Igbo Mass Readings for February 6 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 6 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:1-19

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis

N’isi mbido Chineke kere elu na ala. Ugbu a ụwa enweghị ụdị nke ọ na-enwe ịhe dị n’ime ya, itiri ọchịchịrị gbachitere n’elu ndagwurugwu ahụ, ebe mmụọ Chineke nọ na-erugharị n’elu mmiri ndị ahụ. Chineke sịrị, ihe dịrị, ihe adịrị. Chineke hụrụ na ihe ahụ dị mma; Chineke sị n’ọchịchịrị ahụ kewapụta ihe.

Chineke kpọrọ ihe ahụ “Ehihie” kpọọkwa ọchịchịrị ahụ ‘Abalị’. Mgbede bịara, ụtụtụ abịakwa: Ụbọchị nke mbụ. Chineke sịkwara ka abadịbara dịrị n’etiti mmiri ndị ahụ, ka o kewaa mmiri ndị ahụ ụzọ abụọ.

O mee otu ahụ. Chineke mere ka abadịbara ahụ kewapụta mmiri ndị ahụ dị n’okpuru ya n’ebe ndị nke dị n’elu ya dị Chineke akpọọ abadịbara ahụ ‘Eluigwe’; mgbede abịa, ụtụtụ abịakwa: ụbọchị nke abụọ.

Chineke sịkwara, “Ka mmiri ndị ahụ dị n’okpuru igwe gbakọta ọnụ n’otu ebe, ka obosara ala ọkpọọ pụta”. O mee otu ahụ. Chineke kpọrọ ala ọkpọọ ahụ “Ụwa’ ma kpọọ mmiri ndị ahụ gbakọrọ ọnụ n’otu ebe ‘Osimiri’.

Chineke hụrụ na ọ dị mma. Chineke sịkwara, “Ka ala pupụta ahịhịa ndụ dị icheiche, osisi ndị na amịpụta mkpụrụ, nakwa mkpụrụ osisi n’elu ụwa, na-amịta mkpụrụ nke mkpụrụ ha dị n’ime, nke ọ bụla n’ụdị ya”. O mere otu ahụ.

Ụwa pupụtara ahịhịa ndụ dị icheiche, osisi ndị na-amịta mkpụrụ n’ụdị nke ha, nakwa mkpụrụ osisi na-enwe mkpụrụ n’ime ha, nke ọbụla n’ụdị ya. Chineke hụrụ na ọ dị mma. Mgbede abịa, ụtụtụ abịakwa: ụbọchị nke atọ. Chineke sịkwara, “Ka ihe dịrị n’ime abadịbara nke Eluigwe, nke ga-ekewa ehihie na abalị ka ha bụrụ ihe na-akọwa mmemme, ụbọchị na afọ niile.

Ka ha bụrụkwa ihe n’ime abadịbara nke Eluigwe, nke ga enye ihe n’elu ụwa. O mee otu ahụ. Chineke kere nnukwu ihe abụọ ndị ahụ ka ihe nke nnukwu chịwa n’ehihie ebe ihe nke nta ga na-achị n’abalị; Chineke kekwara kpakpando niile.

Chineke haziri ha n’ime abadịbara nke Eluigwe ka ha na-enye ihe n’elu ụwa, ka ha na-achị n’ehihie na n’abalị bịakwa na-ekewa ihe na ọchịchịrị. Chineke hụrụ na ọ dị mma. Mgbede abịa, ụtụtụ abịakwa: ụbọchị nke anọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps.: 104: 1-2,5-6,10, 12,24,35

Azịza: Ka Onyenweanyị nwee añụrị n’ihe O kere

1. Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụobi m,

Onyenweanyị Chineke, lee ka i si dị ukwu!

I jupụtara n’ebube na otito,

I ji ihe ekpuchi onwe gị dịka akwa. Azịza

2. Ngị tọrọ ntọala ụwa

nke na ọ gaghị eme ụñara ebeebe ebeebe.

I ji nnukwu osimiri wuchie ya dịka uwe,

mmiri ahụ tochikwara ugwu niile. Azịza

3. I mere ka isiiyi si na ndagwurugwu na-asọpụta,

ka ha si n’etiti ugwu na-agbada.

N’akụkụ ebe ahụ ka ụmụ nnụnụ nke igwe na-akụ akwụ ha,

na-ekwekwa ukwe n’elu alaka osisi ya. Azịza

4. Onyenweanyị, lee ihe dị icheiche i kere,

i ji amamihe wee dozie ihe niile;

ụwa jupụtara na ihe i kere.

Gọzie Onyenweanyị, mkpụrụ obi m, Alleluia. Azịza

MBEKU

Alleluia, Alleluia:

Jerusalem, toonụ Onyenweanyị: okwu ya na-agazu ụwa niile ọsọọsọ.

Alleluia.

OZIỌMA – 6:53-56

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Mgbe ha kwọfechara n’ofe nke ọzọ, Jesu na ndị na-eso ụzọ ya rutere n’ọnụ mmiri Genesaret ebe ha kedoro ụgbọ ha. Mgbe ha si n’ụgbọ rịdata, otu ihu ahụ ndị mmadụ matara Jesu.

Ha we gbagharịa n’ala ahụ niile, na-ebutere ya n’ute ndị ahụ na-adịghị, ebe ọbụla ha nụrụ na ọ nọ. Ebe ọbụla ọ bịara n’obodo nta, obodo ukwu, mọbụ n’ala ubi, ndị mmadụ na-ebupụtara ya ndị ọrịa tọgbọ ha n’ọmaahịa ma rịọ Jesu ka ha metụ ọ bụladị ọnụ uwe ya aka.

Ndị niile metụrụ ọnụ uwe ya aka ka e mere ka ahụ dị mma.

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. We interrupt your reading to humbly ask you to defend Online Catholic Lectionary independence. Many of our readers don’t give; they look the other way. If you are an exceptional reader who has already donated, we sincerely thank you. If you donate just ₦5000.00, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Most people donate because Online Catholic Lectionary is useful. If Online Catholic Lectionary has given you ₦5000.00 worth of knowledge this year, take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for February 6 2023, Mọnde n’ime Izuụka nke Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

Last Update: September 7, 2022