzọ nọ ebe ahụ bereso okenye abụọ ahụ, ndị bịara zoo onwe ha, wee na-enyo ya. Suzana gwara ụmụodibo ya ahụ sị, “Wetaranụ m mmanụ na ude, ma mechienụ ọnụ ụzọ niile nke ubi a ka m saa ahụ.”
Oge ụmụagbọghọ ahụ pụrụ, ndị okenye abụọ a kuliri, jiri ọsọ gbakwuru nwaanyị a sị ya, “Lee, e mechiri ọnụụzọ ogige ubi a emechi, o nweghị onye na-ahụ anyị.
Ịhụnaanya maka gị eriela anyị obi, ya bụ, kweta ihe anyị chọrọ n’aka gị, kweta ka anyị na gị mekọọ. Ọ bụrụ na ị jụ ime otu a anyị ga-agba akaebe asị gbagide gị, sị na gị na otu nwokorobịa nọ nke mere I jiri zipụ odibo nwaanyị gị.”
Suzana wee sụọ ude, sị, “Ejidela m na akụkụ niile, n’ihina m mee ihe a, ọnwụ m ka ọ bụ; ma ọ bụrụkwa na m emeghị ya, enweghị m ike isi n’aka ụnụ zọrọ isi m.
Ọ kaara m mma ịnwụ n’aka ụnụ karịa ime njọ megide Chineke.” Suzana wee tie oke mkpu ma ndị okenye abụọ a bidoro tiwe mkpu nke ha, na-ebo ya ebubo.
Otu n’ime ha jiri ọsọ meghesịa ụzọ ubi ahụ agbara ogige. Oge ụmụodibo ya nụrụ ka a na-eti mkpu n’ime ubi ahụ, ha jiri nnukwu ọsọ si n’ụzọ nke dị n’akụkụ banye ka ha hụ ihe mere Suzana.
Mgbe ndị okenye a kọrọ akụkọ ha; nnukwu ihere jidere ụmụodibo ndị a maka na-anụbeghị ihe dị otu a mbụ gbasara Suzana. N’echi ya, oge ndị mmadụ gbakọrọ n’ụlọ di ya bụ Joakịm, ndị okenye abụọ ahụ bịara, obi ha jupụta n’ajọ nkata niile ha na akpa iji hụ na-egburu Suzana.
Ha nọrọ n’ihu ndị mmadụ sị, “Kpọọnụ Suzana ada Hịlkịa, bụ nwunye Joakịm.” Ha wee zigara ya ozi ka ọ bịa. Ọ bịara, ya na nne na nna ya, ụmụ ya na ndị nke ya niile.
Mana ndị ezinụụlọ ya na ndị enyi na ndị niile hụrụ ya n’anya nọ na-ebe akwa. Ndị okenye abụọ ahụ wee kulie ọtọ n’etiti ndị mmadụ ahụ, bikwasị aka ha n’isi Suzana, bido bobe ya ebubo.
N’uru na anya mmiri ya, o weliri anya n’eluigwe, n’ihina o nwere ntụkwasịobi n’ebe Chineke nọ. Ndị okenye abụọ a kwuru sị, “Oge sọ anyị na-ejegharị n’ime ubi a a gbara ogige, nwaanyị a batara, ya na ụmụodibo nwaanyị abụọ.
O wee mechichaa ọnụụzọ ubi a, zipụ ụmụodibo nwaanyị ndị ahụ. Oge ahụ ka nwokorobịa zoro onwe ya ezo bịakwutere ya, ha abụọ mekọọ. Anyị nọ n’akụkụ ya bụ ubi agbara ogige hụta ihe ọjọọ a ka ọ na-eme, wee were ọsọ gbakwuru ha.
Anyị hụrụ ka ha na-amakụ onwe ha, mana anyị enweghị ike ijideli nwoke ahụ n’ihina o sika ike na mmadụ; o meghepuru ụzọ rie ọsọ. Anyị wee jidezie nwaanyị, jụọ ya onye ya bụ nwokorobịa bụ, ma ọ kweghị agwa anyị.
Anyị na-agba ama ihe ndị a. Nzukọ ahụ kwenyere n’okwu ndị a n’ihina ndị na-agba ama a bụ ndị okenye bụrụkwa ndị ọkaikpe; ha wee ma Suzana ikpe ọnwụ.
Suzana tiri mkpu, tisie ike sị, “O Chineke dị ebeebe, o nweghị ihe zoro ezo n’ebe ị nọ. Gị onwe gị maara ihe niile tupu ha emee. Ị maara na ndị nwoke a gbara ama ụgha gbagide m.
Lee, ugbu a, ana m eje ịnwụ, mana aka m dị ọcha. O nweghị nke m mere n’ihe ọjọọ niile a ndị a kwuru kwugide m.” Chineke nụrụ olu ya. Ka a na-edupụ ya ka egbuo, Chineke kpalitere mmụọ nsọ dị n’ime otu nwokorobịa a na-akpọ Daniel.
O wee tie oke mkpu sị, “Aka m adịghịkwa n’ọbara nwaanyị a.” Ka o kwuru nke a, mmadụ niile tụgharịrị n’ebe ọ nọ sị, “Kedụ ihe okwu ndị a ị na-ekwu pụtara?”
Ọ kwụụrụ n’etiti ha sị, “Ụnụ ọ bụzi ndị nzuzu nke otu a, ụmụ Izrel? Kedụkwanụ ka ụnụ si maa nwaada Izrel ikpe ọnwụ n’enyochaghị enyocha chọpụta ihe mere eme?
Laghachinụ azụ ebe a nọrọ kpee ikpe. Maka na ndị nwoke a agbala ama asị gbagide nwaanyị a.” Igwe mmadụ ahụ laghachiri azụ ọsọọsọ. Ndị okenye wee gwa Daniel sị, “Bịa nọdụ ala n’etiti anyị kọwaara anyị isi okwu gị, ebe ọ bụ na Chineke enyela gị onyinye ndị okenye.”
Daniel wee kwuo sị, “Kewaanụ ndị okenye abụọ a, dobe ha ebe dị iche-iche dị anya, ka m nyocha ha n’otu n’otu. Mgbe e kewara ha, Daniel kpọrọ otu n’ime ha, sị ya, “Gịnwa, ị nọọla na njọ mee okenye, mana ugbu a, ajọ ndụ gị gara aga erigidola gị: ikpe ezighị ezi ị na-ekpe, ndị eziomume ị na-ama ikpe, ndị ikpe mara ị na-ahapụ ka ha laba n’udo, n’agbanyeghị na Onyenweanyị kwuru sị, ‘Egbukwala onye aka ya dị ọcha na onye eziomume’.
Ngwa, ọ bụrụ ezie na ị hụrụ nwaanyị a, gwa m: kedụ ụdị osisi ha dinara n’okpuru ya wee na-amakụ onwe ha oge ị hụrụ ha?” Ọ zara ya sị, “N’okpuru osisi Mastik”.
Daniel wee sị ya, ọ dị mma, ị sịala asị sịgide onwe gị. Lee mmụọozi nke Chineke anatala ozi ikpe ọmụma gị n’aka Chineke, ya bụ mmụọozi ga-egbuwa gị abụọ.”
Ọ kpọpụrụ ya n’akụkụ, wee gwa ha ka ha kpọbata onye nke ọzọ ngwa ngwa. Daniel gwara onye ọkaikpe nke a sị, ‘Nwa Kanan ka ị bụ, ị bụghị nwa Juda; mma ahụ eduhiela gị ụzọ; oke agụụ nke anụahụ eriela gị obi, Otu a ka ụnụ abụọ si eme ụmụnwaanyị Izrel, ma ụjọ ekweghị ha sị ụnụ mba, ma lee nwaanyị Juda a anabataghị ajọ omume ụnụ.
Ngwa, gwa m olee ụdị osisi ha nọ n’okpuru ya na-amakụ onwe ha mgbe i jidere ha?” O wee zaa, “N’okpuru osisi Ook.” Daniel gwara ya sị ọ dị mma!
Gị onwe gị a sịala asị sịgide onwe gị. Lee mmụọozi nke Chineke ka ọ na-eche, jiri mmagha ọ ga-eji kwọbie gị abụọ, laa ụnụ abụọ n’iyi.” Ndị nzukọ ahụ niile weere oke olu tie mkpu tobe Chineke onye na-azọpụta ndị tụkwasara obi ha na ya.
Ha wee bilie jide ndị okenye abụọ ahụ n’ihina Daniel esila n’ọnụ ha chọpụta na ha agbaala ama asị. Ha mere ndị okenye a ihe ọjọọ ahụ ha onwe ha kwadoro ime mmadụ ibe ha. Dịka iwu Mosis si kwu, ha gburu ha. Otu a ka e siri zọpụta n’ụbọchị ahụ ndụ nwaanyị enweghị ajọ ihe o mere.
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 23: 1-3, 3-4, 5,6.
Azịza: Ọ bụrụgodu na m na-aga na ndagwurugwu nke ọnwụ, egwu ọbụla agaghị atụ m, maka na ị nọdebere m.
1. Chineke bụ onye nche m O nweghị ihe m ga-achọ,
Ọ na-eme ka m zuru ike ebe ahịhịa ndụ dị,
Ọ na-eduga m na mmiri,
Ebe ahụ ka ọ na-enye m ike. Azịza
2. Ọ na-edu m n’ụzọ eziomume;
n’ihi aha ya,
Ọ bụrụgodu na m na-aga na ndagwurugwu nke ọnwụ,
egwu ọbụla agaghị atụ m;
I ji mkpara na ngu gị nọdebe m,
Ọ bụ ha na-enye m agbamume. Azịza
3. Ị na-akwadoro m nri,
n’ihu ndịiro m.
I teela isi m mmanụ,
iko m ejula n’ọnụ na-agbọfu. Azịza
4. N’ezie, obiọma na ebere ga na-eso m,
ụbọchị ndụ m niile.
Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke,
ebeebe-ebeebe!. Azịza
MBEKU
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Chegharịanụ, n’ihi na alaeze eluigwe adịla nso.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 8:1-11.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gabara ugwu Olive, N’isi ụtụtụ Ọ bịakwara ọzọ n’ụlọnsọ. Mmadụ niile bịakwutere ya, ọ nọdụ ala kuziere ha ihe. Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii kpụtara otu nwaanyị e jidere ebe ọ na-akwa iko, kwụba ya ọtọ n’etiti mmadụ niile.
Ha sịrị ya, “Onye nkuzi e jidere nwaanyị a ebe ọ na-akwa iko. Iwu Mosis nyere anyị ikikere ka e were okwute tụgbuo onye mere ihe dị otu a. Kedụ ihe i kwuru maka nwaanyị a?”
Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji bo ya ebubo. Jesu hulatara ala, were mkpịsịaka ya debe ihe n’ala. Ka ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, Jesu hulitere gwa ha sị, “Onye ọbụla n’ime ụnụ nke na-emehiebeghị mbụ buru ụzọ tụọ nwaanyị a okwute.”
O hulatakwa ọzọ, were mkpịsịaka ya debe ihe n’ala. Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile malitere pụba n’otu n’otu, bido na ndị kacha okenye. Ha hapụziri Jesu na nwaanyị ahụ kwụ n’ihu ya.
Jesu welitere anya elu jụọ ya sị, “Nwaanyị, olee ebe ha nọ? Ọ bụ na o nweghị onye mara gị ikpe?” Nwaanyị ahụ zara ya sị, “Ọ dịghị onye ọbụla Onyenweanyị.” Jesu wee sị, “Mụ onwe m amaghịkwa gị ikpe, gaba, emekwala njọ ọzọ.”
N’afo nke atọ, mgbe agụrụ oziọma (Jọn 8:1- 11) na ụbọchị ụka, ana ahọrọ oziọma nke a na-esonụ
OZIỌMA – 8:12-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.
Jesu gwara ndị Juu okwu ọzọ sị: “Abụ m ihè nke ụwa, onye ọbụla na-eso m agaghị aga n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ihè nke ndụ.” Ndị Farisii wee gwa ya sị, “Ị na-agbara onwe gị akaebe, ya bụ na, akaebe gị abụghị eziokwu.”
Jesu zara ha sị: “Ọbụladị na m na-agbara onwe m akaebe, akaebe m bụ eziokwu, n’ihina amaara m ebe m siri bịa na ebe m na-aga; ma ụnụ amaghị ebe m siri bịa na ebe m na-aga.
Ụnụ na-ekpe ikpe n’usoro nke mmadụ ma anaghị m ekpe onye ọbụla ikpe. Ọbụladị na m ekpe ikpe, ikpe m bụ eziokwu, n’ihina ọbụghị naanị m na-ekpe ikpe, kama ọ bụ mụ na Nna m onye zitere m.
Edere n’Akwụkwọ iwu ụnụ na akaebe mmadụ abụọ bụ eziokwu. Ana m agbara onwe m akaebe, Nna zitere m na-agbakwara m akaebe.” Nke a mere ha ji jụọ ya sị, “Olee ebe Nna gị nọ?”
Jesu azaa sị, “Ụnụ amaghị m nke ụnụ ji ama Nna m. A sị na ụnụ maara m, ụnụ ga-amatakwa Nna m.” O kwuru okwu ndị a n’ebe a na-edobe ụtụ mgbe ọ na-akuzi nkuzi n’ụlọnsọ, ma o nweghị onye ọbụla jidere ya n’ihina oge ya erubeghị.
Igbo Mass readings for March 19 2024, Emume Ncheta Josef Dị Asọ, Di Marịa dị asọ
Igbo Mass Readings for March 18 2024, Mọnde Izuụka nke Ise n’Oge Ncheta Ahụhụ Kristi.