Igbo Mass Readings for May 6 2024, Mọnde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 6 2024, Mọnde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 16:11-15

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Ọrụ Ndịozi

Ka anyị siri na Troas kwọrọ ụgbọ ruo Samọtres, anyị kwọrọ ụgbọ echi ya ruo Nịapolis. Anyị siri ebe ahụ garuo Filipi nke obodo mbụ nke ala Masedonịa, nke so n’obodo ndị Rom na-achị.

Anyị nọrọ n’obodo ahụ ụbọchị olemaole. N’ụbọchị Sabat anyị pụrụ n’ime obodo, gaa n’akụkụ osimiri, ebe anyị ghọtara na ụlọ ekpere ndị Juu dị: anyị nọdụrụ ala gwa ụmụnwaanyị ndị gbakọrọ ebe ahụ okwuchukwu.

Otu n’ime ndị nụrụ okwu anyị bụ nwaanyị a na-akpọ Lidia, onye obodo Tịatira, onye na-ere akwa na-acha uhie-uhie. Nwaanyị ahụ bụ onye na-efe Chineke.

Dinwenụ meghere obi ya, ige ntị n’ihe niile Pọl na-ekwu. Ma mgbe e mechara nwaanyị a na ezinụụlọ ya mmirichukwu, ọ rịọrọ ka anyị bịa n’ụlọ ya sị: “Ọ bụrụ na ụnụ atụleela, hụ na okwukwe m siri ike n’ime Onyenweanyị, bịanụ n’ụlọ m biri.” Ọ rịọsiri anyị ike.

ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 149: 1-2, 3-4,5-6, 9.

Azịza: Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ.

1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,

ka ọgbakọ ndị kwere na ya kweere ya ukwe otito.

Ka Izrel ñụrịa ọñụ n’ihi onye kere ya,

ka ụmụ Zayọn ñụrịa n’ihi onye eze ha. Azịza

2. Ka ha were ịgba egwu too aha ya,

ka ha were ịgba na ụbọ akwara gbaara ya egwu.

N’ihina Onyenweanyị nwere ịhụnaanya n’ebe ndị nke ya nọ,

O kpubela ndị umeala okpu nke mmeri. Azịza

3. Ka nnukwu ukwe otito Chineke jupụta n’ọnụ ha,

Iji mejupụta ikpe amara ha

nke a bụ otito nke ndị nke ya kwere ekwe. Azịza

MBEKU

ALLELUIA ALLELUIA:

Akpọdoro ya n’elu obe n’ihi anyị, mana ugbu a Dinwenụ esila n’ili bilie.

ALLELUIA.

OZIỌMA – 15: 26-27. 16: 1-4.

Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere.

Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: Mgbe onye nkasiobi ahụ, onye si na Nna m pụta, onye bụ mmụọ nke eziokwu ahụ, onye nke m ga-esi na Nna zitere ụnụ ga-abịa.

Ọ ga-agbakwara m akaebe. Ụnụ onwe ụnụ ga-agbakwa akaebe, n’ihina mụ na ụnụ nọ site na mbụ. “Agwala m ụnụ ihe ndị a niile ka okwukwe ụnụ ghara ịda.

Ha ga-achụpụ ụnụ n’ụlọ nzukọ ha. N’ezie, oge ga- abịakwa mgbe onye ọbụla ga-egbu ụnụ ga-eche na ọ na-agara Chineke ozi. Ha ga-emekwa ihe ndị a, n’ihi na ha amaghị Nna m, nke ha na-ama m. Ihe ndị a niile ka m na-agwa ụnụ, nke ọ ga- abụ mgbe oge ha ruru ụnụ echeta na m gwara ụnụ.

Igbo Mass readings for May 7 2024, Tuzde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Igbo Mass Readings for May 6 2024, Mọnde Izuụka nke Isii n’oge Mbilite n’Ọnwụ Kristi.

Last Update: April 15, 2022